newsspec-35029-100-women > app > igbo > embed

Test Embed Page made with 10.1.4 generator and 10.1.0 embed wrapper

Click here for a list of include paths

Click here for a test page with no right hand side

Inye Ndị Ọchịchị Na-ahụ Maka Ngwa Ọbịaru ọsọ ọsọ Kpamkpam Usoro Elu Mmetụta Na India Na-agbakwunye Ohere zuru ụwa ọnụ na gburugburu ebe obibi dị mma Site na Inye Nleba Anya Ndị Afọ Forex Iji Nweta Ọfịs, Ozi Ọnọdụ Ọnọdụ Ya

Ozi enyi na ndụ, echiche ha, nkwurịta okwu, ihe owuwu, ahịa, wdg, ebumnuche ebumnuche ebumnuche bụ otu. A na-agwa ntinye ntuziaka ịzụta. Ugbu a, isiokwu nke nnwere onwe Bekee ekwughi okwu isiokwu nnwere onwe nke Bekee. Jaane Dishame World Hardware Dị Mkpa Ime Anwansi na-ahụ maka Ndị Ọrụ Na-ahụ Maka Ọrụ Ma,

Ụmụnwaanyị aha ha nọ na BBC 100 Women 2022

BBC 100 Women 2022: Kedụ ndị aha ha gbara na ya n'afọ a?

100 Women - BBC Wolrd Service

BBC ewepụtala aha ụmụnwaanyị 100 kacha kpalie mmụọ ndị mmadụ ma kwalite ndị mmadụ n'ụwa niile n'afọ 2022

N'ime ha bụ otiegwu ụwa niile a ma ama bụ Billie Eilish, Nwaunye onyeisiala Yukren Lady Olena Zelenska, ome ejije Priyanka Chopra Jonas na Selma Blair, otiegwu ndị Rọshịa a ma ama Alla Pugacheva, Onye Iran Elnaz Rekabi, onye egwuregwu na-awụ jọpụ Yulimar Rojas na onye na-eme ejije si Gana bụ Nana Darkoa Sekyiamah.

Nke a bụ nke agba nke 100 atụmatụ ụmụnwaanyị 100 nke kpatara anyị ji enyocha ọganihu anyị nweterala kamgbe afọ iri a. Ebe e nwerela ọtụtụ agamnihu n'ihe gbasara ikike dịịrị ụmụnwaanyị - sitekwa na ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị nọ n'ọchịchị rụọ n'atụmatụ MeToo - maka ọtụtụ ụmụnwaanyị n'ebe dị icheiche n'ụwa, ọ ka dịkwa ka ụzọ ka dị ogologo.

Aha ndị a na-egosi ụmụnwaanyị ndị na-arụ ọrụ pụrụiche n'etiti agha maọbụ nsogbu n'ụwa niile gbaa gburugburu n'afọ 2022 - site na ụmụnwaanyị ndị duru ngagharị na-achọ mgbanwe n'Ịran, gakwuru ụmụnwaanyị ndị nọ n'agha na-eme na Yukren na Rọshịa. Anyị gwakwara ndị bụrụ 100 Women gara aga ka ha ahọpụta ndị ha chere toruru ma kwesiri ịnọ n'aha ndị a.

Ndọrọndọrọ na Agụmakwụkwọ

Maeen Al-Obaidi

Maeen Al-Obaidi, Yemen

Ọkaiwu

Dịka agha a na-alụ na mba Yemen kawanyere njọ n'afọ, ọkaiwu Maeen Al-Obaidi ka na-etinye uchu ịweta udo n'obodo Taiz ebe agha na-ada. O wepụtara onwe ya dịka onye na-ekpe udo ma na-enyere aka ịhụ na otu ndị na-alụ ọgụ gbanwere ndị ha jidere n'etiti ha. Agbanyeghị na ọbụghị oghe niile ka ndị ọ na-akpolata na-adị ndụ, ụfọdụ ka ọ na-ahụ na ozu ha rutere ezinụlọ ha.

Ọ họpụtara onwe ya ma soro otu Yemen Women Union ebe ọ na-akwado ụmụ nwaanyị ndị nọ na nga. Ọ bụ ya bụ nwaanyị mbụ akwalitere n'ọkwa nke Lawyers Syndicate Council, nke na-ahụ maka ikike dịịrị onye na nwereonwe ndị mmadụ.

Fatima Amiri

Fatima Amiri, Afghanistan

Nwa Akwụkwọ

Fatima Amiri bụ nwa agbọghọ mba Afghanistan gbanahụrụ ọnwụ mgbe atụrụ ogbunigwe gburu mmadụ 50 na Kabul, nke ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụ nwaanyị. Ọ merụrụ ahụ ebe ọ dị njọ dịka otu anya ya kpọrọ, ma merụọ kwa ahụ na agba na ntị ya.

Dịka ọ na-agbake, ọ lere ule ịbanye mahadum n'ọnwa Oktoba ma nweta akara 85%. Ọ chọrọ ịgụ Komputa Science na mahadum Kabul ma sị na anya ya ịkpọ gbara ya ume ka o ji sie ike

Nathalie Becquart

Nathalie Becquart, Vatican

Nọọnụ

Nhọpụta Poopu Francis họpụtara ya dịka odeakwụkwọ otu ndị Bishọpụ mee ya nwaanyị mbụ ga-anọ n'ọkwa ahụ. N'ọkwa ahụ, o so n'otu n'ime ndị ndu na-adụ poopu ọdụ n'okwu gbasara ụka Katọlik ma bụrụkwa naanị nwaanyị nwere ikike ibinyeaka n'okwu. Onyeisi odeakwụkwọ otu ahụ kwuru n'afọ 2021 na nhopụta ya gosiri na 'otu ụzọ emeperela' ụmụnwaanyị.

Oge mbụ, ọ bubu nọọnụ nọ n'ọtụ Xaviere na Frans ma bụrụ nwaanyị mbụ nọrọ n'isioche otu National Service for the Evangelisation of Young People and Vocations na mba Frans

Dịka pọọpụ Francis siri kwuo, 'ọ bụ ọrụ ikpe mkwumọtọ ịlụ ọgụ megide ikpaoke na mmegbu, mwakpo na mmetọ ọbụla megide ụmụnwaanyị...Anyị niile kwesiiri ijikọ aka ọnụ kwado ụmụnwaanyị nọ n'ọkwa dị icheiche aka n'ebe dị icheiche.

Nathalie Becquart

Taisia Bekbulatova

Taisia Bekbulatova, Rọshịa

Onye ntaakụkọ

Taisia Bekbulatova bụ onye ntaakụkọ a ma ama na mba Rọshịa, ma bụrụkwa onye hibere ụlọọrụ ntaakụkọ Holod Media n'afọ 2019. ụlọọrụ a ewepụtala ọtụtụ akụkọ maka agha a na-alụ na Yukren, nakwa ọtụtụ akụkọ gbasara inweta nhatanha, igbochi mmekpa ahụ, na ịkwalite ikike dịịrị mmadụ. N'ọnwa Eprel, ọba ozi ụlọ ntaakụkọ ahụ so na ndị nke gọọmentị Rọshịa mechiri oge ha wakporo ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ.

N'agbanyeghị nke a, Bekbulatova na ndị ọrụ ya ekwuola na ha ga na-aga n'ihu n'ọrụ ha, ọbụladị dịka ọnụọgụgụ ndị na-agụ akụkọ ha na-agbali elu. Bekbulatova, onye hapụrụ mba Rọshia na 2021 dịka gọọmentị boro ya ebubo na ọ na-arụrụ gọọmentị ndị mba ọzọ ọrụ, agaala mba Yukren n'onwe ya iji nọrọ n'ihu ọgụ kọọ akụkọ ihe na-eme ebe ahụ.

Ekwenyeghị m na ọganihu ga-abịarịrị. Mmepe ọgbara ọhụrụ bụ ihe e kwesịrị ị na-echekwa ka ọ ghara ibibi. maka na nke a mee, ikike ụmụnwaanyị bụ ihe mbụ ga-efu.

Taisia Bekbulatova

Kristina Berdynskykh

Kristina Berdynskykh, Ukraine

Onye ntaakụkọ

Dịka a na-alụ agha mba YUkren, ọnye ntaakụkọ Kristina Berdynskykh agazuola mba ya niile, ma na-eweta akụkọ na mpaghara ndị mba Rọshịa ji ogbunigwe awakpo.Ụfọdụ ọrụ ntaakụkọ ya bụ igosi etụ ndị mmadụ si ebi ndụ ha agbanyeghị agha.

Berdynskykh onye a mụrụ n'obodo Kherson rụrụ ọrụ dịka onye ntaakụkọ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchichị na Kyiv afọ 14. Ọ rụụrụ akwụkwọ mgbasa ozi nke NV, ma tinye aka n'ọrụ ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ nke Redio na nke ihe onyonyo.O hiwere e-People, nke bụ atụmatụ soshal Midịa maka ndị gbara mbọ na Euromaidan Revolution nke mba YUkren nke emechara dee dịka akwụkwọ.

María Fernanda Castro Maya

María Fernanda Castro Maya, Mexico

Onye-alụ ọgụ ikike dịrị onye nye ndị nkwarụ

Fernanda Castro bụ nwaanyị nwere nkwarụ ụbụrụisi na-alụ ọgụ ikike dịrị onye nye ndị ọzọ dịka ya ka ha nweeike sonye na ndọrọndọrọ ọchịchị. Otu Human Rights Watch na-akwado otu na-alụ ọgụ a nke o so n'ime ya dịka ha na-agbasaozi na-ekwu ka ndị Mexico nye ndị nkwarụ ụbụrụisi ohere isionye na ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọrụ ya gụnyere ntụgharị asụsụ n'akwụkwọ ndị metụtara mkpebi ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na inye mmadụ niile ohere na ọrụ ọchịchị. Castro so na ndị a họpụtara na Mexico isonye otu United Nations dịka bipụtara akwụkwọ banyere ikike ndị nkwarụ ma bụrụkwa onye nnọchiteanya mba a n'otu ụwa global network Inclusion International.

Chanel Contos

Chanel Contos, Ọstrelia

Onye na-ekwu okwu banyere nkwenye aramara

Ọ chọpụtara otu a na-akpọ 'Teach Us Consent' na-ekwusi okwu ike maka ndị mmadụ iji anya ọcha ha kwenye tupu ha nwee aramara ma na-akụzi ihe gbasara aramara. N'afọ 2021, Chanel Contos tinyere ihe na Instagram ya ebe ọ na-ajụ ndị na-eso ya ma ha ama onye ọbụla a wakporola n'ụlọakwụkwọ ha. N'ime otu ụbọchi, ihe ruru mmadụ 200 zara ya 'eeh'.

Ọ malitere ideakwụkwọ mkpesa ịkpọ oku ka e welite oge mmadụ nwereike ikwenye maka aramara. Ekele dịrị ya maka na site na mkpesa ya, a ga-amalitezi ikuzi make nkwenye aramara n'ụlọakwụkwọ malite n'ọtakara ruo afọ iri n'afọ 2023. Ugbua, ọ na-akuziziri ndị mmadụ make iwepụ okpu nnabeụenyi ma onye gị na ya na-eme aramara ekwenyeghi maọbụ izoro ezo wepụ ọkpụ nnabụenyi n'oge aramara ma onye nke ọzọ amaghị, ọ na-eme mkpesa ka e mee ụdị agwa ahụ ka ọ bụrụ ihe megidere iwu.

Eva Copa

Eva Copa, Bolivia

Onye ndọrọndọrọ

Onye si n'agbụrụ Aymara bụbụ onye ndụ na mahadum ya, Eva Copa na-akwagharị ndọrọndọrọ na Bolivia. Oge ọndị pati ya ahọpụtaghị ya ka ọ zọọ ọkwa mayọ nke El Alto, obodo so nke kachasị na mba ahụ, o guzoro na ndọrọndọrọ megide onye pati ha wepụtara ma jiri vootu pasteni 69 merie ya. Na nso nso a, o kwupụtara atụmatụ obodo ahụ nwere maka ụmụnwaanyị, nke ga-akwalite ikike ụmụnwaanyị site na atụmatụ obodo na itinye ego kwado ha.

Copa abụghị onye ọhụrụ na ndọrọndọrọ maka ọ rụọla dịka onye omeiwu sinteọ n'afọ 2015 ruo 2020. Ndị mmadụ na-ahụta nkewa o kewapụrụ na pati na-achị ka ihe ga-ewebata mgbanwe ga-ahụ ọtụtụ agwa ndị mmadụ na ndọrọndọrọ ndị Bolivia.

Ka anyị nwetakwuo ọtụtụ ndị ndu bụ ụmụnwaanyị ndị nọ n'ụkwụ ha oge ọbụla, ọ bụghị n'ikpere ha.

Eva Copa

Joy Ngozi Ezeilo

Joy Ngozi Ezeilo, Naịjirịa

Ọkammụta Iwu

Ọ bụbu onyeisi ngalaba na-akụzị iwu na mahadum University of Nigeria, ọ bụbukwa onye nnọchiteanya otu mbaụwa United Nations n'okwu gbasara ịgba mgbere mmadụ, Joy Ezeilo bụ onye nwere agba n'okwu ikike dịịrị onye na mbaụwa.

Ọ malitere ma bụrụ onyeisi otu Women Aid Collective (WACOL) bụ otu o ji enyere ndị mmadụ aka inye ha ọkaiwu n'efu kamgbe ihe rurula afọ 25. O nyekwala ihe ruru ụmụnwaanyị 60,000 ebe ha debere isi ha bụ ụmụnwaanyị ndị a na-emegbu emegbu. O bidokwara otu Tamar Sexual Assault Referral Centre iji gbatara ndị a na-emegbu ọsọ enyemaka ngwangwa.

Chimamanda Ngozi Adichie

Onye meriri n'afọ 2021 bụ Chimamanda Ngozi Adichie họpụtara ya

Ọkammụta Ezeilo agbanwela ọtụtụ ndụ site na inyere ndị mmadụ nnọchiteanya ndị ọkaiwu n'efu ọkachasị ụmụnwaanyị na ụmntakịrị ndị a megburu maọbụ e metọrọ.

Ibijoke Faborode

Ibijoke Faborode, Naịjirịa

Onye sọ malite otu ElectHer

Site n'ụlọọrụ ya bụ ElectHer, Ibijoke Faborode na-ahazigharị okwu ụmụnwaanyị isonye na ndọrọndọrọ ọchcịchị na Naịjirịa. Otu ya na-agba mbọ imechi ohere dị n'etiti ụmụnwoke na ụmụnwaanyị n'ime ọkwa ndọrọndọrọ nke mere na ya na ihe ruru ụmụnwaanyị 2,000 ezutela na ndọrọndọrọ na mpaghara Afrịka. Site n'atụmatụ #Agender35 ọ malitere, otu ya na-akwadọ ụmụnwaanyị 35 ka ha zọọ ọkwa dị icheiche n'okpuruọchịchị mọabụ n'etiti na ntuliaka 2023, ọ na-enye ha nkwado ego nakwa mmadụ.

Ọ malitekwara igwe mbụ na-adị n'ekwentị e ji ahazị etu ụmụnwaanyị si esonye na ntuliaka. Faborode sokwa na ndị ndu otu Leadership Council of the Democracy and Culture Foundation bụ otu na-achọpụta ụzọ ọhụrụ iji hazie ọchịchị onye kwuo uche ya.

Erika Hilton

Erika Hilton, Brazil

Onye ndọrọndọrọ

Nwaanyị mbụ bụbụ nwoke isi ojii a họpụtara n'oche omeiwu National Congress nke Brazil. Erika Hilton bụ onye na-agbasa ozi megide ịkpa oke agbụrụ maka ndụ LGBTQ+ nakwa ikike dịịrị onye.

Dịka nwantakịrị nwaanyị na-etolite etoliet, ezinaụlọ ya chụpụrụ ya mere o ji biri n'okporoụzọ tupu ọ gaa mahadum. O mere ndọrọndọrọ oge ọ bụ nwata akwụkwọ, ma mechaa gawa Sao Paulo gaa sonyere party ndị aka ekpe bụ PSOL party. N'afọ 2020, a họpụtara ya dịka otu n'ime ndị omeiwu obodo, ọ gara n'ihu mepụta iwu webatara ego e ji achụ agụụ ọzọ n'obodo kachasị na Brazil

Ọgụ anyị na-alụ inweta ikike dị nhatanha, ka a na-akwụ ma nwoke ma nwaanyị ụgwọ dị nhantanha nakwa ka a kwụsị mmegbu a na-emegbu ụmụnwaanyị, ma anyị abụ latin, ojii, ọcha, ogbenye, ma anyị nweburu ego.

Erika Hilton

Park Ji-hyun

Park Ji-hyun, Saụt Koria

Onye na-agba mbọ maka mgbanwe na ndọrọndọrọ ọchịchị

Oge ọ ka bụ nwa akwụkwọ, Park Ji-hyun so na ndị nyere aka gbaa otu ndị ekperima aramara ịntaneetị, a kpọrọ Nth rooms, n'anwụ. N'afọ a ka ọ pụtara kọọrọ ọha ahụmihe ya, bịakwa banye ndọrọndọrọ ọchịchị, ebe ọ na-emetụrụ ụmụnwaanyị na-eto eto.

Oge e meriri ndị otu 'Democratic Pati na ntuliaka ọkwa onyeisiala, ha kpọpụtara ya dịka otu n'ime ndị isi ha. Ọ nọkwa n'otu ụmụnwaanyị bụ nke ọrụ ha bụ ibu agha megide mpụ aramara ịntaneetị. N'ọnwa June, e merikwara pati ahụ ọzọ, nke mere o ji rituo n'ọkwa. Ọ bụ eziokwu na o nweghị ọkwa ọbụla o ji ugbua, ọ ka na-agbakwa mbọ iji nweta nhatanha ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na ndọrọndọrọ ọchịchị.

N'akụkụ ụwa niile, mpụ aramara ịntaneetị na-emegide ikike dịịrị ụmụnwaanyị, ọ dị mkpa na anyị ga-ejikọ aka ọnụ kwụsị ya.

Park Ji-hyun

Zahra Joya

Zahra Joya, Afghanistan

Onye ntaakụkọ

N'ime afọ isii n'okpuru ọchịchị Taliban, Zahra ghọrọ 'Mohammad' ma jikwa ka nwoke iji nweike gụ akwụkwọ. Mgbe ndị mba Amerịka kwaturu Taliban n'afọ 2001, ọ laghachiri akwụkwọ dịka Zahra. Ọ malitere ọrụ ntaakụkọ n'afọ 2011 ebe ọ na-awụkwarị naanị onye ntaakụkọ nwaanyị n'ụlọọrụ ya.

Ọ bụ ya malitere ụlọntakụkọ Rukhshana Media, naanị ụlọ ntakụkọ nke ụmụnwaanyị dị na mba Afghanistan nke a gụrụ aha otu ntorobịa dị afọ 19 ndị Taliban tugburu n'okwute. A zọpụtara ya n'Afghanistan n'afọ 2021 dịka o sizi na mba Briten arụ ọrụ Rukhshana Media. O ritere nturugo '2022 Changemaker' n'aka Gates Foundation.

E kwenyere m n'ike dị n'ọnụ okwu ma anyị ga-ekwuriri maka mmegbu a na-emegbu ụmụnwaanyị.

Zahra Joya

Ursula von der Leyen

Ursula von der Leyen, Jamini

Onyeisi otu European Commission

Nwaanyị mbụ na-abụ onyeisi otu European Commission, Ursula von der Leyen bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị si mba Jamini. Ọ rụrụ ọrụ n'isi obi gọọmentị Angela Merkel ma bụrụkwa nwaanyị mbụ bụrụ Mịnịsta okwu nchekwa dị n'aka a họpụtara na Jamini.

A mụrụ ya na Brussels, ọ gụrụ maka akanaụba obodo nakwa ọrụ dọkịnta tupu ọ banye ndọrọndọrọ. Ọ malitere ọrụ dịka onyes otu ọmịshọn ahụ n'afọ 2019, kamgbe ahụ, o duola ha gafee Brexit, ọrị zuru ụwa ọnụ Covid-19 nakwa agha na-eme na Yukren. Ọ bụ otu onye isi sekpụ ntị n'iwu ndị Eu mere iji nye ohere ka e nwee nhanta nwoke na nwaanyị n'isi oche ụlọọrụ dị ciheiche n'afọ 2022.

Sanna Marin

Onye họpụtara ya bụ onye meriri n'afọ 2020 bụ Praịm Mịnsịta ndị Finland Sanna Marin

Dịka mpaghara Yurop na-esi na nsogbu abanya na nsogbu, Ursula von der leyen egosila esi mkpebi ya ịhụ na ọ kpọpụara mpaghara Yurop niile na nsogbu ndị a ha nwere. Oge siri ike ma na ya onwe ya kpọrọ akpọ ma bụrụkwa ezigbo onye ndu.

Naomi Long

Naomi Long, Nọten Ayalandị

Onye ndọrọndọrọ ọchịchị

Onye bụbu mịnsịta ikpe nkwụmọtọ, Naomi Long wepụtara iwu dị icheiche iji belata mmetọ ụmụnwaanyị na mwakpo dị icheiche na mba Nọten Ayalandị n'afọ a nke gụnyere downblosuing, cyber-flashing na ikpochapụ 'aramara ike'. Ebe ọ bụ na e jila ọnwụ majaa ya, Long ekwukwala okwu iji nye mgbasaozi maka mmaja a na-amaja ụmụnwaanyị nọ na ndọrọndọrọ.

Dịka onye gụrụ inijia, ọ banyere pati Alliance Party n'afọ 1995. Dịka ọ rụchara ọrụ dịka Lord Mayor na Belfast, ọ bụrụ onye omeiwu mbụ a họpụtara na pati Alliance gara Westminster n'afọ 2010, ebe o meriri onye bụbu mịnịsta mbụ Peter Robinson ma chụpụ ya n'oche ọ nọrọ na Westminster kamgbe afọ 30.

Anyị kwesiri omenala na agwa ndị mmadụ na-ebute mmetọ n'obodo. Nke a pụtara na onye niile kwesiri itinye uchu nwale omenala ụmụnwoke inweta ihe niile, ime ka ụmnwoke kacha onye niile.

Naomi Long

Ayesha Malik

Ayesha Malik, Pakistan

Ọkaikpe

A họpụtara ya n'afọ a dịka nwaanyị mbụ bụ ọkaikpe n'ụlọikpe ukwu ndị Pakistan, Ọkaikpe Ayesha A. Malik ekpela ọtụtụ ikpe maka nchekwa ikike ụmụnwaanyị. Ikpe ndị a gụnyere otu n'ime ha kacha pụta ihe bụ iji mkpisi aka abụọ lelee ụmụnwaanyị ndị a wakporo n'ike. A na-emebu nnyocha ahụ iji lelee ndị a wakporo n'ike ma ha abụ 'ndị amabeghị nwoke' ruo mgbe a machiri ya n'afọ 2021.

Agbanyeghi ọrụ ya n'Ụlọikpe Ukwu, Malik na-enyekwa ndị ọkaikpe ibe ya ọzụzụ n'ụwa niile dịka ọ malitere ọgbakọ ndị ọkaikpe ụmụnwaanyị na Pakistan, ịkpali nrụrịtaụka gbasara iwebata ụmụnwaanyị n'okwu ndị ọkaiwu na ndị na-ekpe ikpe.

Ụmụnwaanyị kwesiri ikwalite akụkọ ha - nke gụnyere echiche ha, gosiri ihe ha na-agabiga ma gụnyekwa akụkọ gbasara ndụ ha.

Ayesha Malik

Zara Mohammadi

Zara Mohammadi, Ịran

Onye nkuzi

Dịka onye soro maliter otu Nojin-Socio Cultural Association, Zara Mohammadi etinyela ihe ruru afọ iri ikuzi asụsụ Kurdish n'obodo ya bụ Sanandaj.

Akwụkwọ iwu mba ịran kwuru na onye ọbụla nwere ikike iji asụsụ mpaghara ebe ha kuzie ihe n'ụlọakwụkwọ mana ndị ọkaiwu na ndị na-achụ ikike diiri onye kwuru na nke a abụghị ihe na-eme kpọmkwem ebe a naghị akuziri ụmụaka asụsụ nne ha n'ụlọakwụkwọ. Gọọmentị Iran boro Mohammadi ebubo na ọ 'na-ekpokọ otu chọrọ imegide nchekwa mba ha niile" nke mere e jiri maa ya ikpe afọ ise. Ọ nọ na nga kamgbe ọnwa Jenuwarị afọ 2022.

Mia Mottley

Mia Mottley, Barbados

Praịm Mịnịsta

Dịka praịm mịnsịsta nwaanyị mbụ nke mba Barbadọs, Mia Mottley meriri ntuliaka nke ugbo abụọ ya n'ọnwa Jenuwarị. Ọ bụrụla onyeisi pati ya bụ Labour na Barbadọs kamgbe afọ 2008. O duru mba agwa etiti ahụ dịka ha sepụrụ aka ma nweta nnwereonwe ha n'aka ezinaụlọ eze nke ndị Briten ma wepụ Eze dịka onyeisi ọchịchị ha ma bụrụ mba kacha ọhụrụ n'ụwa nwetara nnwereonwe ha kpamkpam.

A mara Mottley dịka onye nwere nkwuwa okwu n'okwu gbasara mgbanwe ihu eluigwe. N'ọgbakọ COP27, ọ katọrọ mba ndị nwere ego maka na ha enweghi ike ịkwụsị mgbanwe ihuigwe ma dọọ aka na ntị na ndị mgbanwe ihu eluigwe ga-achụpụ n'ụlọ ha nwereike iru otu ijeri mmadụ n'afọ 2050 maọbụrụ na o nweghi ihe e mere.

Sepideh Qoliyan

Sepideh Qoliyan, Iran

Onye achụmnta ndọrondọroọchịchị

Nwataakwụkwọ na-amụ maka Iwu, Sepideh Qoliyan bụ nke a tụbara mkpọrọ afọ ise maka ikwado ikike ruru ndị ọrụ na mpaghara Khuzestan dị na ndida Iran. O nọzuola afọ anọ n'ime ụlọ mkpọọ anọ dị icheiche n'Iran gụnyere Evin, ebe a na-edebekarị ndị mkpọrọ ndọrọndọrọ.

N'agbanyeghi na ọ nọ na mkpọrọ, ọrụ ya na-aga n'ihu dịka o zipuru ozi gbasara mmegbu ọ na-agabiga n'ebe ahụ. Ọ na-anọchikwa anya ụmụnwaanyị ndị a tụrụ nga. Mgbe ọ pụtara obere oge, p dere akwụkwọ gbasara "mmegbu" na "mkpagbu" ụmụnwaanyị na-agabiga n'ụlọ mkpọrọ mba Iran.

Roza Salih

Roza Salih, Skọtlandị

Onye ndọrọndọrọ

N'ọnwa Mee afọ 2022, Roza Salih bụrụ nwaanyị mbụ bụ onye gbara ọsọ ndụ a họpụtara ka onye omeiwu n'obodo Glasgow ebe ọ batara na mba Skọtlandị oge ọ bụ nwantakịrị mgbe ezinaụlọ ya gbara ọsọ n'Ịrak. Dịka omeiwu nke wọọdụ Greater Pollok, Salih ekwupụtala okwu maka ikike ndị gbara ọsọ ndụ maka na oge ọ ka bụ nwanta nwaanyị, ya na ndị enyi ya n'ụlọakwụkwọ mere ngaghrịiwe maka otu n'ime ha a kpọchiri.

Otu ozi ha bụ Glagow Girls, gosipụtara etu e si akpasa ndị gbara ọsọ ndụ agwa na gọọmentị etiti. Salih gakwara n'ihu soro alite otu Scottish Solidarity na Kurdistan ma na-aga mpaghara Kurd dị na Tọkị dịka onye na-alụ agha maka ikike ndị mamdụ.

Simone Tebet

Simone Tebet, Brazil

Omeiwu sineti na Brazil

Ọtụtụ na-ahụta ya dịka onye nwereike ibelata nsogbu nkewa dị na mba ahụ, Sinetọ Simone Tebet gbara onye nke atọ na ntuliaka onyeisiala e mere n'afọ a. A họpụtara ya dịka onye omeiwu n'afọ 2002 ebe ọ bụkwa onyeisi okpuruọchịchị ya Tres Lagoas n'afọ 2004 na 2008. N'afọ 2014, a họpụtara ya dịka omeiwu sineti ebe o jiri pasentị 552 vootu merie.

Ọ bụ nwaanyị mbụ nọrọ n'isi oche otu kọmitii Constitution na Jọztice n'ụlọ omeiwu sineti, otu kọmitii e chere na ọ bụ ya kachasị ogo. Ọ bụ ọkammụta iwu ihe karịrị afọ iri, Tebet nọkwara n'isioche kọmitii hụrụ maka ịkwụsị mmegbu na mmegide a na-emegide ụmụnwaanyị.

Onye ọbụla mata na ọdịnaihu bụ nwaanyị, ebe ọbụla nwaanyị chọrọ ịnọ ka ọ ga-anọ.

Simone Tebet

Kisanet Tedros

Kisanet Tedros, Eritrea

Onye ji nkuzi achụ ego

Beles Bubu bụ akara Youtube e ji akụzi ụmụaka ndị Eritrea asụsụ na omenaala ha, onye malitere ya bụ ome ejije Kisanet Tedros. A mụrụ ya na mba Etipia, mana o sitere na nwata ghọta mkpa ọ dị mmadụ ịma asụsụ ya nke ọma ma nwee mgbọrọgwụ n'ala ebe o si.

Otu ndị ọrụ ya na-ekpoba ndị nka so Eritrea, Yuganda nakwa Kongo imepụta ejije. Nne na nna ụmụnwaka ndị na-asụ Tigrinya nakwa ndụ be ha ndị Eritrea bụ ndị na-enweta onyonyo ahụ.Tedros mekwa emume Beles Bubu nke mbụ n'ogige ebe ụmụaka ndị na-agba ọsọ ndụ ha nọ na Kampala, Yuganda.

Cheng Yen

Cheng Yen, Taiwan

Onye omemgbeoji okpukperechi Budda

Dharma Master Cheng Yen bụ otu n'ime ndị na-ahụ maka mgbasa ozi okpukperechi Budda nke agtba ọhụrụ ndị Taịwan. Ọ bụ ya hiwere otu na-ahụ maka ọdịmma mmadụ nke bụ Tzu Chi Foundation, ụfọdụ mgbe a na-akpọ ya "Nne Theresa nke Asia".

Ọ bụ n'afọ 1966 ka ya na ndị nna 30 bidoro tikọnyewa ege ọnụ iji nyere ezinụlọ enweghị etu ọha ha aka. Kamgbe ahụ, ha etoola ruo ndị nsonso mmadụ otu nde n'ụwa niile, ha na-enyere mba ndị ọzọ aka ma na-enye kwa ha ọgwụ, ha na-akwado ụlọakwụkwọ na ụlọọgwụ.Ugbua ọ gafeela afọ 80, kama ndị nsonso ya ka na-enyere ndị mmadụ aka, ọkachasị nsonso a dịka ha ji ego na akụrụngwa kwado ndị agha a na-alụ na mba Yukren mekpara ahụ.

Nazanin Zaghari-Ratcliffe

Nazanin Zaghari-Ratcliffe, Briten/Ịran

Onye ọrụ obi ebere

"Ụwa niile jikọọ aka ọnụ ka a hụ na o nweghi onye e ji na mkpọrọ maka ihe ọ na-emeghi" nke a bụ okwu Nazanin Zagharia-Ratclife onye Briten na Ịran oge ndị Iran tọghapụrụ ya n'ọnwa Maachị ka di ya bụ Richard na-eti mkpu na-ebe kamgbe na-akwanye gọọmentị Briten ka ha nye aka tọghapụ ya ma kpezie nsogbu ụgwọ dị n'etiti Briten na Ịran.

A kpọchiri Zaghari-Ratcliffe na nwa ya n'ike n'Ịran n'afọ 2016 oge ọ nọ ezumike, e mechaa jiri ya na-ekpezi ikpe dị n'etiti mba Briten na Ịran ebe gọọmentị Iran jidere ya iji kwanyere mba Briten ọkụ. E jidere ya afọ isii - mgbe mbụ, a mara ya ikpe na ọ nwara ịkwatu gọọmentị Ịran. Oge e kpebiri ikpe mbụ ya n'afọ 2021, a mara ya ikpe nke abụọ ma jide ya n'Ịran ruo mgbe mba abụọ ahụ kpeziri. Zaghari-Ratcliffe kwusiri ike na ya emeghi ihe ọbụla e boro ya ebe ya na di ya na-ede akwụkwọ gbasara ihe mre ya ugbua.

Olena Zelensky

Olena Zelensky, Yukren

Nwunye onyeisiala

Odeakwụkwọ n'onyonyo TV na-anọ n'azụ ihe na-eme, Olena Zelenska dapụtara n'ihu ụwa oge di ya bụ Volodymyr Zelenskyy bụrụ onyeisiala mba Yukren n'afọ 2019. Dịka nwunye onyeisiala, ọ rọụla ọrụ ikwalite ikike dịịrị ụmụnwaanyị ma kwalitekwa omenala ndị Yukren.

Oge ndị Rọshịa wakpochara ha, o jiri ọkwa ya gosipụta ụdị ahụhụ ndụ Yukren na-ata ma bụrụkwa nwunye onyeisiala mbụ na mbaụwa gwara ndị omeiwu mba Amerịka okwu. Ugbua, o forola ntutu taa inyere ụmụaka na ezinaụlọ ndị agha metụtara aka ikwalite ahụike echiche ha.

Ụmụnwaanyị arụọla ọrụ dị ike karịa mgbe udo dị...Nwaanyị ọbụla gabigara agha a agaghịị elegharị anya n'azụ. Amara m na ọ ga-akwalite mmụọ ime onwe anyị.

Olena Zelensky

Omenala na Egwuregwu

Dima Aktaa

Dima Aktaa, Siria

Ọgbaọsọ

N'afọ 2012, a tụrụ ogbunigwe n'ụlọ Dima Aktaa na Syria. Otu ụkwụ ya lara nke mere na o nweghizi ike ime otu ihe kacha amasị ya - ịgbaọsọ. Ihe ruru pasentị 28 ndị Syria nwere nkwarụ nke chọrọ iru ọnụọgụgụ mbaụwa ugbo abụọ dịka otu UN siri kwuo. Ka afọ iri gachara, Aktaa nọ na mba.Briten na-akụziri ndị mmadụ etu ha ga-esi kwado Paralympiks afọ 2024.

Oge o nwetachara ego mana ndị gbaraọsọ ndụ oge ọrịa zuru ụwa ọnụ bụ Covid, e nyopụtara ya dịka otu onye n'ime otu England's altenative football squad, lionhearts. Akụkọ ya gbara n'onyonyo egwu ọgụegwu a ma ama na mbaụwa bụ Anne-Marie n'egwu ya Beautiful, ọ na-agakwa n'ihu ekwupụta okwu maka ike ndị nwere ọrụsi nwere.

Zar Amir-Ebrahimi

Zar Amir-Ebrahimi, Ịran

Omee ejije

N'afọ a, omee ejije Zar Amir-Ebrahimi bụ onye nwere nturuugo bụrụ nwaanyị mbụ si mba Ịran ritere nturuugo onye kacha mee ejije na Cannes maka agwa ọ kpara n'ejije Holy Spider, onyonyo e mere site n'akụkọ onye ogbu mmadụ na-egbu naanị ndị na-arụ ọrọ inwe mmekọ.

Amir-Ebrahimi gbapụrụ n'Ịran ka a ghara ikpagbu maọbụ kpọgbuo ya oge e zirpụrụ onyonyo ebe ọ gba ọtọ na soshal midịa mere e jiri katọọ ya ma kọọ ya ọnụ banyere ndụ ya na ịhụnanya ya oge gara aga. N'afọ 2008, ọ gara Paris malite ụlọọrụ o ji emepụta ejije bụ Alambic Production, ọ na-agakwa n'ihu na-akwalite ọrụ ya ma n'ihu ma n'azụ igwe ose onyonyo.

Selma Blair

Selma Blair, Amerịka

Ome ejije

Onye a mara maka agwa ndị ọ kpara n'ejije dị icheiche o merela dịka Cruel intentions, Legally Blonde na Hellboy franchise, Selma Blair bụ onye mba Amerịka a ma ama na-eme ejije na onyonyo.

A chọpụtara na o nwere ọrịa multiple sclerosis n'afọ 2018, e toola ya maka mgbasaozi ọ na-eme maka ọrịa ahụ ebe ọ na-ekwu okwu banyere njem ahụike ya na ihe niile ọ na-agabiga. N'afọ a, o wepụtara akwụkwọ maka onwe ya ọ kpọrọ Mean Baby ma sonyekwa otu na-eme ihe ntecha na-emepụta ihe ntecha dị mfe ite maka ndị nwere nkwarụ.

Abụ m nwaanyị gabigara ihe siri ike n'oge gara aga, e nwereike ileli m maọbụ napụ m ike m na-egbughi oge mana ọ bụ site na nkwado ụmụnwaanyị ndị ọzọ ka m ji nọrọ ebe a.

Selma Blair

Ona Carbonell

Ona Carbonell, Spen

Onye na-ewgu mmiri

Ona Carbonell bụ onye mba SDpen ji igwu mmiri eme nka ma jirikwa ya na-akwado atụmatụ ịụ onye nne ma bụrụkwa onye welitere isi n'egwuregwu. Ọ gaala egwuregwu Olimpiks ugbo atọ ebe o ritekwarala nturuugo gbara ọkpụrụkpụ ruru 30 nke gụnyere ma ọla ọcha na ọla nchara o ritere n'Olimpiks.

N'afọ 2020, ọ mụrụ nwa mbụ ya ma malitekwa ịnata ọzụzụ iji ruo asompi Olimpiks Tokyo. O kwupụtara obi mgbawa ya megide iwu ndị gbochiri ya inye nwa ya nwoke ara n'egwuregwu ahụ. N'afọ a, ọ mụrụ nwa ọzọ. ọ kọrọ akụkọ ya n'ihe ejije iji gosi ụmụnwaanyị ndị na-eme egwuregwu ka ya na ha ịbụ nne egbochighi ime egwuregwu.

Sarah Chan

Sarah Chan, Saụt Sudan

Onye na-achọrọ ndị NBA mmadụ

Sarah Chan bụbu onye na-eme egwuregwu 'basketball' Ugbua ọ na-akụziri ndị na-eto eto ya bụ egwuregwu n'akụkụ Afrịka niile. Ọ bụkwa ya bụ nwaanyị mbụ nke ndị otu Toronto Raptors nke NBA na-ahọpụta dịka onye ga na-achọtara ha ndị nwere onyinye ịtụ Basketbaal n'Afrịka.

Chan na ndị ezinụlọ ya si Khartoum, Sudan gbaa ọsọ ndụ gbaga Kenya ebe ọ nọrọ malite njem ya n'egwuregwu 'basketball'. O nwetara agụmakwụkwọ n'efu site n'aka ụlọakwụkwọ Union University dị na Jackson, Tennesse, ma mee ya bụ egwuregwu nke ọma n'Afrịka nakwa Yurop. Cha malitere ụlọọrụ a kpọrọ Home At Home/Apediet Foundation, nke ọrụ ha bụ ibu agha megide ụmụnwaanyị ịlụ di n'oge, ịkwalite agụmakwụkwọ nakwa iji egwuregwu akụziri ndị na-eto eto ihe.

Ihe ọbụla i kwenyere banyere onwe gị bụ ihe ị ga-abụ. Ya mere kwenye na ọdịnihu gị ga-ewetara gị ihe ọma niile ị na-arọ nrọ ya.

Sarah Chan

Priyanka Chopra Jonas

Priyanka Chopra Jonas, Ịndịa

Omee ejije

Dịka o meela ejije ruru 60 n'aha ya, Priyanka Chopra Jonas bụ otu onye kachasị na ndị ejije Bollywood. Dịka o mechara ejije mbụ ya n'afọ 2002, ya bụ nwaanyị bụbu Miss World tibara na Hollywood ma bụrụ nwaanyị mbụ si mpaghara Saụt Eshia na-eme ejije bụrụ isi sekpụ ntị n'ejije n'Amerịka (Quantico, 2015).

Ejije ndị o merela na Hollywood gụnyere 'Isn't it Romantic na The Matrix Ressurrections. Ọ malitela ụlọọrụ nke ya o jie emepụta ejije na onyonyo na Indịa. Chopra bụkwa onye nncọchiteanya a kpọrọ Goodwill Ambassador nke otu Unicef, na-alụ ọgụ maka ikike ụmụaka inye ha agụmakwụkwọ.

Njem ndị MeToo Movement nakw aolu ụmụnwaanyị dị icheiche na-abbịakọta ọnụ ichekwa onwe ha ma na-akwụnyere onwe ha - o nwere ihe dị ike ma dị ire ma ndị mmadụ kwụkọta ọnụ.

Priyanka Chopra Jonas

Billie Eilish

Billie Eilish, Amerịka

Ọgụegwu-Ode egwu

Onye a ma ama n'ụwa niile riterela nturugo Grammy ma kụwakwa sleeti site n'egwu ya, Billie Eilish bụ otu onye a ma maka etu o si jiri egwu ya emepụta ihe pụrụiche - site n'egwu ya Your Power, nke e na-akpọpụta ndị na-emegbu ma na-emetọ ụmụaka ụmụnwaanyị, gaa na All The Good Girls Go to hell, egwu o tiri maka ihu igwe.

O debara aha ya n'akwụkwọ n'afọ a site n'ịbụ onye kacha burụ nwatankịrị buru ụzọ pụta n'emume Glstonbury ebe o jiri nka ya gosi iwe ya megide mkpebi Ụlọikpe Ukwu Amerịka nyere gbasra iwu ite ime. O kwuola okwu hoha gbasara ahụ mmadụ, oge ọ dabara n'obi ịdamba nakwa ọrịa o nwere bụ Tourette's syndrome.

Oge anyị nọ n'ime ya ugbua na-atụ m n'anya. Ụmụnwaanyị nọ n'elu. O nwere oge m nọ n'ime olulu enweghi olileanya ọbụla maka na a naghị eche na ụmụnwaanyị ụmụaka dịka m nwere ihe ọbụla ha nwereike imepụta.

Billie Eilish

Ons Jabeur

Ons Jabeur, Tinishia

Onye egwuregwu Tenis

Oge ọ pịachara agba nke ikpeazụ egwuregwu pụrụiche n'asọmpi Wimbledon, ọpịa bọọlụ Tnis Ons Jabeur bụrụ nwaanyị mbụ si Arab maọbụ Afrịka ruru ogo ikpeazụ pịa maka inweta Grand Slam. Ka ọnwa ole na ole gachara, o rukwara agba ikpeazụ US Open.

Nwaanyị dị afọ 28malitere ịpịa teenis oge ọ dị naanị afọ atọ, ma bụrụ ruo ogo onye nke abụọ n'otu Women's Tennis Association - ogo kachasị onye Afrịka maọbụ onye Arab ruru ma nwoke ma nwaanyị. Jabeur nwetala nturugo atọ naanị ya, e kelekwala ya maka ikwalite ndị ọgbara ọhụrụ.

Sneha Jawale

Sneha Jawale, Ịndịa

Onye ọrụ nleta ndí mmadú n'obodo

Oge nne na nna ya enweghi ike ịkwuzu ego ụgwọ isi ya n'ónwa Disemba 2000, di Sneha Jawale jiri mmanụ ọkụ kerozine mụnye ya ọkụ. Ezinaụlọ ya agakwughi ndị uweojii denye akwụkwọ. Oge di ya kpọọrọ nwa ha nwoke gbalaga, ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-edozigharị ndụ ya dịka onye na-agụ kaadị tarot nakwa onye odeakwụkwọ ejije - ọrụ ebe ndị mmadụ agaghị na-ahụ ihu ya anya.

A gwara Jawale bụ onye na-arụ ọrụ ileta ndị mmadụ ugbua ka o soro n'ihe ejije a kpọrọ Nirbhaya bụ aha onye ọtụtụ ndị mmadụ wakporo n'afọ 2012 na Delhi. Imepụta ihe ejije n'ụwa niile nye ndị mmadụ nyere ya aka iwufe ụjọ ya.

N'ime afọ 10 gara aga, agwa ndị mmadụ na-akpaso ndị ọkụ gbara maọbụ ndị acid wụrụ agbanwela. Anaghị m ele onwe ka o nwere onye ka m mma n'ụwa niile, ma ya bụrụgodi miss World maọbụ miss universe. Ana m agwa onwe m na m mara mma, ya bụ na m mara mma.

Sneha Jawale

Reema Juffali

Reema Juffali, Saudi Arebia

Onye egwuregwu ọkwọ ụgbọala

N'afọ 2019, Reema Jufali banyere n'akwụkwọ akụkọ dịka nwaanyị mba Saudi Arabia nke bụ ga-esonye n'egwuregwu ịkwọ ụgbọala. N'afọ a, o hibere otu nke ya bụ Theeba Motorsport, iji sonye n'asọmpi GT Open nakwa iji kwalite etu mba Saudi Arabia si esonye n'egwuregwu ịkwọ ụgbọala. Site n'otu ahụ, nwa ada na-emepe ọtụtụ ụzọ maka agụmakwụkwọ na nkwalite ya bụ egwuregwu.

Juffali bụ onye nlereanya maka ụmụ nwaanyị nọ n'egwuregwu ịkwọ ụgbọala n'ụwa niile. Ọ na-ele anya imekwa ihe ọzọ mmadụ emebeghị mbụ, nke bụ iji ụlọọrụ ya bụ Theeba Motorsport sonye n'asọmpi Le Mans bụ nke a na-adị awa 24.

Ha dị ọtụtụ ihe a na-ekwu na ụmụnwaanyị agaghị emenwu. Ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị nwee nkwadi n'ụlọ nakwa n'obodo, iji mee ka mgbanwe tọrọ adị dị.

Reema Juffali

Kadri Keung

Kadri Keung, Hong Kong

Onye na-adụ akwa

ịkwapụta akwa dị mma n'anya maka ndị kara nka nakwa maka ndị nwere nkwarụ n'ahụ dị icheiche bụ ihe na-anụ Kadri Keung ọkụ n'obi. Ya na nne ya Ophelia Keung malitere ụlọọrụ na-emepụta uwe onye ọbụla nwereike iyi a kpọrọ RHYS n'afọ 2018, oge ọ na-eleta nne ya ochie ka ọ chọpụtara na uwe ndị ochie anaghị ama mma n'anya nke kpaliter ya ịmalite dụwa uwe maka ndị kara nka.

Dịka onye gụrụ akwụkwọ maka ịdụ uwe, Keung na-etinye ihe ọ mụtara nakwa etu onye na-azụ ya, agbanyeghi ma ọ bụ uwe ka ọ na-akwa kaọbụ akpa e ji ejide akpa mamịrị. Ụlọọrụ ya nyere ma zụọ ndị ọrụ ụmụnwaanyị 90 na-enweghi ihe ha ji gụnyere ma ndị nwere ọrụsị. N'afọ 2022, Keung malitere Boundless, ụlọọrụ na-emepụta akwa onye ọbụla nwereike ịdụ n'ahụ.

Mie Kyung (Miky) Lee

Mie Kyung (Miky) Lee, Saụt Korịa

Onye na-eme ejije

Dịka onye na-kwadosi nka, Miky Lee bụ otu onye a ma ama welitere isi n'okwu ikwado nka na Korịa. Ọ bụ otu onye welitere isi na-akwado egwu K-pop nakwa onye so n'isi sekpu ntí na mmemme KCON. O sokwa na ndị isi mere onyonyo Parasite ritere nturuugo Oscar.

Lee bụ osote onyeisi ụlọọrụ welitere isi na imepụta ihe ngosi na ejije nakwa na-etipụta egwu aha ya bụ CJ ENM.

Rebel Wilson

Rebel Wilson meriri n'afọ 2021 họpụtara ya

"Ọ bụ NWAANYỊ NA-EMESI IHE IKE na onye m na-elegara anya. Ọ na-emepụta na-egosipụtakwa omenala ya n'ụwa niile n'ụzọ na-atụ n'anya.

laura McAllister

laura McAllister, Wales

Ọkammụta na onye na-agbabu bọọlụ

Onye bụbụ onyeisi otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Wales, Laura McAllister arụọla ọrụ n'ọkwa dị elu dị icheiche na nchịkwa ndị egwuregwu. Ugbua, ọ bụ osote onyeisi otu ụmụnwaanyị Uefa women's Football Committee, ọ pụtakwara ịdọ ndọrọndọrọ ịbụ onye nnọchitenaya ndị Uefa na Fifa n'ọnwa Epureelu afọ 2021. Ọ bụ onyeisi otu Football Association of Wales Trust.

Ugbua, ọ bụ ọkammụta na mahadum Cardiff university, McAllister bụ ọkachamara na ndọrọndọrọ ndị Wales. N'afọ a, A họpụtara ya na Wales dịka onye nncọchiteanya ndị LGBTQ+ ga-aga asọmpi iko Mbaụwa na Qatar. A gwara ya wepụ 'mgbidi egwurugwu' o ji egosi nkwado ya nye ndị LGBTQ+ dịka ọ na-abanya n'ama egwuregwu.

Milli

Milli, Taịlandị

Ọgụ mbem

Ọgụegwu na odeegwu Danupha Khanatheerakul nke e ji aha egwu ya Milli mara na-eji egwu mbem na-ebute nghọtaghị etinye ọnụ n'okwu siri ike dịka etu mmadụ si ekwenye n'aramara nakwa etu ndị ụwa si ekwu maka ịma mma. Ọ na-ama mbem n'ọtụtụ asụsụ na ọlụ ndị ma na-etinyekwa asụsụ ogbe ndị otu na-edina onwe ha na Taịlandị. O kwupụtara na nso nso a na ya ga-ewepụta efere egwu ya ọ kpọrọ BABB BUM BUM.

Ọ malitere iwu ewu n'emume Coachella n'afọ a oge ọ malitere ịkatọ ọtụtụ ihe gọọmentị ndị Taịlandị na-eme nakwa nri osikapa mango dị n'ime ya o butere n'elu nkwago ọ na-eti egwu na-eri, nri ahụ bụ nri omenala ndị Taị. N'afọ gara aga, e boro ya ebubo ikwugide gọọmentụ Taị maka na ọ katọrọ ha maka etu ha siri hazie ọrịa Covid-19. Nke a mere akara #SaveMilli jiri wuo ewu n'ịntanetị.

Rita Monero

Rita Monero, Pueto Riko/Amerịka

Ome ejije

Naanị mmadụ ole na ole na-eme ejije na-etozu ogo inwe EGOT - aha ae ji ama ndị nwetarala nturuugo Emmy, Grammy, Oscar nad TOny - mananRita Monero so n'ime ha. Nwaanyị onye Pueto Riko a na-eme ejije, na-agụ ma na-agbakwa egwu, ọ pụtara na Broadway mbụ oge ọ dị afọ 13 ma nwee ezigbo ọrụ gara afọ 70.

Ọ pụtara n'ejije Singin in the Rain na The King and I, mana ọ bụ agwa ya dịka Anita n'ejije West Side Story mere ya onye Latin mbụ ritere nturuugo Oscar. Steven Spielberg jiri maka Monero nọ n'afọ 90 ya ugbua dee agwa pụrụiche n'ejije ya o megharịrị.

Salima Rhadia Mukansanga

Salima Rhadia Mukansanga, Rwanda

Ogbu pịpịrọ

N'oge banyere n'akwụkwọ ụwa n'egwuregwu bọọlụ, Fifa họpụtara Salima Rhadia Mukansanga dịka otu n'ime ụmụnwanyị atọ ga-egbu pịpịrọ n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ụmụnwoke n'afọ 2022 - nke bụ oge mbụ ụmụnwaanyị na-egbu pịpịrọ n'asọmpi Iko Mbaụwa kamgbe afọ 92 ọ malitere.

N'ọnwa Jenuwarị gara aga, ọ bụkwara nwaanyị mbụ gburu pịpịrọ n'asọmpi Africa Cup of Nations nke ụmụnwoke. o gbukwara n'asọmpi Olimpiks Tokyo. Ọ gbuola n'egwuregwu ndị kachasị n'ụwa n'egwuregwu bọọlụ. Tupu ọ banye egwuregwu, ọ nwere ọzụzụ ndị na-aghọ nwa n'ụlọọgwụ.

Alla Pugacheva

Alla Pugacheva, Rọshịa

Otiegwu

Odeegwu na ọgbaegwu Alla Pugacheva erela egwu ruru nde 250. Site n'ihe ruru egwu 500 na efere egwu 100 o nwere, ya bụ otiegwu 'tsarina of Russian pop' bụ otu onye a ma ama e ji eme ọnụ maka ọlu ọkwa ya agbanyeghi na ọ laala ezumike.

Rọshịa enyela ya nturuugo ọtụtụ oge maka egwu ya, agbanyeghi nke a, Pugacheva ekwupụtal okwu megide gọọmeti Rọshịa ọtụtụ oge. O zipuru mmadụ nde 3.6 na-eso ya n'instagram ozi na nso nso a gwa ha na ya akwadoghi agha na-eme na Yukren, ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu ahụ ebe ụfọdụ toro ya, ndị ọzọ katọrọ ya.

Ụwa ahụla mgbanwe na ọganihu dị egwu n'okwu ọgụ a na-alụ maka mmegbu ụmụnwaanyị nakwa ka e nye ụmụnwaanyị ohere agụmakwụkwọ na ka ha nweta ego nke ha. kama na mmegbu ụmụnwaanyị n'ezinaụlọ ka bụkwa nnukwu nsogbu n'otutu mba dị icheiche.

Alla Pugacheva

Elnaz Rekabi

Elnaz Rekabi, Ịran

Onye na-arị elu

N'asọmpi champiọnship e mere na Saụt Koria n'ọnwa Oktoba, ọrịelu onye Ịran bụ Elnaz Rekabi soro mpi ya na-ekeghi ịchafụ e ji mara ndị be ha iji gosi iwe ya megide iwu e tiri na nwaanyị niile ga na-eyirịrị hijab na mba ya. Ọ gbara onye nke anọ n'asọmpi ahụ mana ude ya malitere ide n'etiti ndị na-egosi iwe ha n'Ịran. Ọtụtụ ndị mmadụ zutere ma kelee ya n'ọdọụgboely Tehran oge lọghachitere n'ụlọ ya, e tokwara ya na soshal midịa.

Ozi o tinyere n'akara ya n'Ịnstagram kwuru na ịchafụ hijab ya dapụrụ na-amaghị ama, ọ rịọrọ mgbaghara nye ndị mba ha na mkparịtụka o mere n'onyonyo TV ndị Iran. Mana o nwere onye gwara BBC Peshia na mkparịtụka ahụ ahụ bụ na mmanye ka e mere ya ikwupụta ihe ndị ahụ.

Yulimar Rojas

Yulimar Rojas, Venezuela

Onye Egwuregwu

O ritere ntụrụugo olaedo na ọlaọcha n'egwuregwu Olympiks ma bụrụkwa ọkaibe n'ụwa niile ugboro atọ.Otu mgbe, Yulimar Rojas bụ onye kcaha n'egwuregwu Long Jump dịka ọ wụrụ ogogo 15.74m n'asọmpị World Athletics Indoor Championship n'ọnwa Maachị. Díka o si dí, o legidela anya ị wụ ogoogo 16m

A mụrụ ya na Kakas, Venezuela ma tolite na mpaghara ndị ogbenye na mba mmiri ahụ, o kwuru na ndụ ogbenye ya nyere ya ịbụ mmadụ. Ugbua, o so na ndị egwregwu Barcelona FC, Rojas eruola ọkwa dike na mba ya. Ọ na-ekwu hoha na ya bụ nwaanyị na-edina nwaanyị ibe ya ma na-ekwuchitekwara ndị LGBTQ+.

Dịka ụmụ nwaanyị anyị agaghị ekwe ka akpagbuo anyị. enweghị ihe anyị enweghị ike ime.Ọ bụ ezikwu na a na-eletu anyị anya kama anyị egosila na ike dị anyị

Yulimar Rojas

Sally Scales

Sally Scales, Ọstrelịa

Onye nka

N'afọ 2022, Gọọmentị mba Ostrelịa họpụtara Sally Scales bụ ọnye ndụmọdụ gbasara nka dịka otu n'ime otu ndị ga-etinye uche maka nkwekọrịta a kpọrọ 'Voice of Parliament' - ya bụ ntuziaka gazie nke ọma, ọ ga-ahụ na ndị amaala mba Ostralia ga na enwezị ohere oche n'ụlọomeiwu mba ahụ.

Onye ama ama n'ihe gbasara omenala, Scales bụ nwaanyị obodo Pitjantjatjara nke sị na mpaghara Pipalyatjara dị na ndịda anyanwụ Anagu Pitjantjatjara Yankunytjatjara (APY) n'ime obodo ndịda Ostrelịa. Ọ bụ ya bụ nwaanyị abụọ bụ onyeisioche otu APY ma bụrụkwa ọnụ na-ekwuchitere otu na-achịkọ nka nke APY, nke a bụ otu ụmụ amaala ji elekọta ma na-akwado omenala ha.

Julia Gillard

A họpụtara ya maka ntụrụugo ụmụ nwaanyị 100 nke Nobel Laureate, onye bụbu onye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Julia Gillard

"Sally bụ onye ọkaibe na nka ma bụrụkwa onye ghọtara emume mmadụ.Site n'ikuziri na ịgba ndị mmadụ ume, ọ na-ebute mgbanwe nke na-emegide ịkpa oke agbụrụ na ịkpa oke nwoke maọbụ nwaanyị."<1>

Nana Darkoa Sekyiamah

Nana Darkoa Sekyiamah, Ghana

Onye Ode Akwụkwọ

Akwụkwọ ọ dere maka ọnọdụ mmekọ n'etiti ụmu nwanyị Afrịka bụ nke a kọwara dịka "Edemede pụrụiche maka nwereọnwe maka mmekọ". Dịka etu ndị Publishers Weekly siri kọwaa ya. Akwụkwọ mgbasaozi Econimist gụpụtara ya dịka otu n'ime akụkọ kacha pụo iche n'afọ a, nke gosiri uche ndị mmadụ bi na mba na ndị bi ofesi.

Odee akwụkwọ na onye na-azọchitere ụmụ nwaanyị bụkwa onye so hiwe Adventures from the Bedroom of African Women - nke abụ websaịt, podcast na ihe mmemme eji ewepụta ihe na-egosi ihe ụmụ nwaanyị Afrịka na-agabiga maka mmekọ ahụ, onye ha chọrọ mmekọ ahụ ya na obi aṅụrị.

Ndị na-azọchitere ụmụ nwaanyị emeela ka ụmụ nwaanyị nwee ohere ịbụ onwe ha. Kama anyị na-enweta aka mgba, nke na-egosi ọrụ aka anyị - Aka mgba na-emetụta ikike mmadụ ịhọrọ onye ọchọrọ mmekọ ahụ ya.

Nana Darkoa Sekyiamah

Geetanjali Shree

Geetanjali Shree, Ịndịa

Odeakwụkwọ

Odeakwụkwọ Geetanjali Shree dee aha ya n'akwụkwọ oge ọ bụrụ odeakwụkwọ asụsụ Hindi mbụ ritere nturuugo International Booker Prize for Tomb of the Sand, ntụgharị Bekee akwụkwọ ya Ret Samadhi. A họpụtakwara ntugharị Frenchi akwụkwọ ahụ maka nturuugo Emile Guimet Prize.

Shree na-ede akwụkwọ akụkọ na-emeghi eme n'asụsụ Hindi na Bekee. A na-ahụta akwụkwọ dịka ọrụ pụrụiche n'asụsụ nakwa na nhazi nke mere na a tụgharịala ya gaa ọtụtụ asụsụ n'Ịndịa nakwa asụsụ ndị mba ndị ọzọ. Ọ na-edepụtakwa akwụkwọ maka ejije ya na otu na-eme ejije a kpọrọ Vivadi na-emepụta, ya chọpụtara otu ahụ.

Ohee ụmụnwaanyị na-enweta na abụkarị ihe a na-enyo enyo mana ụbọchị taa, ihe dị iche adịla, enwela agamnihu nye ụmụnaanyị na agba dị icheiche agbanyeghi otu ọbụla o si dị ntakịrị n'ebe dị icheiche.

Geetanjali Shree

Alexandra Skochilenko

Alexandra Skochilenko, Russia

Onye Nka

Anwuchiri onye nka St Petersburg bụ Alexandra Skochilenko maka iji edemede maka agha Yukren dochie ego ole a na-ere ihe n'ahịa. Nke gụnyere ihe nwereike igosi mmadu ole nwụrụla na obodo Mariupol dịka ghaụgbọelu mba Rọshịa wakporo ha. Dịka onye ọzọ bịara ịọzụta ihe gbara ama ejiri nwuchie ya, ma kpụpụya ụlọikpe maka ịda iwu megidere mmadụ ịgbasa akụkọ ụgha maka ndị agha mba Rọshịa.

Dịka ọ nọ ebe a na-echekwa ndị a na-ekpe ikpe ugbua, ọ na-ahụ onwe ya dịka onye e nwereike ịtụ nga afọ 10

Skochilenko adeela ọtụtụ akwụkwọ nke metụtara ọdịmma ụbụrụị mmadụ, nke gụnyere edemede maka mụọ ịdamba na ihe bụ Mania? Enyi ya nwaanyị na-ekwusi okwu ike maka ọnọdụ ahụike ya.

Velia Vidal

Velia Vidal, Colombia

Onye na-ede akwụkwọ

Onye ọrụ akụkọ na onye na-akwado omenala si akụkụ Chocó nke mba Colombia. Velia Vidal bụ ịgụpụta akụkọ na-amasị. Ọ hibere ụlọọrụ Motete, nke bụ ụlọọrụ na-akwado agụmakwụkwọ nakwa Omenala ndị Chocó pụrụiche. Ọ na-emekwa emume ebe a na-agụ ma na-ede akwụkwọ dịka ọ na-eji atụmatụ a ebuso ịkpa oke agbụrụ nakwa mmegbu ndị na-ekweghị ka ọ hara ha na Colombia agha.

Akwụkwọ ikpeazụ ọ dechapụrụ a kpọrọ Aguas de Estuario nwetere ihe nrite ego a na-enye ndị isi ojii si Colombia bụ nke si n'aka Ministri omenala mba Colombia. Ọ bụ onye ọrụ nnyocha n'atụmatụ Afluentes project bụ nke aka ụlọọrụ ngosi nka nke British Museum nọ na ya.

Anyị amarala ugbua etu e si emegbu ụmụnwaanyị kemgbe ochie dịka anya na-achọzị ịgwọ nke a, mana anyị anaghị etinye anya etu ịkpaoke agbụrụ sị akpagbu ndị isi ojii.

Velia Vidal

Esraa Warda

Esraa Warda, Ọljerịa/Amerịka

Ọgba egwu

Nwa ndị si mba Ọljerịa bi n'ofesi, Esraa Warda bụ onye agha omenala burula egwu omenala ndị Ọljerịa si n'imeụlọ ha gaa ụlọakwụkwọ. Ọ na-alụ agha ka e chekwa egwu ụmụnwaanyị ndị mpaghara Nọt -Amerịka na-edu ọkachasị nke a kpọrọ rai, egwu e ji eme ngagharịiwe ebe ahụ.

Ọ bụ nwata akwụkwọ Cheikha Rabia, otu n'ime ndị mara agba egwu rai nke ọma n'ofesi. Warda bụ ọgbaegwu na-ebu egwu ya agagharị mba dị icheiche, o burula egwu ya na nkuzi ya gaa mba dị icheiche gụnyere Washington na London.

Ịlụ ọgụ maka Ikike na Onye nkwuchiteọnụ

Hadizatou Mani

Hadizatou Mani , Niger

Onye na-azọ ikike ndị odibo

Hadizatou Mani bụ onye erere mgbe ọ dị naanị afọ 12 dịka 'nwunye nke isii' n''okpuru atụmatụ akpọrọ 'wahaya' bụ mgbe nwoke ọgaranya lụrụ obere nwata dịka nwunye ga-enyere nwunye ya ndị ọzọ aka n'efu. Mgbe a tọghapụrụ ya n'afọ 2005, Mani lụgharịrị Di mana onye nwebuya ochie boro ya ebubo ịlụ di abụọ ma gbaa ya akwụkwọ. Ikpe mara ya dịka ọ gara nga ọnwa isii.

Mani gbaghara mkepbi ahụ n'ụlọikpe kachasị nke Niger nke mere ka ha kagbuo mkpebi ochie ma machie atụmatụ 'wahaya'. Ugbua ọ na-ekwuchitere ndị a ji eme odibo ma na-enyere ụmụ nwaanyị ndọ ọzọ aka ịgbalahụ ndụ odibo.

Lina Abu Akleh

Lina Abu Akleh, Mpaghara Palestine

Onye na-azọ ikike ruru mmadụ

Lina Abu Akleh bụ onye na-azọ ikike ruru onye si mba Palestina na Armenia ebe nwanne nna ya bụ Shireen Abu Akleh onye ntaakụkọ si Palestine na Amerịka. E gburu ya n'ọnwa Mee dịka ọ na-arụrụ Al Jazeera ọrụ mgbe ndị agha Izrel nọchiri West Bank. Ndị agha Izrel ekwuola na e nwereike ọ bụrụ otu n'ime ndị agha ha gbagburu Shireen "n'amaghị ama".

E jirila ihu Lina na-akpọ oku ikpe nkwụmọtọ gbasara ogbugbu nwanne nna ya.O nwetara nzere Master's n'International Studies ebe ọ gbadoro anya n'ikike ruru mmadụ. A kpọpụtara aha ya dịka otu onye n'ime TIME100 bụ ndị ọchịchị ọhụrụ na-eseputa isi.

Anyị kwesiri iga n'ihu ebe nwanne nna m kwụsịrị ma na-egosiputa ahụmihe ụmụnwaanyị iji hụ na akụkọ ndị anyị na-akọ zuruoke, bụ eziokwu ma dị nhatanha - nke mere na ewezuga ụmụnwaanyị ọ gaghị eme.

Lina Abu Akleh

Velmariri Bambari

Velmariri Bambari, Indoneshia

Onye na-alụ maka ikike dịịrị onye

Ọ na-arụ ọrụ n'ime ime obodo n'Indoneshia, Velmariri Bambari na-alụrụ ndị wakporo ọgụ na Setral Sulawesi. Ọ kwanyela ọtụtụ ndị na-achị ime obodo ka ha tụghapụ iwu iwo na omenala ndị na-ada ụmụnwaanyị e metọrọ maọbụ a wakporo nha.

N'iwu ime obodo, nha "ịsachapụ obodo" na-ekwu na ndị metọrọ mmadụ maọbụ wakpoo mmadụ e chere na ha emetọọla ala kwsiri ịkwụ nha. Mana iwu a na-emetụtakwa ma ndị e metọrọ na ndị a wakporo. Mana maka mgbasaozi ya, Bambari na-abụ onye mbụ ndị uweojii na-akpọ ma o nwere onye kwupụtara na a wakporo ya. O tinyela ọnụ n'ọtụtụ okwu mwakpo n'afọ a.

Agbanyeghi na m nwere nkwarụ, achọrọ m inyefe ike niile m nwere ikwado ụmụnwaanyị nọ na gburugburu m site na imepe ohere ga-enye aka ka ha nweta ego nke ha.

Velmariri Bambari

Tarana Burke

Tarana Burke, Amerịka

Onye na-ekwuwa okwu maka ikike ndị mmadụ

Akara #MeeToo malitere iwu ewu n'ịntanetị afọ ise gara aga oge nde kwuru nde ndị mmadụ n'ụwa niile gbaa gburugburu malitere ikesa ihe niile ha gabigara na mmetọ e metọrọ ha. Mana onye malitere ya bụ akara bụ otu onye isi ya pụtara na mmetọ nakwa nwakpo bụ Tarana Burke n'afọ 2006. O malitere okwu ahụ iji kpọọ okwu maaka mmetọ na mmegbu a na-emegbu ụmụnwaanyị.

Oge ozi onye na-ejije Alyssa Milano dere na twitter bulitere okwu #MeToo, ọ malitere nrụrịtaụka n'ụwa niile gbasara etu e si akpasa ụmụnwaanyị agwa ma nye ndị gabigara mwakpo na mmetọ olu dị egwu ikwupụta ihe ha gabigara. Burke ka na-aga n'ihu na-ekwupụta ma na-alụkwara ndị ọbụla isi ha pụtara na mmetọ ọgụ ebe ọ na-alụsokwa omenala dị icheiche na-akwadọ mmetọ.

Sanjida Islam Choya

Sanjida Islam Choya, Bangladesh

Nwa Akwụkwọ

Agbanyeghị na mba Bangladesh bụ ebe akacha enye ụmụaka nwaanyị na di,Sanjida Islam Choya na-agba mbọ ịgbanwe nke a.E nyere nne ya na di dịka nwata, kama Choya kpebiri imegide ịlụpụ ụmụaka nwaanyị na di dịka ọ lechara ihe ejije n'ụlọ akwụkwọ ya ka o kpebiri n'obi ya

Ya na ndị enyi ya, ndị nkuzi ya na ndị enyemaka na-akpọ onwe ha Ghasforing(Ụkpana) nke ọrụ ha bụ ịkpesara ndị uweojii mgbe ọbụla a na-enye nwatakịrị nwaanyị na di. Ugbua Choya nọ na Mahadum, ọ ka na-arụ kwa ọrụ ya na Ghashforing ma na-azụ kwa ndị ọzọ n'otu ahụ. Dịka o siri dị, ha enyerela aka gbochie inye ụmụaka nwaanyị 50 na di.

Heidi Crowter

Heidi Crowter, Briten

Onye na-ekwuwa okwu maka ndị nwere ọrụsị

Heidi Crowter ebuola agha iji gbanwee echiche ndị mmadụ maka ndị na-arịa ọrịa Down Syndrome. Ọ kpụpụrụ gọọmentị Briten ụlọikpe maka iwu ha mere nyere ikike ite ime ndị nwere ọrịa ahụ, o kwuru na iwu ahụ na-akpa oke. Ikpe ahụ adabraghịrị ya ebe ụlọikpe kpebiri na iwu ahụ bụ inye ma onye nne ma nwa e bu n'afọ ikike dịịr ha. N'ọnwa Nọvemba, ikpe mkpegharị o wegara adabaghịkwara ya mana o kwuru na ya na ndị ọrụ ya ga-aga n'ihu 'n'ịlụ ọgụ' ma buru ikpe ahụ gaa ụlọikpe ukwu.

Ọ bụ onye nnọchitenaya otu Positive Abount Down ma bụrụkwa onyeisi mbụ n'otu National Down Syndrome Policy Group. Akwụkwọ ya, I'm Heide pụtara n'ọnwa Ọgọstụ.

Achọrọ m ka ụmụnwaanyị dị ime nwee mgbasaozi tọrọ atọ maka ọrịa Down Syndrome. Achọrọ m ka ndị mmadụ na-ahụ anyị dịka mmadụ anyị bụ ma mara nke ekwe na-akụ.

Heidi Crowter

Sandya Eknaligoda

Sandya Eknaligoda, Sri Lanka

Onye na-alụ ọgụ ikike dịịrị onye

Dịka onye na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye, Sandya Eknaligoda na-enyere puku kwuru puku ndị nne na ndị nwunye mmadụ nwụlarị n'oge agha Sri Lanka aka. Di ya bụ Prageeth Eknaligoda bụ onye ntaakụkọ na-enyocha ihe nakwa onye na-ese eserese furu efu n'ọnwa Jenuwarị afọ 2010. Ọ bụ otu onye katọrọ gọọmentị nyocha mmegbu na mmetọ e megburu ndị Tamil Tiger na-achọ nnwereonwe.

Kamgbe di ya furu, ya bụ nne ụmụ abụọ na-achọ ikpe nkwumọtọ. Ọ na-ebo ndị na-akwado Mahinda Rajapaksa chịburu dịka onyeisiala Sri Lanka ebubo maka ntọrị di ya. E nwela ndị a tụrụ aka mere ya mana a hapụrụ ha niile.

Abụ m nwaanyị na-alụchitere ndị ọzọ ọgụ n'ohere ọbụla m nwetara. Ana m esonye n'ọgụ ndị nwere isi ma na-enweta mmeri site na itinye uchu nakwa itinye onwe m niile agbanyeghi mkparị na okwu ọjọọ na-eso ya.

Sandya Eknaligoda

Gohar Eshghi

Gohar Eshghi, Ịran

Onye na-alụ ọgụ maka mmezi obodo

Gohar Eshghi abụrụla akara njirimara maka ndidi na nnagide n'Iran. Nwa ya nwoke bụ Sattar Beheshti, bụ onye 'blogger' nwụrụ n'ụlọ mkpọrọ afọ iri gara aga, mana Eshghi na-alụ ọgụ ikpe nkwụmọtọ kamgbe ahụ, na-ebo gọọmentị Iran ebubo mmekpa ahụ nakwa igbu mmadụ.

O so n'otu n'ime ụmụnwaanyị a kpọrọ 'Iranian Complainant Mothers', nke bụ otu na-achọ ikpe nkwụmọtọ maka ụmụ ha e gburu egbu.Ọ na-ekwu na ọnwụ nwa ya dị n'isi Onye ndu Iran bụ Ayatollah Ali Khamenei. O so na ndị binyere aka n'akwụkwọ n'afọ 2019 iji kpọọ oku ka Khamanei rituo n'ọkwa. Na ngagharịiwe nke afọ a, nke bụ maka ogbugbu Mahsa Amini, Esghi wepụrụ ịchafụ isi ya iji gosi nkwado ya maka ndị na-eme ngagharịiwe.

Ceci Flores

Ceci Flores, Meziko

Onye na-akwalite ikike dịịrị onye

Ndị ji egbe kpọọrọ nwa Cecil Fl;ores bụ Alejandro dị afọ 21 n'afọ 2015. Ka afọ anọ gachara, ndị omekome tọọrọ nwa ya nwoke ọzọ nke dị afọ 31.Flores kwuru na ọ bụ ụjọ na ọ nweereike nwụọ ma ya amaghị ihe mere ụmụ bụ ndị sọ na ọtụtụ ndị mmadụ emere ka ha fuo n'ike na mba Meziko na-agba ya ume.

Afọ a ka njọ dịka akpọpụtara mmadụ 100,00 dịka ndị a na-achọ achọ. UN kwuru na ya bụ ije " jọrọ njọ ebe ọ dị ukwu". Site n'ọchịchị Flores, otu Madrees Buscadoras de Sonora (Ndị nne Sonora na-achọ ụmụ ha) enyerela aka chọpụta ebe eliri mmadụ 1,000 bụ ndị agụnyere dịka ndị a na-achọ achọ.

Geraldina Guerra Garces

Geraldina Guerra Garces, Ekwadọ

Nwaanyị na-alụ ọgụ gbasara ikike mmadụ

Dịka onye na-echekwa ikike ụmụnwaanyị ihe ruru afọ 17, Geraldina Guerra Garces na-agbasi mbọ ike ichekwa ụmụnwaanyị ndị a na-emegbu maọbụ emetọ na mba Ekwadọ. Ọ gbadosiri ụkwụ ike na ikpokota mgbasaozi na-egosipụta ogbugbu ụmụnwaanyị maka na ha bụ nwaanyị.

Ya bụ onye wepụtara atụmatụ Cartographies of Memory, nke na-achọ imepụta "mapụ dị ndụ" nke na-egosi ụmụnwaanyị ndị e gburu maka na ha bụ nwaanyị iji mee ka a ghara ichefu ha echefu nakwa inye aka kpalite mmụọ nchegharị n'omenala. Guerra na-achọpụta ma na-edetu aha ụmụnwaanyị ndịa na Feminist Alliance nakwa na Latin American Network Against Gender Violence. Ọ na-anọchitekwa ndị Aldea Foundation nakwa otu na-echekwa ogige ụmụnwaanyị na mba ya.

Ọ bụrụ na e nweghi ezigbo atụmatụ kwusiri ike iji megide ogbugbu ụmụnwaanyị maka na ha bụ nwaanyị, a gaghị enwe agmnihu nye onye ọbụla. Agbanyeghi atụmatụ ọhụrụ gọọmentị wepụtara, a ka na-egbu anyị, nke ahụ kwesiri ịgbanwe.

Geraldina Guerra Garces

Moud Goba

Moud Goba, Briten

Onye na-achọ ikike bdị LGBTQ+

Dịka onye gbara ọsọ ndụ n'onwe ya, Moud Goba na ndị ọrụ dị icheiche nọ n'okpuru ọchịchị arụọla ọrụ ihe ruu afọ 20 ikwalite ndu inyere ndị gbara ọsọ ndụ aka. Ugbua, ọ bụ onyeisi Micro Rainbow nke na-akwalite inye ndị LGBTQ+ gbara ọsọ ndụ ma na-achọ ebe ha ga-ebi nakwa ibiri n'aka Briten ebe obibi dị mma. Ọ nọ n'isi atụmatụ inye ụlọ ha nke nyerela ihe ruru mmadụ 25,000 ebe ha ga-edebe isi n'abalị kwa afọ ma na-enyakwa aka inye ọrụ.

Na nso nso a, Goba esorola na idobanye ndị LGBTQ+ ndị si mba Afganistan bata mba Briten. Ọ bụ otu onye n;ime ndị malitere atụmatụ UK Black Pride ma bụrụkwa onyeisioche ndị isi otu ahụ ugbua.

Gehad Hamdy

Gehad Hamdy, Ịjipt

Dọkịnta eze na onye na-enyere ndị madụ aka

Gehad Hamdy bụ dọkịta na-ahụ maka eze bịakwa bụrụ onye hibere otu a kpọrọ 'Speak Up', bụ otu ikike ụmụnwaanyị, ndị ọrụ ha bụ iji soshal midia na-agba ndị na-emekpa ụmụnwaanyị ahụ nakwa ndị na-emetọ ụmụnwaanyị n'anwụ. Enweela nnọọ ọtụtụ agwa mmekpa ahụ megide ụmụnwaanyị n'Ijipt na 2022, nke mere ka ọrụ Hamdy pụtawanye ihe.

Otu ya na-enyere ụmụnwaanyị aka ka ha kwulite okwu gbasara mmekpa ahụ, na-enyere ha aka inweta ikpe nkwụmọtọ, biakwa na-akwanye gọọmentị ọkụ n'ike ka ha mee ihe iji kwụsị ụdị ihe ndị a. Enyela Hamdy ọtụtụ nkwanye ugwu maka ọrụ ya nke gụnyere ihe nrite onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye ọbụla bụ nke otu 'World Justice Forum' nyere ya na 2022.

Ụzọ anyị na-aga ka tere aka; anyị erubeghidị nso na ngwụcha. Nke bụ eziokwu bụ na anyị ebidobeghi ebido.

Gehad Hamdy

Judith Heumann

Judith Heumann, Amerịka

Onye na-ekwuchitere ndị nwere nkwarụ

Judith Heumann enyefela ndụ ya ịlụ ọgụ maka ikike dịịrị ndị nwere nkwarụ. Dịka o nwetara ọrịa ntụnwụọkpa polio oge ọ bụ nwata, ọ bụụ onye mbụ na-anọ n'oche ndị ngwụrọ na-akụzi nkuzi na New York.

Ọ bụ onye a ma ama na mbaụwa dịka onye ndu ndị nwere nkwarụ na onye na-ekwuchitere ha - nke gụnyere aka ọ na-enye n'iwu ụlọ ndị Amerịka a kpọrọ UIS federa Building sit-in - ọ gbala mbọ tinye ọnụ na mwepụta iwu dị icheiche. Heumann rụrụ ọrụ n'oge ọchịchị Clinton nakwa Obama ma nwekwaa afọ 20 ọ rụrụ ọrụ na-akpataghị ego.

Onye họpụtara ya bụ onye meriri 100 Women afọ 2020 bụ Shani Dhanda nwere nkwarụ.

Judith akpalitela mmụọ m nke ukwu maka na kamgbe ihe ruru afọ 30, ọ rụọla ọrụ ịkwalite ikike dịịrị ndị nwere nkwarụ n'ụwa niile. Ọ bụ otu onye ike anaghị agwụ agwụ ikwuchitere ndị ọọ, ọ bụ onye ọrụ ya wulitere okwu ndị nwere nkwarụ ebe niile.

Jebina Yasmin Islam

Jebina Yasmin Islam, Briten

Onye na-achụ ọdịmma ndị mmadụ

Nwanne nwaanyị onye nkuzi praịmarị Sabina Nessa, onye e gburu n'ama egwuregwu dị na London n'ọnwa Sepụtemba afọ 2021, Jebina Yasmin Islam malitere ikwupụta okwu maka nchekwa ụmụnwaanyị n'ogbe. O kwuola okwu ma tie mkpu ka a gbanwee iwu ka ndị a na-ebo ebubo nwe ike gaa ụlọikpe zara ọnụ ha.

Oge e gbuchara nwanne ya nwaanyị, Islam katọrọ gọọmentị mba Briten maka na ha akwadoghi ya nke gosiri na a naghị eleba anya n'arụ ụmụnwoke na-akpa. O kwukwara maka ịmpaoke agbụrụ- a gara ileta ha nkeọma maọbụrụ na ezinaụlọ bụ "ezinaụlọ dịka nke ndị Briten mara", o kwuru. Islam kọwara nwaane ya dịka onye 'ọ na-elegara anya' bụrụkwa onye 'siri ike, na-anaghị atụ egwu ma brụrụkwa onye ọnwa ya na-ekewa'.

"Hụ onwe gị n'anya karịa onye ọbụla n'ihu anyanwụ"

Sabina Nessa

Ozi si n'akwụkwọ Sabina Nessa nwanne ya nwaanyị Jebina kepụtara

Layli

Layli, Ịran

Onye na-eme ngagharịiwe

Otu onyonyo kacha gbapụta ihe na ngagharịiwe a na-eme ugbua bụ otu nwaanyị esi n'azụ see foto ebe ọ na-achịkọta ntutu isi ya n'ụdị a kpọrọ 'ponytail', dịka ọ na-achọ isonye ndị na-eme ngagharịiwe. Foto a bụụrụ akara iji gosi atụghị egwu nke ndị a na-eme ngagharịiwe, mana e che na nwaanyị ahụ bụ Hadis Najafi, dị afọ 22, bụ onye e gburu na ngagharịiwe ahụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Persian, Layli (nke a abụghị ezigbo aha ya) kwuru na ya "ga-alụrụ dị mmadụ ọgụ dịka Hadis Najafi na Mahsa Amini". Ọ sị na ndị ọchịchị Iran "enweghị ike iji ọnwụ yie anyị egwu. Anyị nwere olileanya na Iran ga-enwere onwe ya."

Oleksandra Matviichuk

Oleksandra Matviichuk, Yukren

Ọkaiwu ikike dịịrị onye

N'ihe ruru afọ 15, Oleksandra Matviichuk abụrụla onyeisi otu Center for Civil Liberties (CCL) nke e nyere nturuugo maka onyonyo ha mere maka arụ Rọshịa na-akpa n'agha ha na-alụsa mba Yukren.

Otu CCl na-ebu akụkọ ndị Yukren na-anaghị akwado ihe gọọmentị na-eme kamgbe afọ 1960 na-agbado ụkwụ na ikike dịị onye. N'afọ 2014, otu ahụ bụ otu mbụ na-akwado ikike dịịrị onye gara na Crimea, Luhansk na Donetsk ihụ ma gosikwa ihe agha na-eme ebe ahụ. Ha na-akpọzi oku ka mbaụwa lebaa anya ma nyocha mba Rọshịa maka mmegbu na mmekpa ahụ ha na-eme megidere ikike dịịrị onye ha mere na Chechnya, Moldova, Gerogia, Syria, Mali na Yukren.

Ika obi adịrịghi naanị ụmụnwoke maọbụ naanị ụmụnwaanyị.

Oleksandra Matviichuk

Narges Mohammadi

Narges Mohammadi, Ịran

Onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye

Narges Mohammadi bụ onye ntaakụkọ ma bụrụkwa onye a họpụtara maka ntuurugo Nobel Peace Prize. Ọ bụ osote onyeisi ụlọọrụ a kpọrọ 'Defenders of Human Rights na mba Iran. Ọ gbasikwaala mbọ ike ka a kachapụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ na mba ahụ. Na ngagharịiwe mere na mba Iran n'ọdị nso a, o si n'ụlọ mkpọrọ Evin degara otu UN akwụkwọ ka ha kwụsị gọọmentị Iran ịma ụfọdụ ndị sonyere na ngagharịiwe ahụ ikpe ọnwụ.

N'afọ 2010, a tụrụ Mohammadi mkpọrọ afọ 11 - mechaa bulie ya ruo afọ 16 dịka o kwuchara okwu oge a tọhapụrụ ya nwa mgbe nta, iji katọọ etu e si akpaso ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ Evin agwa. Ihe onyonyo o wepụtara nke a kpọrọ 'White Torture' gbadoro ụkwụ na ntaramahụhụ bụ itinye mmadụ na mkpọrọ ebe ya na mmadụ ọzọ agaghị enwe mmekọ. Ọ gbara ndị mkpọrọ 16 ajụjụ ọnụ n'onyonyo ahụ. Ụmụ ya abụọ na di ya bụ Taghi Rahmani gbara ọsọ ndụ gbapụ na mba ha.

Tamana Zaryab Paryani

Tamana Zaryab Paryani, Afghanistan

Onye na-akwalite ikike dịịrị onye

Ndị ji egbe ji ike kpọrọ Tamana Zaryab Paryani na ụmụnne ya nwaanyị n'ụlọ ha dịka ha socha mee ngagharị maka ikike dịịrị onye ị ga akwụkwọ ma rụọ ọrụ. Dịka ọtụtụ mba ụwa na-akọta etu e siri kporọ ha ma na-ekwu ka atọhapụ ha, ndị Taliban na-ekwu na aka ha adịghị ya.

Ọ gbalịrị mee ihe onyonyo maka nwuchi ya ma zịpụ ya na ịntanetị. Ihe onyonyo a kpughere etu ndị na-azọchitere ụmụ nwaanyị si efu. Ọ nọrọ izuụka atọ na mkpọrọ tupu a tọhapụ ya. O bi na mba Jamini ugbua, ma gbaa ịchafụ ya ọkụ iji kwado ụmunwaanyị ndị mba Afganistan nke bụ nnukwu okwu ebe ụmụnwaanyị Afghhanistan nọ.

Dịka ụmu nwaanyị ndị mba na-aga n'ihu, adọhachila ụmụ nwaanyị mba Afghanistan azụ afọ 20. Anapụla ha afọ iri abụọ ha ga-eji mee ihe bara uru.

Tamana Zaryab Paryani

Alice Pataxo

Alice Pataxo, Brazil

Onye na-alụ ọgụ maka ndị na-achọ nnwereonwe

Onye na-alụ ọgụ maka mgbanwe ihu eluigwe ma bụrụ onye ntaakụkọ, Alice Pataxo na-achọ ime ka ndị mmadụ mata etu iwu na atụmatụ gọọmentị Brazil banyere ịkọ ugbo si emetụta ikike ala ndị nwe ala. Dịka onye nkwuchiteọnụ ndị Pataxo, ọ chọrọ inwale atụmatụ ndị chịrị ọchịchị nchịgbu nwere maka ndị nwe ala ma chọkwa igosipụta etu e si egbu ndị dịka ya na-ekwukwa okwu maka gburugburu.

Ọ bụ onye ntaakụkọ nke Colabora ma na-emepụtakwa onyonyo n'akara Youtube ya Nuhe, aha na-arụtụ aka na ndị na-acọ nnwereonwe na Brazil.

Malala Yousafzai

Malala Yousafzai mereiri n'afọ 2021 họpụtara ya

Ọ masịrị m nke ukwu ịhọpụta Alice Pataxo ka o soro na BBC 100 Women nke afọ a. Ọrụ niile Alice na-arụ iji kwalite ọgụ a na-alụ megide mgbanwe ihu eluigwe, ikpaoke n'etiti nwoke na nwaanyị nakwa ikike ndị nwe ala na-enye olileanya na e nwereike inwe ụwa ebe e nwere nhatanha na etiti nwoke na nwaanyị.

Roya Piraei

Roya Piraei, Ịran

Onye na-alụ ọgụ ikike ruuru onye

N'ọnwa Sepụtemba, foto Roya Piraei wuru ewu na soshal midịa. Nne ya bụ Minoo Majidi dị afọ 62 nọ na-egosi iwe ya megide Kermanshah, ebe ndị kacha asụ asụsụ Kurd na mba Ịran oge ndị cnhekwa gbara ya egbe gbagbuo ya. Piraei kpụchapụrụ ntutu ya niile ma jiri ntutu ahụ guzoro n'akụkụ ili nne ya na -eleba anya n'ime ose onyonyo.

Ọ bụrụla otu n'ime ihu ndị na-agba na akụkọ na mbaụwa oge ndị mmadụ malitere igosi iwe ha n'Iran megide gọọmentị maka ọnwụ Mahsa Amini dị afọ 22 ma bụrụkwa onye Kurd. Piraei ezutela praịm mịnịsta ndị mba Frans bụ Emmanuel Macron iji nweta nkwado ndị mbaụwa maka ngagharịiwe a na-eme ugbua.

Yuliia Sachuk

Yuliia Sachuk, Ukraine

Onyendu ndị nkwarụ

Yuliia Sachuk bụ onye na-alụ ọgụ ikike dịrị onye ma bụrụkwa onyeisi otu Fight for Right bụ otu ụmụnwaanyị ndị nkwarụ nọ n'isi ya. O hibere otu gbatagbata nye Ukraine dịka Russia na-ebuso ha agha ndị na-arụ ọrụ malite n'ụtụtụ rụọ n'abalị maka mgbapụta puku kwuru puku ndị nkwarụ nọ n'Ukraine.

Ikwado ụmụagbọghọ na ụmụnwaanyị ndị nkwarụ na-anụ Sachuk ọkụ n'obi. O sonyere n'emume ọzụzụ ndi ndu 'Obama Foundation' na Yurope, o ritere nkwanyeugwu nke 'National Human Rights' n'afọ 2020, ma bụrụkwa onye na-anọchite anya Yukren na kọmiti otu UN na-ahụ maka ikike dịịrị ndị nkwarụ.

Suvada Selimović

Suvada Selimović, Bosnia na Herzegovina

Onye na-akwalite udo

O meela afọ iri atọ agha wakporo ma mebie ọtụtụ ihe n'obodo Bosnia na Herzegovina, ugbua, Suvada Selimovic bi n'obodo ya na ụmụ nwaanyị ibe gbara ọsọ maka agha ruziri dịka ha lọghachịrị azụ.Selimovic bụ nwaanyị ajadu nwere ụmụ ka dị nta hiwere otu ọ kpọrọ Anima nke ọrụ ha bụ ịkwalite udo na inye ụmu nwaanyị ikike dịịrị ha.

Dịka mgbe emechara hụ ozu di ya n'ili eliri igwe mmadụ n'afọ 2008, nwaanyị a wepụtara onwe ya dịka onye akaebe n'ụlọikpe a na-ekpe ikpe maka mpụ oge a na-alụ agha iji gbaa ụmụ nwaanyị ibe ya ume. Ugbua, Anima na-enyere ụmụ nwaanyị na-arịa ọrịa ime mụọ maka ihe ha gabigara oge agha ma na-nyere kwa ha aka ire ihe ha rụpụtara.

Efrat Tilma

Efrat Tilma, Izrel

Onye na-arụ ọrụ na-anaghị ego

Dịka onye mbụ bụ 'transgender' wepụtara onwe ya ịrụ ọrụ uweojii n'efu na mba Israel, Efra Tilma na-eso na ndịọrụ gbata gbata, ma na-arụkwa ọrụ iji kwalite mmekọrịta n'etiti ndị uweojii na ndị LGBTQ. Tilma si n'Israel gbaa ọsọ gbaga Yurop oge ọ bụ nwata na-eto eto - dịka ndị ezinụlọ ya jụrụ ịnabata ya nakwa n'ihi mmekpa ahụ n'aka ndị uweojii. Na 1969 ka ọ gabigara usoro ụlọọgwụ na Casablanca iji gbanwee okike ya (gender), n'ihi na ụdị usoro ahụ bụ ihe a machiri amachi na Yurop.

O mechara bụrụ onye ọrụ enyemaka ụgbọelu n'obodo Berlin, bịakwa lụọ di. Ọ lọghachiri n'Israel n'afọ 2005 oge ya na di ya gbara alụkwaghịm, wee chọpụta na e nweela mgbanwe n'etu e si anabata ndị gbanwere okike ha. Nke a nyere ya njalite obi ịbanye ọrụ uweojii n'efu.

Zhou Xiaoxuan

Zhou Xiaoxuan, China

Nwaanyị na-akwalite ikike dịịrị onye

Dịka emume MeToo mba Chaịna na-aga n'ihu, ndị na-azọchitere ụmu nwaanyị na ndị mba ụwa na-eso ikpe Zhou Xiaoxuan. N'afọ 2018, ọ kpụpụrụ Zhu Jun bụonye ntaakụkọ ihe onyonyo nke gọọmentị bụ CCTV ụlọikpe maka ebubo ịmetụ ya aka n'ụzọ na-ezighị ezi ma susuo ya ọnụ n'ike mgbe ọ rụrụ ọrụ mmụta n'afọ 2014. Ọ gọrọ ya bụ ebubo ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ịmetọ aha ya.

Ụlọikpe kụpụrụ ebubo Zhou maka na-enweghị ihe akaebe zuruoke ma ụlọikpe anabataghị mkpesa ya n'afọ a nke mere ka ndị ntaakụko mba ụwa na-ekwu na nke a mekpara emume MeToo ahụ. Ugbua Zhou Xiaoxuan na-akwado ụmụ nwaanyị eji mmekọ ahụ gbagide ya na ịzọchitere ụmu nwaanyị n'ihe gbasara ha na mba Chaịna.

Nwaanyị na-akpụ isi

Nwaanyị na-akpụ isi, Ịran

Onye na-eme ngagharịiwe

Ngagharịiwe zuru obodo ọnụ malitere na mba Iran n'afọ a, n'ihi ogbugbu Mahsa Amini, nwaanyị Kurdish dị afọ 22, onye ndị ọrụ nchekwa 'morality police' jichiri n'ụbọchị 13 nke ọnwa Septemba n'ihi na ọ dara iwu mba Ira n tinyere nke bụ na ụmụnwaanyị ga na-eji ịchafụ maọbụ hijab na-ekpuchi isi ha oge niile.

N'afọ a, anyị chọrọ ịkwanyere ụmụnwaanyị ugwu maka mbọ ha gbara na ngagharịiwe ahụ, iji lụọ ọgụ maka nnwereonwe ha nakwa iji katọọ mmanye hijab.

Ịkpụ isi abụrụla otu njirimara ngagharịiwe nke a bụ nke ndị a ma ama, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị na-alụ ọgụ ikike dịịrị mmadụ n'ụwa niile. A na-ahụta ya n'obodo ụfọdụ n'Iran dịka ngosipụta iru uju.

Ahụike na Sayensị

Aye nyein Thu

Aye nyein Thu, Myanmar

Dibia bekee

Aye Nyein Thu bụ otu onye na-arụsi ọrụ na-anaghị ego ọbụla ike na mpaghara ebe e nwere ọgbaghara na Myanmar, ọ na-einye uchu karịa na steeti ndị dara ogbenye dịka Chin. Ọ rụrụ ihe dịka ụlọọgwụ nwere ntakịrị ebe a na-awa ahụ n'ọnwa Novemba afọ 2021 ma jirikwa ya na-eleta ndị merụrụ ahụ na ndị ọrịa.

Oge ọ nọghị n'ọrụ, ọ na-eme njem gaa mpaghara ndị ọzọ ebe ahụike na-anọchaghị cha cha inyere ndị ime obodo ebe ahụ aka gụnyere ndị ọgbaghara mere ka ha gbahapụ ụlọ ha. Dịka ọ na-arụ ọrụ ya, ndị agha Myanmar boola ya ebubo na ọ 'kpalitere ndị mmadụ ime ọgbaghara', ha bokwara ya na ọ na-akwado ndị otu ime obodo ahụ na-anaghị akwado gọọmentị a kpọọ People's Defence Forces.

Sirisha Bandla

Sirisha Bandla, Ịndịa

Ịnjinia na-arụ ụgbọelu

Sirisha Bandla soro na ndị Unity 222 mission jiri Virgin Galactic gaa n'ime ihu eluigwe n'afọ 2021- mere ya nwaanyị abụọ si Ịndịa gara na space.

Ihe gbasara ihueluigwe na space malitere ịmasị ya oge ọ dị na nwata, Bandla gara gụọ aeronautical engineering n'Amerịka. Ugbua, ọ bụzi osote onyeisi otu gọọmentị na-eme nchọpụa maka arụmarụ Virgin Galactic a kpọrọ Government Affairs and Research Operations for Virgin Galactic. Ọrụ a gụnyere isoro ndị chọrọ iso ụgbọelu ahụ mee nchọpụta nakwa ihe na-eme n'ime ụgbọelu ahụ bụ VG's Spaceship.

Sunny Leone

Onye họpụtara ya b onye so na 100 Women afọ 2016 bụ ome ejije Sunny Leone

N'ime ọrụ ụmụnwoke juru, etu Sirisha siri gafee nsogbu niile ruo n'isi mmiri maka ọrụ ya na-akpali mmụọ m mana nke kacha mkpa bụ maka ụmụaka ụmụnwaanyị niile nwekwara ụdị mmasị a.

Victoria Baptiste

Victoria Baptiste, Amerịka

Nọọsụ na onye na-enye ọzụzụ maka ọgwụ mgbochi

Onye nọọsụ na steeti Maryland na mba Amerịka, Victoria Baptiste na-akụziri ndị mmadụ maka ọgwụ mgbochi. Ọ ghọtara ihe kpatara na ndị isiojii na-enyo ọgwụ mgbochi ndị a na-ewepụta enyo: Baptiste bụ onye agbụrụ Henrietta Lacks, nwaanyị isiojii nwụrụ maka akpụ kansa nke cervix n'afọ 1951 ma bụrụkwa onye e nwere mkpụrụndụ ya na-agwaghị ya agwa iji mee nnyocha.

Onye a mara ka HeLa celss, a na-eji ya eme nnyocha maka ahụike kamgbe ahụ mana ndị ezinaụlo ya amaghị ruo afọ ole na ole. Ugbua, dịka ihe so n'ime Henrietta Lacks Foundation, Baptiste bụzikwa onye nnọchitanya ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ WHO n'okwu gbasara ikpochapụ kansa nke cervix.

Niloufar Bayani

Niloufar Bayani, Iran

Ọkachamara maka gburugburu

Ọkachamara maka gburugburu bụ Niloufar Bayani bụ otu onye n'ime ndị na-ahụ maka gburugburu a nwụchiri na mba Ịran n'afọ 2018 dịka o sechara foto anụmanụ ndị na-ekpochapụ ekpochapụ. E boro ha ebubo na ha na-egboko mgbasaozi nke gọọmentị na-echekwa echekwa gbasara ụfọdụ ebe a na-achọghị ka ọ pụta ihe, a mara Bayani ikpe ma tụọ ya nga afọ iri.

Bayani bụ onyeisi emume otu Persian Wildlife Heritage Foundation, otu na-etinye uchu na nchekwa agụ ọsọ nke ndị Asia nakwa anụ ndị ọzọ. N'ime akwụkwọ a natara BBC Persia, o kwuru na otu ndị agha Ịran bụ Islamic Revolitionary Guards Corps "tara ya ahụhụ kacha ahụhụ metụtara echiche ya, anụ ahụ ya nakwa obi ya ma jikwara okwu mmetọ maja ya ihe ruru elekere 1,200". Gọọmentị Ịran gọrọ aka na ụkwụ ha na ha emeghi ihe ọjọo ọbụla.

Sandy Cabrera Arteaga

Sandy Cabrera Arteaga, Honduras

Onye na-ekwuwa okwu maka ọmụmụ nwa

Dịka ọ na-agụ Philosophy na mahadum, bụrụkwa odeakwụkwọ na onye na-ekwuwa okwu maka ikike ụmụnwaanyị, Sandy Cabrera Arteaga bụkwa onye na-echekwa okwu gbasara ọmụmụ nwa na aramara. Ọ na-akụzị maka ọgwụ mmadụ ga-aṅụlị n'ụtụtụ ma o mechaa aramara ma bụrụkwa onye nkwuchiteọnụ otu 'Hablemos lo que es' (Let's talk about what it is) - otu na-akụzi maka ọgwụ mgbochi afọ ime n'ịntanetị.

Ọ na-arụkwara otu Accion Joven (Youth Action) bụ otu na-eleba anya n'okwu gbasara ndị ntoroọbịa, aramara na ọmụmụ. Ọ na-asụ asụsụ ndị ogbi Honduras dịka ọ bụ otu nwa nne ya bụ onye nti chiri nwere. Ọ masịrị ya etu e siri zulite ya n'ụzọ dị omimi.

Samrawit Fikru

Samrawit Fikru, Etiopia

O ji teknuzu achụ ego

Agbanyeghi na o jighi igwe kọmputa mee ihe ọbụla ruo mgbe ọ dị afọ 17, Samrawit Fikru na-ede akara kọputa ugbua malitere Hybrid Designs, otu n'ime ụlọọrụ e ji akpọ ụgbọala n'Etiopia a na-akpọ RIDE.

Ihe kpatara o ji malite APP ahụ bụ maka nsogbu ọ na-enwe ịchọta ụgbọala o ji ala ọrụ ma o mechie nwakwa etu ndị ọkwọụgbọala ji achọ ịna ya ego karịa, o jiri ihe pekarịrị $2,000 (£1,700) malite ya. Ụlọọrụ ya nyee ụmụnwaanyị ọrụ karịa. Ụmụnwaanyị ndị na-arụ na teknuzu n'Etiopia pere mpe nke mere Fikru ji chọọ ịkpalite mmụọ agbụrụ ụmụnwaanyị ndị na-abịa isonye na teknụzụ.

Azụmahịa nke ụmụnwaanyị nwee na-eto n'ọnụọgụgụ, ugbua, anyị chọrọ ụmụaka ụmụnwaanyị ndị ga-abị were ego ikwalite ezigbo atụmaụ ha nwere.

Samrawit Fikru

Wegahta Gebreyohannes Abera

Wegahta Gebreyohannes Abera, Tigray, Ethiopia

Onye ọrụ gbatagbata ọdịmma mmadụ

Wegahta Gebreyohannes Abera bụ onye ọrụ gbatyagbata ma bụrụkwa onye hiwere otu Hdrina, bụ otu nọọrọ onwe na-abụghị kwa maka ego nke oke ha bụ ifichapụ erịghị nri zuruoke nke agha mba Yukren na-ebute.Hdrina na-agba mbọ n'ụzọ di iche iche iji nyere ụmụnwaanyị na ụmụaka agha Yukren metụtara nke gụnyere inye ndị gbara ọsọ agha nri n'ogige ha na ịkọ ubi n'ebe dị iche iche.

Otu a na-agba kwa mbọ inyere ụmnụnwaanyị edinara n'ike oge agha na ụmụ nwaanyị ndị ụbịam na nsogbu so agha mere ka ha bụrụ akwụnakwụna.

Dilek Gursoy

Dilek Gursoy, Jamini

Dọkịnta na-awa ahụ ndị mmadụ

A mụrụ ya na Jamini mana nne na nna ya bụ ndị Tọkị, Dkt. Dilek Gursoy bụ onye welitere isi na ndị dọkịnta na-awa mmadụ ahụ ma bụrụkwa ọkachamara n'okwu gbasara inye obi a rụrụ arụ. E tinyere foto ya n'ihu akwụkwọ Forbes magazine na Jamini, ebe a kwalitere ya dịka nwaanyị mbụ bụrụ dọkịnta na-awa ahụ na mpaghara Yurop tinyere mkpụrụobi a rụrụ arụ n'ahụ mmadụ.

Ọ nọrọla n'ihu nyocha maka nchọpụta gbasara mkpụrụobi a rụrụ arụ kamgbe ihe karịrị afọ iri, ebe ọ na-eme nchọpụta banyere ụzọ ọzọ a ga-esi enweta obi na-abụghị mkpụrụobi mmadụ maka na ndị na-enye mkpụrụobi ha anaghị ebu ibu ọkachasị ebe ọ gbasara ụmụnwaanyị. O deela akwụkwọ banyere onwe ya ma na-achọkwazi ịmalite ụlọọrụ nke ha ga-ahụ maka mkpụrụobi.

Sofia Heinonen

Sofia Heinonen, Ajentịna

Onye na-echekwa gburugburu

Onye tinyere uchu na ichekwa gburugburu, onye bayọji Sofia Heinonen nyere nnukwu aka ibelata nsogbu anụ ndị na-ekpochapụ ekpochapụ na Saụt Amerịka site na atụmatụ Esteros del Ibera, ala ebe mmiri kacha adọ n'Ajentina nakwa ebe kachasị adị mmiri n'ụwa. Ọ nọọla afọ 30 akwalite nchekwa gburugburu ma na-emepe ebe ndị a na-echekwa echekwa.

N'okpuru ọchịchị ya, atụmatụ Rewilding Argentina na-aga n'ihu na mpaghara anọ gụnyere Patagonian steppe, n'atụmatụ iweghachite ala ndị nkiti nwe ka ọ bụrụ ebe a na-echekwa echekwa a na-eme nlegharị anya ma weghachitekwa anụmanụ ndị e ji mara ha iji chekwa gburugburu ha.

Kimiko Hirata

Kimiko Hirata, Japan

Onye na-ekwuwa okwu maka mgbanwe eluigwe

Onye na-ekwu okwu megide iji unyi amụ ọkụ, Kimiko Hirata ejirila ihe karịrị ọkara ndụ ya na-alụ ọgụ ịhụ na Japan kwụsịrị nchekwube ya na mmanụ agbidi dị icheiche - ha kacha ebute mgbanwe eluigwe. Mgbasaozi ya n'ime obodo kpatara e jiri kagbuo ụlọọrụ 17 a chọburu ịrụ maka imepụta unyi 'coal'\. Ya bụ nwaanyị onye Japan mbụ ritere nturuugo Goldman Environmental Prize.

Hirata hapụrụ ọrụ ya dịka odeakwụkwọ ka o wee bụrụ onye na-eti mkpu maka mgbanwe ihu eluigwe kamgbe afọ 1990 oge ọ gụchara akwụkwọ Al Gore a kpọrọ Earth in the Balance. Ọ bụzi onyeisioche n'ụlọọrụ na-ekwu maka mgbanwe ihu eluigwe a kpọrọ Clima Integrate malitere n'ọnwa Jenuwarị afọ 2022, ọ na-ahụ maka ibelata anwụrụ ọkụ.

Judy Kihumba

Judy Kihumba, Kenya

Onye na-atapị okwu ndị na-anaghị ekwu okwu

Dịka onye na-ekwuwa okwu maka ahụike ụbụrụ na echiche ụmụnwaanyị na-anaghị anụ ihe mụrụ nwa ọhụrụ, Judy Kihumba tinyere aka iji hụ na mgbasaozi gbasara ahụike ruru ụmụnwaanyị niile aka oge ọ chọpụtara na ụfọdụ ụlọọgwụ na Kenya enweghị ndị na-atapịrị ha asụsụ ndị ogbi.

Ọ malitere Talking Hands, Listening Eyes on Postpartum Depression (THLEP), otu na-enyere ụmụnwaanyị ntị chiri aka n'ịmụ nwa. Kihuma malitere otu ahụ oge ọ gabigachara obi ịdamba sitere n'ịmụ nwa n'afọ 2019. N'afọ a, ha haziri mmemme mbụ dịka otu nye onye otu ha dị ime nke kpokoro ndị nne 78 chiri ntị nakwa ndị ọrụ ahụike.

Marie Christina Kolo

Marie Christina Kolo, Madagaska

Oje mgbanwe ihu eluigwe achụ ego

Dịka ọchụegọ na-echekwa gburugburu, Marie Christina Kolo nọ na ndị otu gọọmentị Madagaska gara ọgbakọ COP27. Ọ na-ekwuwa okwu maka ugwu na ikik dịịrị onye nakwa ikike dịịrị ndị n'okwu mgbanwe ihu eluigwe dịka oke ọkọchị na-ebute oke agụụ na mba ha mere na nri anaghị eru nde kwuru nde ndị mmadụ. Otu mbaụwa UN kpọrọ ya oke agụụ mbụ nke mgbanwe ihueluigwe kpatara.

Kolo bụkwa onyeisi otu na-abụghị otu gọọmentị a kporọ People Power Inclusion na mpaghara ha bụ otu na-ebu agha megide ụbịa site na nchekwa gburugburu. Ụlọọrụ ya bụ Gree N'Kool bụ otu ụlọọrụ nọ n'isi inweta ikpe mkwumọtọ n'okwu mgbanwe ihu eluigwe. Dịka onye gabigara mmegbu megide ụmụnwaanyị, ọ malitere otu ọ kpọrọ Break the Silence nke na-alụ ọgụ megide omenala mwakpo.

Anyị achọghị ka a na-ahụta anyị naanị dịka ndị mgbanwe eluigwe bunyere ụbịa maọbụ ndị ụmụnwoke megburu. Ọ na-amasị m ma na akpalikwa mmụọ m ịhụ na anyị bụ ụmụnwaanyị nwereike ịkwụsi ike agbanyeghi nsogbu niile anyị nwere.

Marie Christina Kolo

Iryna Kondratova

Iryna Kondratova, Yukren

Dọkịnta Ụmụaka

Agbanyeghi na ọ gabigara nkatọ dị icheiche, Dkt. Iryna Kondratova na ndị ọrụ ya na-eleta ndị ụmụnwaanyị dị ime, ụmụaka a mụrụ ọhụrụ na ndị nneha n'ụlọigwe Kharkiv Regional Perinatal Centre. Ha haziri ngalaba ebe ụmụnwaanyị na-amụ nwa n'okpuru ala n'ụlọọgwụ ma tinye onwe ha n'ihe ize ndụ ileta ụmụaka nọ n'ezigbo ihe ize ndụ e nweghi ike ibupụ n'ụlọọgwụ, agbanyeghi na mgbịrịgba na-akụ na nsogbu dị.

Dịka onyeisi ụlọọrụ ahụ, Dkt. Kondratova were oche n'akara ịnstagram David Beckam n'ọnwa Maachị iji gosipụa nsogbu ha na-agabiga. Ndị ọrụ ya enyerela ụmụnwaanyị ruru 3,000 nwere otu nsogbu maọbụ ọzọ si na Luhansk na Donetsk n'afọ 2014.

E mebiri ụlọ anyị, mebie ụzọ, ọkụ latrik, ụlọọgwụ - na ndụ. Mana olileanya anyị, okwukwe anyị na ntukwasị obi anyị kwụsịrị ike.

Iryna Kondratova

Asonele Kotu

Asonele Kotu, Saụt Afrịka

Oji teknuzu achụ ego

Ihe mụara atụmatụ azụmahịa ya bụ oge ọ chọrọ iwepụ ihe na-egbochi ọmụmụ o tinyere n'ahụ ya mana ọ hụghị onye ga-enyere ya aka. Ọ malitere FemConnect, ụlọọrụ ji teknụzụ enye aka ebelata ụbịam so nsọ nwaanyị nakwa belata itu ime mkpuke.

FemConnect na-enyere ndị nwere ya aka inweta ozi gbasara inwe mmekọ na ọmụmụ na-akpaghị oke ọbụla, ọ naebukwa ozi gbasara ịdị ọcha nwaanyị nakwa etu e si egbochi ọmụmụ - ọ dịkwa mfe etu e s egote nri n'ịntanetị. Kotu tinyere uchu n'ikwụsị ụbịam so nwaanyị ịhụ nsọ ma na-akwado inweta ahụike tọrọ atọ ọkachasị nye ndị ntoroọbịa nwereike izute ịkpaoke agbụrụ nakwa ndị nọ n'obodo ahụike anaghị erucha.

Ọ bụ ihe mara ezigbo mma ikiri etu ndị ntoroọbịa si emepụta ihe ndị e ji enyere ndụ aka iji hụ na ndị na-abịa ataghị ụdị ahụhụ ndị nne na nna anyị ha tara.

Asonele Kotu

Erika Liriano

Erika Liriano, Dominika Rịpọblik

Onye ahịa Koko

Iji wugharịa usoro e ji ebupu Koko, Erika Liriano malitere ụlọorụ na-ebupu Koko na mba Dominikan Repọblik. Liriano na nwanne ya nwaanyị bụ Janett malitere ụlọọrụ INARU, iji nye aka mee ka mmepụta na nkes Koko dịwanye mfe ma kawanye mma. N'afọ a, ụlọọrụ ha nwetara nkwado ego.

Kamgbe ụwa, azụmahịa Koko na-emegide ndị ọrụ ugbo dara ụbịam, mana ụlọọrụ ha na-enye aka ịhụ na a kọpụtara Koko n'ụzọ kwesịrị ekwesị ma na-akwụkwa ndị ọrụ ugbo Dominican ego ruuru ha. Ụmụnne abụọ a a mụrụ na New York si n'ezinụlọ ndị ọrụ ugbo na ndị oji ego achụ ego pụta. Ugbua, ha na ụmụnwaanyị ndị ọrụ ugbo na-ejikọ aka ikesa koko na mba ha.

Mmadụ ọbụla kwesịrị inwe ikike ikpebi usoro ndụ ya ga-esi aga, nke a gụnyekwara ikike nwaanyị ịhọrọ ụdị ndụ ọ chọrọ maka onwe ya.

Erika Liriano

Naja Lyberth

Naja Lyberth, Grinlandị

Dọkịnta na-ahụ maka akọ na uche

Dọkịnta akọ na uche Naja Lyberth dị naanị afọ 13 oge e tinyere ya akụrụngwa na-egbochi ọmụmụ n'ime ahụ a na-akpọ coil, nke ahụ so n'ụzọ ndị Dọkịnta mba Denmak ji chọrọ ibelata ọmụmụ n'etiti ndị obodo Inuit na Greenlandị n'afọ 1960 nakwa 70. N'afọ a, Denmak na Grinlandị kpebiri ime nyocha banyere mkpamkpa ahụ kpara oge ahụ nke metụtara ihe ruru mmadụ 4,500 ndị nne nwaanyị na ụmụaka ụmụnwanyị.

Agha Lybert buru iji nyere ụmụnwanyị ndị a aka gụnyere ma ndị chere na akụrụngwa coil ahụ mere na ha amụghị nwa. O mepela otu na Facebook ebe ụmụnwaanyị ga-ezuko ma nyere onwe ha aka.

Ọtụtụ n'ime ụmụnwaanyị ndị isi ha pụtara n;ihe ahụ na-ewelite isi ha ma bụrụ ndị ụmụnwaanyị ndị ọzọ na-elegara anya. Ikwupụta okwu na-enye aka achụpụ ụjọ ma ị chọpụta na o nweghi onye ga-ama gị ikpe. Anyị agahị ahpụ ka ụjọ na-ejigide anyị.

Naja Lyberth

Nigar Marf

Nigar Marf, Irak

Nọọsụ

Dịka onyeisi nọọsụ na ngala na-ahụ maka ndị ọkụ gbara na Kurdistan dị n'Irak, ọrụ Nigar Marf gụnyere ileta ụmụnwaanyị ndị jiri aka ha mụnye onwe ha ọkụ. A ka na-eme ụdị ihe a n'etiti ụmụnwaanyị na mpaghara ahụ iji gọsipụta iwe ha megide ihe.

Marf arụọla ọrụ n'ụlọọgwụ ihe ruru afọ 25 dịka n'ime ngalaba na-ahụ maka ụmụaka ọkụ gbara nakwa na ngalaba gbata gbata. Na wọọdụ ya, ọ na-eletakwa ndị ọkụ gbara na-amaghị ama. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị o letara gabigara mmetọ echiche maọbụ mmegbu tupu ha ekpebie ịmụnye onwe ha ọkụ; ụfọdụ n'ime ha bụ ụmụaka dị afọ 16.

Monica Musonda

Monica Musonda, Zambia

Ojiegoachụego

Onye bụbu Ọkaiwu mechaa bụrụ Ojiegoachụego, Monica Musonda bụ onye malitere ụlọọrụ Java Foods. Ụlọọrụ a dị na Zambia bụ nke na-arụpụta nri na mpaghara ndida Afrịka. O nwere olileanya ịrụpụta nri adịghị oke ọnụ site n'iji oke Wheat dị na mba Zambia.

Musonda bụ onye na-akụzi maka nri dị mma ma na-elekọta ụmụnwaanyi jiego achụ ego. Ọ na-ekwuputa maka nsogbu ụmụnwaanyị na-azụ ahịa na-agabiga. O ritela ntụtụgo dị ọtụtụ dịka a ma ya maka ọrụ ya ihazi ihe gbasara nri na ọrụ ugbo n'Afrịka

Ifeoma Ozoma

Ifeoma Ozoma, Amerịka

Ọkamara n'okwu teknụzụ na onye ọnụ na-eru n'okwu

Oge e gbajọrọ akwụkwọ ikpuchi ọnu o binyere aka, o boro ndị ọrụ ya Pinterest ebubo ịkpaoke agbụrụ na ịkpaoke n'etiti nwoke na nwaanyị, Ifeoma Ozoma foro ntutu taa inyere ndị na-arụ ọrụ aka ibu agha megide ụdị mmegide ọbụla n'ụlọọrụ. O sokwa na ndị kwadoro edemede iwu a kpọrọ Silenced No More Act nke ga-enyerre onye ọrụ ọbụla na Kalifoṅia aka ikwupụta okwu maka mkpagbu, ịkpaoke agbụrụ na mmegbu agbanyeghi ma o binyere aka n'akwụkwọ ikpuchi ọnụ. Pinterest nyochara ụlọọrụ ha maka ebubo Ozoma ma kwuo na ha kwadoro edemede iwu ahụ.

Ozoma kepụtakwara akwụkwọ o kpọrọ The Tech Worker Handbook, ebe o kpokọrọ ọtụtụ ihe ndị ga-enyre ndị ọrụ aka ikwupu okwu, ọ malitekwara Earthseed, ndị na-adụ ndị isiọrụ ndụmọdụ banyere inye ihe nhatanha n'ụlọọrụ ndị teknụzụ.

Yuliia Paievska

Yuliia Paievska, Yukren

Onye ọrụ gbatagbata

Onye ọrụ gbatagbata ahụike a na-eto na mba Yukre, onye malitere otu Taira's Angels otu na-enyere ndị nkịtị nakwa ndị agha e meruru ahụ aka. Ndị agha Rọshịa nwụchiri Yuliia Paievska, onye e ji Taira mara n'ọnwa Maazhị oge ọ na-enye aka akpọpụta ndị nkịtị na Mariupol.

O jibu igwe ose foto na-esekọ ọrụ niile ya na ndị ọrụ ya na-arụ n'obodo ahụ a wakporo awakpo, e nyere ndị ntaakụkọ ihe niile o setere. Oge a tọghapụrụ ya ka ọnwa atọ gasị, Paievska kwuru maka ajọ ọnọdụ na ụdị mmegbu e megburu ya oge a nwụchiri, o kwuru na njide e jidere ya dịka "ọkụ mmụọ".

Jane Rigby

Jane Rigby, Amerịka

Ndị Sayensi mpụga ụwa

Dịka onye na-arụ na Nasa, Dkt. Jane Rigby na-agụ gbasara etu galagzy si agbanwe site n'oge. O so na ndị nchọpụta sayensi mbaụwa soro we zipu James Webb, telescope kacha we dị irie n'ụwa.N'ọnwa July, James Webb sere foto bụ n'ihu eluigwe bu agwa kọlọ.

Rigby ebipụtala akwụkwọ ruru 100 ndị otu ya nyocharala ma ritekwa nturuugo dị icheiche maka nyocha ya. Ọ bụ otu onye olu ya na-ada ụda maka inye onye ọbụla ohere n'akụkụ STEM (Science, Technology, Engineering na Mathematics).

Oge m bụ nwata akwụkwọ, amaghị m maka okwu gbasara ndị LGBTQ m na-elegara anya. Olileanya m bụ iso na gbụrụ ikpeazụ ga-etolite ma ha enweghi ndị edina ụdị ha a ga na-elegara anya.

Jane Rigby

Ainura Sagyn

Ainura Sagyn, Kyrgyzstan

Injinịa

Dịka injinịa na-ahụ maka kọmputa nakwa onyeisi ụlọọrụ na-ebido ebido. Ainura Sagyn na-etinye ọzụzụ ya n'ọrụ site n'ịchọta usoro ọ ga-esi eji teknụzụ enye aka ebelata nsogbu gburgburu. Ọ maltiere Tazar, igwe appụ e ji akpọkọ ndị na-emepụta atịtị - dịka ndị mmadụ, ndị na-ere nri, ndị na-emepụta ihe na ndị na-arụ ụlọ - ka ha na ndị na-ahazigharị atịtị zute. Igwe appụ ahụ na-achọ ibelata atịtị na-akwụsị n'ime ala ma nyekwa aka belata nsogbu atịtị na-ebute na mpaghara Asia etiti.

Ọ kuziela ihe ruru mmadụ 2,000 ụmụwakwụkwọ site n'ebe dị icheiche na Kyrgyzstan gbasara ide aụsụ kọmputa bụ coding nakwa gbasara teknzu na sayensị bụ STEM (Science, Technology, Engineering and Mathematics).

Ma e nweghi ndị ndu bụ ụmụnwaanyị na-esonye n'okwu mgbanwe ihueluigwe, ọ ga-ara ahụ inweta atụmatụ siri ike a ga-echi chekwa ihu eluigwe ma chekwa nwoke na nwaanyị.

Ainura Sagyn

Monica Simpson

Monica Simpson, Amerịka

Onye na-ekpe ikpe maka ọmụmụ

Dịka onyeisi ụlọọrụ SisterSong, otu ụmụnwaanyị isiojii na agwa ndị ọzọ jikọrọ aka ọnụ na-arụ ọrụ ma na-ebulitekwa ikpe gbasara ọmụ na mpaghara steeti ndị ndịda mba Amerịka, Monica Simpson na-etinye uchu na-ịlụ ọụ̀ụ maka nnereonwe ọmụmụ. Nsogbu a lọghachitere na mbara n'afọ a oge Ulọikpe Ukwu Amerịka tụgharịrị ikpe Roe na Wade nyeburu ohere ka ndị mmadụ tee ime na mba Amerịka niile.

Simpson na-agụkwa egwu ma na-ama mbem e dere ede, na-etinye ọgụ na-alụ n'ime nka ya. Ọ bụ onye nwere ikike ịmụ ịna nwa ma bụrụkwa otu n'ime ndị malitere otu Black Mamas Matter Alliance, na-arụ ọrụ ikwalite ndụ ndị nne ụmụnwaanyị isi ojii.

Maryna Viazovska

Maryna Viazovska, Yukren

Mgbakọ na mwepụ

Na mbido afọ a ka nwaanyị mba YUkren bụ ọkaibe na mgbakọ na mwepụ ritere ntụrụugo nke Fields Medal - nke ụfọdụ na-akpọ ntụrụugo Nobel nke ndị ọkaibe mgbakọ na mwepụ - nke a na-enye kwa afọ anọ. Maryna Viazovska ritere ntụrụugo nke ya maka ọrụ ya na nsogbu mgbagwoju anya nọọrọla afọ 400, ya bụ nsogbu bụ maka etu ị ga-esi hazie ihe gbara ọkịrịrkị n'ime nke nwere akụkọ asatọ.

Ọ nọ dịka Prọfesọ na ọkaibe na Number Theory na Mahadumm nke Mgbakọ na Mwepụ

Yana Zinkevych

Yana Zinkevych, Ukraine

Onye ndọrọndọrọ ọchịchị na-enye aka n'ahụike

Hospitalisers bụ ndị ọrụ enyemaka na-azọ ndụ n'agha nke Yana Zinkevyich bụ onyeisi ha. Ọrụ ha bụ ibupu ndị merụrụ ahụ n'ọgbọ ọgụ. Zinkevyich malitere ọrụ ịzọ ndụ mgbe ọ gụchara akwụkwọ ma bido 'Battalion' n'afọ 2014 mgbe esemokwu Yukren bidoro.

O jila aka ya bupu ihe ruru ndị agha narị abụọ merụrụ ahụ n'ebe ndo dị. Otu ka na-enyere ndị agha merụrụ ahụ nakwa ndị nkịtị enyemaka. He ebupula ndị mmadụ ugboro puku isii. Nwaanyị a dị afọ 27 bụ onye omeiwu kachasị bụ nwata n'ụlọomeiwu mba Yukren ebe ọ bụkwa onyeisi kọmịtị ọgwụgwọ ndị agha.

100 Women - BBC Wolrd Service

Gịnị bụ Ụmụnwaanyị 100?

Ụmụnwaanyị 100 nke BBC na-akpọpụta aha ụmụnwaanyị 100 welitere isi ma kpalite mmụọ ndị mmadụ kwa afọ. Anyị na-emepụta ihe nkiri, akụkọ nakwa mkparịtaụka maka ndụ ha - akụkọ ndị na-etinye ụmụnwaanyị n'etiti.

Soro BBC 100 Women n'Ịnstagram, Facebook na Twitter. Soro mkparịtaụka maka ya jiri #BBC100Women

Kedụ etu e siri họpụta ụmụnwaanyị 100 a?

Otu 100 Women nke BBC depụtara aha site n'aha ndị ha kpokobara nakwa nke ndị otu ha nọ na World Service Language họpụtara. Anyị nọrọ na-achọ ndị nọ n'isiokwu a kpụ n'ọnụ n'ime ọnwa 12 nakwa ndị akụkọ ha na-akpalite mmụọ ndị mmadụ maọbụ ndị mepụtarala ihe ịtụnanya maọbụ ndị metụtara mba ha n'ụzọ e ji kpụrụ ha n'ọnụ. E mechara nyocha aha ndị ahụ site n'ile anya n'isiokwu nke afọ ahụ - agamnihu e nwetarala na mpaghara dị icheiche n'ime afọ ole na ole gara aga.

Anyị nyocha okwu ndị na-ebute nrụrịtaụka dịka okwu gbasara ikike ịmụnwa ebe ntolite ụmụnwaanyị nwereike ibutere onye ọzọ iwe na ọnụma, anyị sitere otu a họpụta ụmụnwaanyị ndị wetara mgbanwe n'ụzọ nke ha ebe ahụ. E nyochakwara aha ndị ahụ site na mpaghara gaa mpaghara nakwa eleghi mmadụ anya n'ihi tupu a họpụta ndị ikpeazụ.

Ụfọdụ ụmụnwaanyị aha ha nọ n'ime ya pụtara na nzuzo maọbụ na-etinyeghi aha ikpeazụ ha iji chekwa ha na ezinaụlọ ha. Ha kwdokwara ya ma e sokwara usoro iwu BBC.

Na Nzube Nzuzo Nzuzo Nri 450 Na Ntanetị Ihe Ego Eke Nweta Ntanetị Ngwa Ntanetị Enyemaka Enyemaka Indian Internationalization Agbara Ikike. Ikike ikike yiri ka ọ bụ ịzụta, na-enweghị nyocha. Ushki dị ka ọ na-ekerịta ntụgharị ntụgharị aka na nke ugbu a Amitkumar Sunat nwere ike ịhọrọ ntụzi mmadụ

Emebisịla ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ, mana enwere ike ịnye ozi onye ọrụ ahụ. Ma enweghi ike ịkwụsị mkparịta ụka zuru ezu, mana enwere ike imeziwanye ndụmọdụ ahụ. Nke mbụ bụ idobe ụwa dị ka asụsụ. Asụsụ bụ asụsụ nke ọha.

Click here to test multiple includes on one page