Dkt Cool
Nwoke chepụtara usoro a, Dkt Saud Abdul Ghani gwara BBC na Qatar chọrọ ime ihe nketa, ga-enyere mba ha aka ruo otụtụ oge ma ndị ọgba bọọlụ lacha.
Ọ sị na o mere nyocha ọtụtụ afọ iji mepụta ihe a kpọrọ "thermal comfort", ka ahụ dị ọtụtụ ndị mmadụ jụụ. Mkparịtaụka n'etiti ndị egwuregwu na ndị nkwado n'asọmpi Athletics nke Mbaụwa e mere na Qatar afọ 2019 nyere aka ịrụ ihe a ga-abara ndị ọbịa na ndị ọgba bọọlụ uru n'asọmpi Iko Mbaụwa.
N'echiche onye ọgba bọọlụ
BBC kpọtụụrụ Hajar Saleh, na-agbara otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Qatar bọọlụ, onye malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị afọ 11. Ọ maara ihe banyere ime egwuregwu n'ọnọdụ siri ike. Ọ sị na ude mmiri bụ ihe ịma aka kachasị.
Okpomọkụ amaala anyị ahụ, mana itinye okpomọkụ na ude mmiri ihe na-esi ike. Hajar Saleh
Hajar enweela ahụmihe ịgba bọọlụ n'ọgbọegwuregwu ọhụrụ abụọ nwere igwe njụ oyi ọhụrụ a, nke Khalifa nakwa ọgbọegwuregwu Educational City.
Ọ sị na e nwere nnukwu ihe dị iche, ọkachasị ịgba bọọlụ n'ọnwa Juun, oge Qatar kachasị enwe okpomọkụ n'afọ.
Usoro a ọ ga-adịgịde?
Ndị na-ahazi asọmpi Qatar 2022 kwere nkwa sị na igwe na-eme ka ọgbọegwuregwu na-ajụ oyi agaghị emetụta ọnọdụ ihu eluigwe maka na ọkụ latrik ya sị n'ikike anyanwụ a rụrụ ọhụrụ.
Mana ebumnobi ịhụ na ikuku carbon akarịghị oke bụ ọchịchọ kachasị kwụsie ike.
Ọnụọgụgụ ikuku carbon pụtara mgbe a na-arụ ọgbọegwuregwu a bụ 90% ikuku carbon niile dị ebe ahụ, ebe ikuku greenhouse pụtara n'ihu eluigwe dị tọn 800,000. Nke a bụ otu ihe n'ịnya ụgbọala na gburugburu ụwa ugboro 80,000, dịka ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa gburugburu ebe obibi na mba Amerịka (US Environmental Protection Agency) si kwuo.
N'ile anya gafee ihe banyere ọgbọegwuregwu, nwekwara etu njem si metụta Iko Mbaụwa, nke gụnyere ụgbọelu ibu ndị mmadụ aga mba a.
Fifa sị na etu asọmpi a si kpụkọta ọnụ n'ihi ebe a na-agba asọmpi si dị nso na ibe ya pụtara na ikuku carbon ga-apụta n'ihi njem na Qatar ga-adị obere ma a tụnyere ya na nke pụtara na Russia n'afọ 2018.
Nchekwa ihu eluigwe nke mba Qatar gbakwasịrị ụkwụ n'ibelata ikuku carbon nke ga-ebelata ikuku na-emebi ihu eluigwe a kpọrọ 'CO2' ha na-emepụta.
A mabeghi etu ha chọrọ isi enwete nke a. Fifa sị na ha ji tekịnụzụ dị iche iji ibelata ikuku carbon na-apụta n'Iko Mbaụwa, gụnyere ikike zuru oke, njikwa unyi, nwogharị ikike nakwa ịkụ ukwu osisi. Mana mkpebi ikpeazụ banyere ụdị ọrụ ha chọrọ edobeghi anya.
Ụdị atụmatụ a nwereike iwe ọtụtụ afọ tupu ha malite ọrụ ịkpachi ikuku carbon. Nyocha BBC mere na nso nso a gosiri na ụfọdụ atụmatụ ịkụ osisi maka igbochi ikuku carbon bụ naanị n'akwụkwọ ka a na-ahụ ya.
Ya mere ọ ga-ewe ụfọdụ oge tupu a mata ma mba Qatar onwete atụmatụ ya n'ichekwa ihu eluigwe maọbụ ọnụ ha na-eto maka nkwa ya ọ bụ naanị ikuku ọkụ.
Mba ka na-agba nkịtị na nkatọ a na-enye ha banyere oke ọnụ ahịa obibi ndụ nye ndị ọrụ mbịarambịa 30,000 rụrụ ọgbọegwuregwu ndị a, gụnyere ọtụtụ ndị ọrụ nwụrụ anwụ na ndị merụrụ ahụ. E nwekwara ebubo ịmanye ndị ọrụ n'ike, ọnọdụ ịrụ ọrụ siri ike, ụlọ obibi na-adịghị mma, akwụghị ụgwọ ọrụ nakwa ịkpachi akwụkwọ njem.
Gọọmenti mba Qatar gọrọ ebubo ndị a, kwuo na kamgbe afọ 2017 ka ha malitere atụmatụ ichekwa ndị ọrụ mbịarambịa site n'ịrụ ọrụ n'oke okpomọkụ, ibelata oge ọrụ ha nakwa iwulite ọnọdụ ebe obibi ndị ọrụ. Mana naanị n'afọ 2021, ndị ọrụ 50 nwụrụ ebe ndị ọrụ karịrị 500 merụrụ nnukwu ahụ na Qatar n'ime ndị niile na-arụ ọrụ metụtara Iko Mbaụwa, dịka ozi si n'aka otu na-ahụ maka ndị ọrụ n'ụwa (International Labour Organization) si kwuo. Nke a bụ okwu ọzọ dapụtara ebe akụkọ banyere mba ọzara a ga-abụ ihe a ga na-enyocha.