Igosipụta nkwatu ọchịchị nke gara nke ọma n'Afrịka n'ime afọ iri asaa
E nweela ihe ruru nkwatu ọchịchị otu narị na iri atọ ndị gara nke ọma n'ime mba Afrịka 36 kemgbe afọ 1952 oge Eze Farouk nke Ijipt bụụrụ Onyeisi ọchịchị mbụ a chụpụrụ n'Afrịka.
Ndị ndu Afrịka a chụpụrụ n'ọkwa
-
Onyeisiala
Gabon
Gụrụ gawa... -
Mohamed Bazoum
OnyeisialaNijie
Gụrụ gawa... -
Paul-Henri Sandaogo Damiba
Onyeisiala nchereogeBọkịna Faso
Gụrụ gawa... -
Rocha Kabore
OnyeisialaBọkịna Faso
Gụrụ gawa... -
Abdalla Hamdok
Praịm MịnịstaSụdan
Gụrụ gawa... -
Alpha Condé
OnyeisialaGinii
Gụrụ gawa... -
Bah N'daw
OnyeisialaMali
Gụrụ gawa... -
Ibrahim Boubacar Keita
OnyeisialaMali
Gụrụ gawa... -
Omar al-Bashir
OnyeisialaSụdan
Gụrụ gawa... -
Robert Mugabe
OnyeisialaZimbabuwe
Gụrụ gawa... -
Blaise Compaore
OnyeisialaBọkịna Faso
Gụrụ gawa... -
Mohamed Mohamed Morsi
OnyeisialaIjipt
Gụrụ gawa... -
François Bozizé Yangouvonda
OnyeisialaSentral Afrịkan Rịpọblik
Gụrụ gawa... -
Amadou Toumani Touré
OnyeisialaMali
Gụrụ gawa... -
Muammar Gaddafi
Ọnyeisi obodoLibịa
Gụrụ gawa... -
Laurent Gbagbo
OnyeisialaAịvri Kost
Gụrụ gawa... -
Hosni Mubarak
OnyeisialaIjipt
Gụrụ gawa... -
Zine El Abidine Ben Ali
OnyeisialaTunishịa
Gụrụ gawa... -
Mamadou Tandja
OnyeisialaNijie
Gụrụ gawa... -
Kaptịn Moussa Dadis Camara
OnyeisialaGinii
Gụrụ gawa... -
Marc Ravalomanana
OnyeisialaMadagaska
Gụrụ gawa... -
Aboubacar Somparé
OnyeisialaGinii
Gụrụ gawa... -
Sidi Ould Cheikh Abdallahi
OnyeisialaMọrịtenịa
Gụrụ gawa... -
Maaouya Ould Sid' Ahmed Taya
OnyeisialaMọrịtenịa
Gụrụ gawa... -
Fradique de Menezes
OnyeisialaSao Tome na Principe
Gụrụ gawa... -
Ange-Felix Patassé
OnyeisialaSentral Afrịkan Rịpọblik
Gụrụ gawa... -
Henri Konan Bédié
OnyeisialaAịvri Kost
Gụrụ gawa... -
João Bernardo Vieira
OnyeisialaGinii-Bisao
Gụrụ gawa... -
Tadjidine Ben Said Massonde
OnyeisialaKomoros
Gụrụ gawa... -
Ibrahim Baré Maïnassara
OnyeisialaNijie
Gụrụ gawa... -
Johnny Paul Koroma
Onyeisi ObodoSierra Leone
Gụrụ gawa... -
Pascal Lissouba
OnyeisialaKongo
Gụrụ gawa... -
Ahmad Tejan Kabbah
OnyeisialaSierra Leone
Gụrụ gawa... -
Mobutu Sese Seko
OnyeisialaDR Kongo
Gụrụ gawa... -
Sylvestre Ntibantunganya
OnyeisialaBurundi
Gụrụ gawa... -
Mohammed Farrah Aidid
OnyeisialaSọmalịa
Gụrụ gawa... -
Mahamane Ousmane
OnyeisialaNijie
Gụrụ gawa... -
Valentine Strasser
Onyeisi ObodoSierra Leone
Gụrụ gawa... -
Mohamed Said Djohar
OnyeisialaComoros
Gụrụ gawa... -
Miguel Trovoada
OnyeisialaSao Tome na Principe
Gụrụ gawa... -
Dawda Kairaba Jawara
OnyeisialaGambịa
Gụrụ gawa... -
Ernest Shonekan
OnyeisialaNaịjirịa
Gụrụ gawa... -
Joseph Momoh
OnyeisialaSierra Leone
Gụrụ gawa... -
Chadli Benjedid
OnyeisialaỌljirịa
Gụrụ gawa... -
Justin Lekhanya
OnyeisialaLesoto
Gụrụ gawa... -
Moussa Traoré
OnyeisialaMali
Gụrụ gawa... -
Mohamed Siad Barre
OnyeisialaSọmalịa
Gụrụ gawa... -
Hissène Habré
OnyeisialaChad
Gụrụ gawa... -
Samuel Doe
Onyeisi ObodoLaịberịa
Gụrụ gawa... -
Ahmed Abdallah Abderemane
OnyeisialaKomoros
Gụrụ gawa... -
Sadiq al-Mahdi
Praịm MịnịstaSụdan
Gụrụ gawa... -
Habib Bourguibia
OnyeisialaTunishịa
Gụrụ gawa... -
Thomas Sankara
OnyeisialaBọkịna Faso
Gụrụ gawa... -
Jean-Baptiste Bagaza
OnyeisialaBurundi
Gụrụ gawa... -
Tito Lutwa Okello
OnyeisialaYuganda
Gụrụ gawa... -
Leabua Jonathan
Praịm MịnịstaLesoto
Gụrụ gawa... -
Muhammadu Buhari
OnyeisialaNaịjirịa
Gụrụ gawa... -
Milton Obote
OnyeisialaYuganda
Gụrụ gawa... -
Gaafar Muhammad al-Nimeiry
Onyeisi obodoSụdan
Gụrụ gawa... -
Mohamed Khouna Ould Haidalla
OnyeisialaMọrịtenịa
Gụrụ gawa... -
Louis Lansana Beavogui
Onyeisiala nchereogeGinii
Gụrụ gawa... -
Shehu Shagari
OnyeisialaNaịjirịa
... -
Jean-Baptiste Ouédraogo
OnyeisialaBọkịna Faso
Gụrụ gawa... -
Saye Zerbo
OnyeisialaBọkịna Faso
Gụrụ gawa... -
Goukouni Oueddei
OnyeisialaChad
Gụrụ gawa... -
Hilla Limann
OnyeisialaGana
Gụrụ gawa... -
David Dacko
OnyeisialaSentral Afrịkan Rịpọblik
Gụrụ gawa... -
Sangoulé Lamizana
OnyeisialaBọkịna Faso
Gụrụ gawa... -
Luís Cabral
OnyeisialaGinii-Bisao
Gụrụ gawa... -
Godfrey Binaisa
OnyeisialaYuganda
Gụrụ gawa... -
William Tolbert
OnyeisialaLaịberịa
Gụrụ gawa... -
Mohamed Mahmoud Ould Louly
OnyeisialaMọrịtenịa
Gụrụ gawa... -
Jean-Bedel Bokassa
Onyeisiala/EzeonyeagwalamSentral Afrịkan Rịpọblik
Gụrụ gawa... -
Francisco Macias Nguema
OnyeisialaEkwitorịa Ginii
Gụrụ gawa... -
Yusufu Lule
OnyeisialaYuganda
Gụrụ gawa... -
Fred Akuffo
OnyeisialaGana
Gụrụ gawa... -
Mustafa Ould Salek
OnyeisialaMọrịtenịa
Gụrụ gawa... -
Idi Amin Dada
OnyeisialaYuganda
Gụrụ gawa... -
Joachim Yhombi-Opango
OnyeisialaKongo
Gụrụ gawa... -
Moktar Ould Daddah
OnyeisialaMọrịtenịa
Gụrụ gawa... -
Ignatius Kutu Acheampong
Onyeisi ObodoGana
Gụrụ gawa... -
Ali Soilih
OnyeisialaKomoros
Gụrụ gawa... -
Tafari Benti
OnyeisialaItiopịa
Gụrụ gawa... -
James Mancham
OnyeisialaSichels
Gụrụ gawa... -
Michel Micombero
OnyeisialaBurundi
Gụrụ gawa... -
Ahmed Abdallah Abderemane
OnyeisialaKomoros
Gụrụ gawa... -
Yakubu Gowon
OnyeisialaNaịjirịa
Gụrụ gawa... -
François Tombalbaye
OnyeisialaChad
Gụrụ gawa... -
Richard Ratsimandrava
Onyeisi obodoMadagaska
Gụrụ gawa... -
Gabriel Ramanantsoa
OnyeisialaMadagaska
Gụrụ gawa... -
Aman Mikael Andom
Onyeisi ObodoItiopịa
Gụrụ gawa... -
Haile Selassie I
EzeonyeagwalamItiopịa
Gụrụ gawa... -
Hamani Diori
OnyeisialaNijie
Gụrụ gawa... -
Grégoire Kayibanda
OnyeisialaRụwanda
Gụrụ gawa... -
Justin Ahomadegbé- Tomêtin
OnyeisialaBene
Gụrụ gawa... -
Philibert Tsiranana
OnyeisialaMadagaska
Gụrụ gawa... -
Dr Kofi Busia
Praịm MịnịstaGana
Gụrụ gawa... -
Milton Obote
OnyeisialaYuganda
Gụrụ gawa... -
Emile Derlin Zinsou
OnyeisialaBene
Gụrụ gawa... -
Abdirashid Ali Sharmarke
OnyeisialaSọmalịa
Gụrụ gawa... -
King Idris I
EzeLibịa
Gụrụ gawa... -
Ismail al-Azhari
Onyeisi obodoSụdan
Gụrụ gawa... -
Modibo Keïta
OnyeisialaMali
Gụrụ gawa... -
Alphonse Massamba-Débat
OnyeisialaKongo
Gụrụ gawa... -
Andrew Juxton-Smith
Onyeisi obodoSierra Leone
Gụrụ gawa... -
Christophe Soglo
OnyeisialaBene
Gụrụ gawa... -
David Lansana
OnyenduSierra Leone
Gụrụ gawa... -
Siaka Stevens
Praịm MịnịstaSierra Leone
Gụrụ gawa... -
Nicolas Grunitzky
OnyeisialaTogo
Gụrụ gawa... -
Ntare V
EzeBurundi
Gụrụ gawa... -
Léopold Biha
Praịm MịnịstaBurundi
Gụrụ gawa... -
Kwame Nkrumah
OnyeisialaGana
Gụrụ gawa... -
Eze Mutesa II nke Buganda
Eze/OnyeisialaYuganda
Gụrụ gawa... -
Abubakar Tafawa Balewa
Praịm MịnịstaNaịjirịa
Gụrụ gawa... -
Maurice Yaméogo
OnyeisialaBọkịna Faso
Gụrụ gawa... -
David Dacko
OnyeisialaCentral African Republic
Gụrụ gawa... -
Sourou-Migan Apithy
Praịm MịnịstaBene
Gụrụ gawa... -
Moïse Tshombe
Praịm MịnịstaDR Kongo
Gụrụ gawa... -
Ahmed Ben Bella
OnyeisialaỌljirịa
Gụrụ gawa... -
Léon M'ba
OnyeisialaGabon
Gụrụ gawa... -
Hubert Maga
OnyeisialaBene
Gụrụ gawa... -
Fulbert Youlou
OnyeisialaKongo
Gụrụ gawa... -
Sylvanus Olympio
OnyeisialaTogo
Gụrụ gawa... -
Patrice Lumumba
Praịm MịnịstaDR Kongo
Gụrụ gawa... -
Abdallah Khalil
Praịm MịnịstaSụdan
Gụrụ gawa... -
Muhammad VIII ad-Amin
EzeTunishịa
Gụrụ gawa... -
Muhammad Naguib
OnyeisialaIjipt
Gụrụ gawa... -
Farouk nke Ijipt
EzeIjipt
Gụrụ gawa ...
Ọlọrọ ọhụrụ
Afrịka ahụtala nkwatu ọchịchị asatọ gara nke ọma n'ime afọ atọ. Ọnọdụ nkwatu ọchịchị a na-esochi oge nkwatu ọchịchị ndịagha gbaturu ala n'ime afọ iri abụọ rute 2020, dịka ọ gbagochara n'ime afọ ndị 1970.
Ọrụ nke ndụ
Ụfọdụ ndị ndu jichiri ọchịchị chịrị ọtụtụ afọ ebe anapụrụ ndị ọzọ ikikere ọchịchị ahụ n'ime ụbọchị ole na ole ha weghaara gọọmenti.
Iji maa atụ, Onyeisiala Ekwitorịa Ginii bụ Teodoro Obiang Nguema a nọrọla dịka Onyeisiala afọ 44 o werechara ọchịchị n'ike n'afọ 1979.
Ọ bụ onyendu Afrịka kachasị nọrọ n'ọkwa.
Ndị ndu lọghachiri n'ọkwa oge a chụpụchara ha
Mpaghara akwaturu ọchịchị
Ọtụtụ obodo ndị e nwere na mpaghara Sahel ahụtala nkwatu ọchịchị ndịagha. Nkwatu ọchịchị ndị mere na nso nso a na mpaghara ahụ a maara dịka mpaghara nkwatu ọchịchị mere na Nijie na Gabọn n'afọ 2023.
Ndị ọchịchị ndịagha jichikwara ọchịchị na Mali n'ime afọ 2020 na 2021 ebe nke Chad, Ginii na Sụdan mere n'afọ 2021. Bọkịna Faso hụtakwara nkwatu ọchịịchị abụọ n'afọ 2022. Mba niile ndị a ewezuga Sụdan bụcha ndị nọbu n'okpuruọchịchị Fransị.
Kemgbe 2000, ọkara atọ (19 n'ime 26) nke nkwatu ọchịchị ndị gara nke ọma n'Afrịka mechara na mba ndị nọbu n'okpuru ọchịchị Fransị. Nke a emeela ka ụfọdụ jụọ ajụjụ ma mmetụta Fransị ọ na-akụsasị Afrịka.
Nkwatu ọchịchị ndị gara nke ọma kemgbe 1952
Ọtụtụ mba n'Ọdịda anyanwụ na Etiti Afrịka enweela ọtụtụ nkwatu ọchịchị gara nke ọma. Ihe ruru ọkara mba 17 ndị opekatampe nkwatu ọchịchị anọ ha gara nke ọma dịcha n'Ọdịda anyanwụ Afrịka.
Bọkịna Faso enweela ọnụọgụ nkwatu ọchịchị kachasị gaa nke ọma n'Afrịka dịka ha mere ya ugboro asatọ ebe Sierra Leone na Yuganda na-esote site n'inweta asaa n'otu n'otu.
Ọ bụ naanị ọkara atọ na mba Afrịka tụmadị n'Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda Afrịka bụ ndị na-ahụtabeghị nkwatu ọchịchị gara nke ọma.
N'afọ 34, Ibrahim Traoré bụ onyeisiala kachasị obere n'ụwa. Ọ malitere ịbụ onyeisiala nchereoge Bọkịna Faso n'isochi nkwatu ọchịchị ndịagha mere n'abalị 30 Septemba 2022 bụ nke wezugara onyeisiala nchereoge n'oge ahụ bụ Paul-Henri Sandaogo Damiba.
Mweghara ọchịchị ndịagha
Ihe fọdụrụ obere ka o ruo pasenti 90 nke nkwatu ọchịchị ndị ahụ gara nke ọma bụ nke ndịagha mere ebe nke ndị omekoome na-esote ya bụ nke dị pasenti 4. Nkwatu ọchịchị ndị ọzọ e mere n'Afrịka gụnyere nke ndị ekweghị, ọchịchị ndị nkụchi, ndịagha isi ekweghị ọnwụ na nke ndị ọchịchị.
Ogbu mma ga-ala na mma
Ọtụtụ ndị ndu banyere n'ọchịchị site na nkwatu ọchịchị bụ ndị e mechara chụpụ maọbụ gbuo mgbe ụfọdụ.
N'afọ 1972, General Ignatius Kutu Archeampong nọọrọ n'isi nkwatu ọchịchị na-enweghị nkwafu ọbara e ji chụpụ Praịm Mịnịsta Gana ahọpụtara n'usoro ọchịchị onyekwuoucheya bụ Dr. Kofi Busia. Mgbe afọ isii gasịrị, ac hụpụrụ ya n'ọchịchị ma gbagbuo ya dịka ọ gasịrị otu afọ.
Jean-Baptiste Bagaza chụpụrụ onyeisiala Burundi bụ Michel Micombero n'afọ 1976 ma weghara ọchịchị. Ka afọ iri na otu gasịrị, a chụpụrụ ya nke mere ka ọ gbaa ọsọ ndụ.
Omar al-Bashir batara n'ọchịchị n'afọ 1989 dịka onye brigadier general nke ndịagha Sụdan, o duuru otu ndịagha kwatuo ọchịchị a họpụtara n'usoro onyekwuoucheya. Ọ gara n'ihu dịka onyeisi obodo Sụdan n'okpuru ọkwa dị iche iche malite na 1989 ruo 2019 bụ mgbe e ji nkwatu ọchịchị wezuga ya.
François Bozizé Yangouvonda weghaara ọchịchị n'afọ 2003 iji bụrụ onyeisiala nke isii nke Sentralụ Afrịkan Rịpọblik. E mechara chụpụ ya ka afọ iri gasịrị.
Idobe ya n'ezinaụlọ
Ijichi ikikere ọchịchị bụ njirimara ezinaụlọ dị iche iche n'ụfọdụ mba. Onyeisiala Ekwitorịa Ginii bụ Francisco Macías Nguema bụ onye nwa nwanne ya bụ Teodoro Obiang Nguema Mbasogo chụpụrụ na nkwatu ọchịchị tara isi mmadụ n'afọ 1979. Teodoro nọchiri anya ya. N'afọ 2024, ọ bụụrụ onyeisiala nke abụọ kachasị nọrọ n'oche ọchịchị nke na-abụghị ocheeze na mbaụwa.
Laurent Kabila chụpụrụ Onyeisiala Mobutu Sese Seko n'afọ 1997 iji bụrụ onyeisiala nke atọ na DR Kongo. Nwa ya nwoke gbara afọ 29 n'oge ahụ bụ Joseph Kabila nọchiri anya ya oge otu n'ime ndị nche ya gbagburu ya.
Nkwatu ọchịchị Gabọn: Ndịagha weghaara ọchịchị n'aka Ali Bongo ma nwụchie ya n'ime ụlọ
Nkwatu ọchịchị Nijịa: A ga-ata Fransị ụta maka enweghị udo n'Ọdịda anyanwụ Afrịka?
Nkwatu ọchịchị Bọkịna Faso: Onyeagha a chụpụrụ n'ọkwa ọchịchị bụ Damiba nọ na Togo