vjneareast-836-qatar-cool-stadium > app > igbo > core

Test Page

Core include appears below:

Luis Quinones nkeTigres UANL wụrụ mmiri n'ahụ ya n'asọmpi semi-final nke Iko Mbaụwa Fifa n'ọgbọegwuregwu Qatar Education City dị na Doha n'ọnwa Febụwarị 2021.

Iko Mbaụwa 2022: Ụzọ e si eme ka ọgbọegwuruegwu dị n'ọzara na-adị jụụ

Mgbe a họpụtara Qatar dịka mba a ga-anọ gbaa asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2022, o butere nrụrịtaụka gụnyere akụkọ mba a nwere n'ebe ikike dịịrị onye nọ ruo na nsogbu ndị ọzọ dịka etu ndị ọgba bọọlụ na ndị nkiri ga-eme na mba a maara nwere okpomọkụ karịrị 40C?

Iburu asọmpị a gawa n'oge oyi bụ otu ụzọ iji gboo nsogbu a. Mana mba a bụ ọzara bara ọgaranya chọrọ ime ihe ga-atụ ụwa n'anya: Iji tekịnụzụ ga-eme ịgba asọmpi egwuregwu dị iche iche n'oge ọbụla n'afọ dị ire na-agbanyeghi ụdị okpomọkụ dị na mba ndị a. Otu onye ọgba bọọlụ na Qatar bụ Hajar Saleh sị na okpomọkụ na ude mmiri bụ ihe ịma aka nye ịgba bọọlụ na mpaghara ahụ.

Ya mere, kedụ etu ha ga-esi mee ka ahụ kpakọọ ndị ọgba bọọlụ na ndị na-ekiri ha ọnụ, na-enweghi ọnụ ahịa ọ ga-efu ụwa?

Foto ọgbọegwuregwu Al Janoub e sere n'elu nke ọnụ akụ na-ego ikuku ọkụ

Iji mee ka ihe dị jụụ n'ọgbọegwuregwu a nakwa ebe ndị na-ekiri nọ, e nwere ihe mmepụta ga-egbo nsogbu a. Ka anyị leba anya na ya.

N'ụbọchị asọmpi, mmadụ 40,000 ga-eju ikiri ya, nke ọbụla n'ime ha na-ewepụta okpomọkụ na ọsụsọ n'ahụ ya.

Site n'ọnọdụ okpomọkụ nke mba Qatar na ikuku ọkụ si n'ime ọgbọegwuregwu, e kwesiri inwete usoro ga-eme ka ebe jụọ oyi.

Ahụ ga-ajụ ndị nkwado na-ekiri bọọlụ oyi site n'ikuku si n'ohere dị n'okpuru oche ha.

Nọzụlụ nwere obere ọnụ na-ekwe ka ikuku si na ya fesasịa na gburu gburu ebe ndị na-ekiri bọọlụ nọ.

O ji nwayọọ na-eku, na-abụghị ikusi ike ka ikuku si n'ingine ụgbọelu apụta.

Nke a bara uru nye ndị nkiri, mana kedụkwanụ maka ndị ọgba bọọlụ nọ n'ọgbọegwuregwu?

Ndị ọgba bọọlụ ugbua nwereike ịgba ọsọ ruru 10km n'oge asọmpi, nke ga-ewepu ọsụsọ ruru lita atọ n'ahụ ha, ya bụ ahụ ha kwesịrị ịdị jụụ ma nwekwa mmiri na ya.

Foto na-egosi ime ọgbọegwuregwu Al Janoub dị na Qatar nke e ji agwa anụnụ na-egosi ịdị jụụ nke ebe a na-agba bọọlụ na ebe ndị nkiri na-anọ

Na gburu gburu Qatar nwe ude mmiri, ọ na-esi ike ọsụsọ ịkọ n'ahụ mmadụ nke na-ebute oke okpomọkụ, ọ na-ebutekwa ike ọgwụgwụ okpomọkụ.

Ya mere n'asọmpi Iko Mbaụwa Qatar, a na-eme ka ikuku jụrụ oyi si n'ọnụ nọzụlụ kubata n'ime ọgbọegwuregwu iji mee ka ọ dị jụụ.

Onye ọkachamara nyere aka rụọ igwe ntụ oyi a, Dkt Saud Abdul Ghani sị etu na ebe e dosara ohere ikuku ndị ahụ na etu ikuku si abata pụtara na ọ ga-esi ike ka ikuku kute ndị ọgba bọọlụ.

Nke a pụtara na ọkpụrụkpụ ikuku dị jụụ ga-adị n'ime ọgbọegwuregwu 18-24C (64-75F), nke ogogo ya akarịghị mita abụọ site n'ala, karịa iji oke ikuku oyi kuba n'ihu eluigwe ọzara. Ya mere gịnị ọzọ ga-eme?

Dịka ikuku oyi a na-adị ọkụ, a ga-eji igwe ikuku 'extractor' mịpụ ya site n'etiti ọgbọegwuregwu ahụ.

Mgbe ahụ a ga-azacha ya, mee ka ọ jụọ oyi ọzọ ma kubata ya n'ime ọgbọegwuregwu ọzọ.

Ngwa ngwa mmiri oyi ahụ mịrị ikuku ọkụ ahụ, a ga-etinye ya na tankị nchekwa dị lita 40,000, nke ji kilomita 3 dị anya, ebe a ga-eme ka ọ jụọ oyi ọzọ maka iji ya arụ ọrụ n'oge asọmpi ọzọ.

Foto na-egosi akụkụ ọgbọegwuregwu ebe ikike si n'anyanwụ nọ

Igwe njụ oyi a na-enwete ikike o ji arụ ọrụ site n'ikike anyanwụ (solar plant) nke dị kilomita 80 n'akụkụ Doha bụ isiobodo mba Qatar.

Dkt Cool

Nwoke chepụtara usoro a, Dkt Saud Abdul Ghani gwara BBC na Qatar chọrọ ime ihe nketa, ga-enyere mba ha aka ruo otụtụ oge ma ndị ọgba bọọlụ lacha.

Ọ sị na o mere nyocha ọtụtụ afọ iji mepụta ihe a kpọrọ "thermal comfort", ka ahụ dị ọtụtụ ndị mmadụ jụụ. Mkparịtaụka n'etiti ndị egwuregwu na ndị nkwado n'asọmpi Athletics nke Mbaụwa e mere na Qatar afọ 2019 nyere aka ịrụ ihe a ga-abara ndị ọbịa na ndị ọgba bọọlụ uru n'asọmpi Iko Mbaụwa.

N'echiche onye ọgba bọọlụ

BBC kpọtụụrụ Hajar Saleh, na-agbara otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Qatar bọọlụ, onye malitere ịgba bọọlụ mgbe ọ dị afọ 11. Ọ maara ihe banyere ime egwuregwu n'ọnọdụ siri ike. Ọ sị na ude mmiri bụ ihe ịma aka kachasị.

Okpomọkụ amaala anyị ahụ, mana itinye okpomọkụ na ude mmiri ihe na-esi ike. Hajar Saleh

Hajar enweela ahụmihe ịgba bọọlụ n'ọgbọegwuregwu ọhụrụ abụọ nwere igwe njụ oyi ọhụrụ a, nke Khalifa nakwa ọgbọegwuregwu Educational City.

Ọ sị na e nwere nnukwu ihe dị iche, ọkachasị ịgba bọọlụ n'ọnwa Juun, oge Qatar kachasị enwe okpomọkụ n'afọ.

Usoro a ọ ga-adịgịde?

Ndị na-ahazi asọmpi Qatar 2022 kwere nkwa sị na igwe na-eme ka ọgbọegwuregwu na-ajụ oyi agaghị emetụta ọnọdụ ihu eluigwe maka na ọkụ latrik ya sị n'ikike anyanwụ a rụrụ ọhụrụ.

Mana ebumnobi ịhụ na ikuku carbon akarịghị oke bụ ọchịchọ kachasị kwụsie ike.

Ọnụọgụgụ ikuku carbon pụtara mgbe a na-arụ ọgbọegwuregwu a bụ 90% ikuku carbon niile dị ebe ahụ, ebe ikuku greenhouse pụtara n'ihu eluigwe dị tọn 800,000. Nke a bụ otu ihe n'ịnya ụgbọala na gburugburu ụwa ugboro 80,000, dịka ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa gburugburu ebe obibi na mba Amerịka (US Environmental Protection Agency) si kwuo.

N'ile anya gafee ihe banyere ọgbọegwuregwu, nwekwara etu njem si metụta Iko Mbaụwa, nke gụnyere ụgbọelu ibu ndị mmadụ aga mba a.

Fifa sị na etu asọmpi a si kpụkọta ọnụ n'ihi ebe a na-agba asọmpi si dị nso na ibe ya pụtara na ikuku carbon ga-apụta n'ihi njem na Qatar ga-adị obere ma a tụnyere ya na nke pụtara na Russia n'afọ 2018.

Nchekwa ihu eluigwe nke mba Qatar gbakwasịrị ụkwụ n'ibelata ikuku carbon nke ga-ebelata ikuku na-emebi ihu eluigwe a kpọrọ 'CO2' ha na-emepụta.

A mabeghi etu ha chọrọ isi enwete nke a. Fifa sị na ha ji tekịnụzụ dị iche iji ibelata ikuku carbon na-apụta n'Iko Mbaụwa, gụnyere ikike zuru oke, njikwa unyi, nwogharị ikike nakwa ịkụ ukwu osisi. Mana mkpebi ikpeazụ banyere ụdị ọrụ ha chọrọ edobeghi anya.

Ụdị atụmatụ a nwereike iwe ọtụtụ afọ tupu ha malite ọrụ ịkpachi ikuku carbon. Nyocha BBC mere na nso nso a gosiri na ụfọdụ atụmatụ ịkụ osisi maka igbochi ikuku carbon bụ naanị n'akwụkwọ ka a na-ahụ ya.

Ya mere ọ ga-ewe ụfọdụ oge tupu a mata ma mba Qatar onwete atụmatụ ya n'ichekwa ihu eluigwe maọbụ ọnụ ha na-eto maka nkwa ya ọ bụ naanị ikuku ọkụ.

Mba ka na-agba nkịtị na nkatọ a na-enye ha banyere oke ọnụ ahịa obibi ndụ nye ndị ọrụ mbịarambịa 30,000 rụrụ ọgbọegwuregwu ndị a, gụnyere ọtụtụ ndị ọrụ nwụrụ anwụ na ndị merụrụ ahụ. E nwekwara ebubo ịmanye ndị ọrụ n'ike, ọnọdụ ịrụ ọrụ siri ike, ụlọ obibi na-adịghị mma, akwụghị ụgwọ ọrụ nakwa ịkpachi akwụkwọ njem.

Gọọmenti mba Qatar gọrọ ebubo ndị a, kwuo na kamgbe afọ 2017 ka ha malitere atụmatụ ichekwa ndị ọrụ mbịarambịa site n'ịrụ ọrụ n'oke okpomọkụ, ibelata oge ọrụ ha nakwa iwulite ọnọdụ ebe obibi ndị ọrụ. Mana naanị n'afọ 2021, ndị ọrụ 50 nwụrụ ebe ndị ọrụ karịrị 500 merụrụ nnukwu ahụ na Qatar n'ime ndị niile na-arụ ọrụ metụtara Iko Mbaụwa, dịka ozi si n'aka otu na-ahụ maka ndị ọrụ n'ụwa (International Labour Organization) si kwuo. Nke a bụ okwu ọzọ dapụtara ebe akụkọ banyere mba ọzara a ga-abụ ihe a ga na-enyocha.

...there we go.