Test Page
Inye Ndị Ọchịchị Na-ahụ Maka Ngwa Ọbịaru ọsọ ọsọ Kpamkpam Usoro Elu Mmetụta Na India Na-agbakwunye Ohere zuru ụwa ọnụ na gburugburu ebe obibi dị mma Site na Inye Nleba Anya Ndị Afọ Forex Iji Nweta Ọfịs, Ozi Ọnọdụ Ọnọdụ Ya
Ozi enyi na ndụ, echiche ha, nkwurịta okwu, ihe owuwu, ahịa, wdg, ebumnuche ebumnuche ebumnuche bụ otu. A na-agwa ntinye ntuziaka ịzụta. Ugbu a, isiokwu nke nnwere onwe Bekee ekwughi okwu isiokwu nnwere onwe nke Bekee. Jaane Dishame World Hardware Dị Mkpa Ime Anwansi na-ahụ maka Ndị Ọrụ Na-ahụ Maka Ọrụ Ma,
BBC ewepụtala aha ụmụnwaanyị 100 ndị na-akpali mmụọ ma na-akwalite ndị mmadụ si mpaghara ụwa niile nke afọ 2023.
N'ime ụmụnwaanyị ndị a bụ ndị ọkaiwu na-alụ ọgụ maka ikike na ugwu dịịrị onye dịka Amal Clooney, onye na-eme ejije na Hollywood n'Amerịka bụ Ferrera, onye na-achụ ikike ụmụnwaanyị bụ Gloria Steinem, onye aka chịburu mba Amerịka bụ Michelle Obama, onye nọ n'azụmahịa ịchọ mma bụ Huda Kattan na onye meriri Balon D'or bị Aitana Bonmatí.
N'ime afọ ebe okpomọkụ dị egwu, ọkụ ọgbụgba, ide mmiri na ihe ndị ọzọ si na chi jupụtara n'akụkọụwa, aha ndị a gosirikwara ụmụnwaanyị ndị na-arụ ọrụ n'obodo ha inye aka megide mgbanwe ihuigwe nakwa ikuzi obodo ha etu ha ga-esi nagide mbimbi mgbanwe a na-ebute.
N'ime ụmụnwaanyị 100, anyị kpọpụtara mmadụ 28 na-ebe agha maka mgbanwe ihu eluigwe dịka a na-atụ anya ọgbakọ otu mbaụwa UN maka mgbanwe ihu eluigwe bụ Climate Chnage Conference COP28.
E nweghi etu e siri hazie aha ndị a e depụtara
Nka na Agụmakwụkwọ
Jess Pepper , UK
Onye hibere Climate Cafe
Climate Cafe bụ ohere ebe ndi mmadụ na-abịa ịṅụ mmanya, ma nọkọ ịkpa maka mgbanwe ihu igwe. Nke mbụ bụ Jess Ppper hibere ya na afọ 2015 n'ime obodo Birnam dị na Perthshire.
Ugbua ọ na-akwado ọgbakọ ndị ọzọ ịmalite ebe dị ka nke ya eji ịntanetị jikọọ.
Ndị na-aga ebe ahụ kwuru na ọ bụ ebe ha nwereike iwetu obi kpaa maka ihe ụjọ na ihe na-echekasị ha gbasara mgbanwe ihu igwe
Pepper nọkwa n'ụfọdụ ọkwa onyeisi n'etiti ndị na-ahụ maka ihu igwe. Ọ bụ onye otu otu pụrụiche nke Royal Georgraphical Society nke mba Skọtland nakwa onye otu Royal society of Arts.
Ihe gbasara mgbanwe ihu igwe na-aga n'ihu nke ụmụnwaanyị na ụmụaka na-edu. Ịhụ etu ọgbakọ anyị si ebute mgbanwe na-arụlite ihe ma na-akuzii ihe nakwa inye ohere maka mgbanwe ọzọ, ọ na-enye m olileanya.
Jess Pepper
Shairbu Sagynbaeva , Kyrgzstan
Otu-onye n'ime ndi kepụtara ''Life sewing shop''
Mgbe ọ gabigachara ụsọro ọgwụgwọ ọrịa cancer nakwa ịkwọ ụkwọ ọgwụ ya,ugbụa Shairbu Sagynbaeva nwere ebumnobi ọzọ.
Ya na ndi ọrịa cancer anọ mepere ''for life sewing shop'' ebe ha-ji olaedo obodo arụpụta akpa mana-ere ya. Ha na e wega ego nile ha nwetere n'ụlọọrụ na-ahụ maka ''cancer'' ị jị kwadọ ha.
Ha arụpụtala $33,000(#26,500) ha ji nyere nwmunwanyi 34 aka kwuọ -ụgwọ ọgwụ ha.
Sagynbaeva chọpụtara na-enwere mkpa ịkwado ndi ọria be ebe tere aka,nke a mere o jiri rụọrụ ha ọbere ụlọ ebe ha ga-na anọ.
Afroze-Numa, Pakistan
Onye ọzụzụ atụrụ
Onye so na ndị ọzụzụ atụrụ ikpeazụ nke ndị Wakhi, Afroze-Numa eletela ewu, yaka nakwa atụrụ ihe na-achụ afọ iri atọ.
Dịka ọ mụtara ọrụ ahụ n'aka nne ya na nne ya ochie, o so akwalite omenala karịrị narị kwụrụ narị afọ mana ọ na-anwụzị ọnwụ na ndagwurugwu Shimshal nke Pakistan.
Kwa afọ, ndị ọzụzụ atụrụ ndị a na-ekporo atụrụ ha rigoro n'elu ugwu ruru mit 4,800 n'elu mmiri ebe ha na-emepụa mmiri ara ha ga-eji zụọ ahịa ma atụrụ ha na-akpa nri.
Akaọrụ ha eweterela obodo ha agamnihu ma nyere ha aka ịzụ ụmụaka ha n'akwụkwọ. Afroze-Numa ka na-echeta etu o si bụrụ ya bụ nwaanyị mbụ na ndagwurugwu be ha ga-enweta akpụkpọụkwụ.
Hosai Ahmadzai, Afganistan
Onye na-eme onyonyo TV
Oge ndị Taliban were ọchịchị na mba Afganistan n'ọnwa Ọgọstụ 2021, Hosai Ahmadzai bụ otu n'ime ụmụnwaanyị ndị na-eme mgbasaozi n'onyonyo gara n'ihu na-eme ya.
Ọ ka na-arụ ọrụ ya n'ụlọọrụ Shamshad TV agbanyeghi mmegide na mmachi a machiri ụmụnwaanyị na-arụ n'ụlọ mgbasaozi.
Ọ gbaala ọtụtụ ndị otu Taliban ajụjụọnụ mana ọ bụghị ihe niile ka o nwereike ịjụ ha, o nwekwaghiike ịjụ ha ese maka agwa ha.
Ahmadzai gụrụ ihe gbasara iwu na ndọrọndọrọ mana ọ na-arụ ọrụ na mgbasaozi kamgbe afọ asaa. Ọ na-etinye uche n'agụmakwụkwọ ụmụnwaanyị nke ndị Taliban na-egbochi n'ike n'ike.
Esi Buobasa, Gana
Ọkụ azụ
Esi Buobasa bụ onye otu obodo na Gana nọ n'akụkụ osimiri a kpọrọ Fuveme. Esi Buobasa ejirila anya ya hụ kpọmkwem ihe mgbanwe ihu eluigwe nwereike ime.
A manyere ya na di ya na ụmụ ya ise ka ha kwapụ ebe mmiri na-arị elu eme na ha agaghị ebilizi n'ala ha.
Dịka onye ọkụazụ welitere isi n'obodo ya, Buobasa na ndị ọkụazụ ibe ya malitere otu na-enyere ụmụnwaanyị ọkụazụ aka na mpaghara ha dịka ide mmiri na-achọ ikpochapụ ebe ha si achụta ego.
Otu ahụ nweziri ihe ruru mmadụ iri n'ime ya ma na-ezukọ kwa izuụka ịkpa maka nsogbu ha nwere na nsogbu na-emetụta ụmụnwaanyị nọ n'azụmahịa ha, ha na-atụkọkwa ego ha ji akwalite ezinaụlọ ndị chọrọ enyemaka.
Obi na-amapụ anyị oge ọbụla ebili mmiri na-eme. Ọnwụ na-abịara anyị na agbụrụ ndị nọ n'ihu.
Esi Buobasa
Chila Kumari Burman, Mba Briten
Onye nka
Dịka onye na-arụ na mpaghaa nka dị icheiche dịka ibi akwụkwọ, ise ihe, ite uhie, itinye eserese na onyonyo, Chila Kumaru Burman na-eji aka ọrụ ya etinye ọnụ na nsogbu dịka nnochiteanya ụmụnwaanyị na omenala dị icheiche.
N'afọ a, ya bụ onye nka ahụla ka e gosiri ọrụ ya na ngosi Blackpool, mmemme ọkụ a na-eme na mba Briten kamgbe afọ 1879. Aka ọrụ Lollies in Love With Light bụ otu ihe akpụrụakpụ o tinyere ụgbọ e ji ebu ọtọbiribiri nracha 'ice cream' n'me ya nke azụmahịa 'ice cream' nne na nna ya na-eme kpaliri ya ka o mee
N'afọ 2020, Burman mekwara akpụrụakpụ ọzọ ọ kpọrọ Rembering a Brave New World nke o jiri gosi Tate nke Briter iji gosi na o nwere etu o si yite chi ndị Indịa, omenala na-eweu ewu nakw nkwalite obodo.
N'afọ gara aga, o nwetara MBE.
Paulina Chiziane, Mozambik
Ode akwụkwọ
Dịka o bipụtara akwụkwọ mbụ ya bụ 'Ballad of Love in the Wind' n'afọ 1990, Paulina Chiziane bụụrụ nwaanyị mbụ bipụtara akwụkwọ 'novel' na mozambique.
Dịka o tolitere na mpụga obodo Maputo bụ isi obodo Mozambique, Chiziane mụtara asụsụ Portuguese n'ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik. Ọ gụrụ akwụkwọ na ngalaba asụsụ na mahadum 'Eduardo Mondlane University', mana ọ gụchaghị.
Atụgharịala akwụkwọ ya n'asụsụ dị icheiche tinyere English, German na Spanish. Akwụkwọ ya nke ọ kpọrọ 'The First Wife: A Tale of Polygamy' ritere nturuugo José Craveirinha.
N'ọdị nso a, o ritere nturuugo 'Camões' nka so na nturuugo a kacha akwanyere ugwu n'asụsụ Portuguese.
Susanne Etti, Australia
Ọkachamara njem nlegharị anya na-adigide adigide
Ọtụ ọnye na ndi okachamara na ngalaba ihu igwe, nakwa njem nleghari anya , Susanne Etti nwere mmasị ime ka ya bụ ngalaba ọrụ bụrụ ịhe na adịgịde adịgịde
Ọru ya dika ọnye njikwa mmetuta gburugburu uwa na Intrepid Travel, ụlọ ọrụ na ahụ maka njem nleghari anya mbụ nwere ebumnuche mbeleta carbon dabere na sayensị
Etti dere akwụkwọ maka ịtụ mgbere gbasara njem ndị na achọ decarbonise nakwa isi sekpu ntị na njem nleghari anya. Ndi nkwado dika Obodo narị anọ nke ndị otu njem, ụlọ ọrụ na ndị okachanara kwuputara ọnọdụ mberede ihu igwe
Ubochi taa, anyi na ahu ndi azụmahịa na-aghota ụrụ omume ihu igwe, sịte na ịgụzọbe usọrọ eweleta mmetuta gburugburu ebe obibi
Susanne Etti
Jannatul Ferdous, Bangladesh
Onye lanahụrụ ọkụ ọgbụgba
Dịka ọ lanahụrụ ihe mberede ọkụ ọgbụgba nke metụtara pasentị 60 nke ahụ ya, Jannatul Ferdous agaala n'ihu ịbụrụ onye mmepụta ejije, ode akwụkwọ, na onye na-agba mbọ maka ọdịmma ndị nwere nkwarụ.
Ọ bụ ya hibere otu 'Voice and Views' bụ otu na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ, ndị na-alụ ọgụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị ndị lanahụrụ ọkụ ọgbụgba.
Ndị enyi na ndị ezinụlọ ya ma ya dịka Ivy. O meela onyonyo nta ise ma bipụtakwa akwụkwọ atọ, dịka o ji onyinye ịkọ akụkọ ya wee na-akwalite ọdịmma ndị nwere nkwarụ.
Ferdous gụrụ akwụkwọ nke ọma, nzere agụmakwụkwọ ya gụnyere MA na ngalaba 'English Literature, nakwa nzere na ngalaba 'Development Studies'.
Licia Fertz, Itali
Onye na-eme ihe ngosi nakwa onye ụwa niile na-eṅomi
Ọ bụghị ndị dị afọ 93 nwereike ịsị na ha nwere ndị karịrị mmadụ 235,000 na-eso ha n'igwe Instagram, mana onye kachara na mba Italy na-egosi ndị mmadụ agwa ọma ha ga-eṅomi, ihe a bụ mbido ya .
Licia Fertz hụrụ Agha Mba ụwa nke abụọ, nọrọkwa hụ ọnwụ nwa Ada ya dị afọ 28 nakwa dị ya nke mbụ.
Mana mgbe nwanwa ya meperela ya akara n'igwe Instagram ya ka obi dị ya mma, uwe ọma ya nakwa ọchị ya mere ka ọ bụ onye a na-achọ na soshịal midịa.
O dere akwụkwọ aka onwe ya makwa seekwara ndị ntaakụkọ Rolling Stone foto ebe ọ gbara ọtọ ndị n'afọ 89.
Ọ bụ nwaanyị kwenyere na mmadụ kwesịrị ina-eme ire nagbanyeghị afọ ole onye dị, kwenyekwa n'ikikere dịịrị ụmụnwaanyị nakwa ikikere ndị LGBTQ+ makwa akwadokwa uru dị na ikwanye anụ ahụ mmadụ makwa gbanwee etu anyị ji ahụ anụ ahụ ndị okenye.
Natalia Idrisova, Tajikistan
Ọkachamara n'okwu ọkụ dị ọcha
Ụmụnwaanyị ndị bi n'ime obodo Tajikistan anaghị enwetakarị ọkụ latrik kama ha na-eji nkụ. Ọ na-achịkọta atụmatụ na-enye aka maka gburugburu, Natalia Idrisova na-achọ ụzọ tọrọ atọ e ji akụziri ụmụnwaanyị maka ihe mberede na teknụzụ ndị na-ebelata mmebi ọkụ latrịk.
Ewezuga ọzụzụ, ụlọọrụ ya na-enyekwa ndị mmadụ akụrụngwa e ji ebelata mmebi ọkụ, usekwu ndị ji anwụ esi na ite ndị ji ike esi na-ebelatara ụmụnwaanyị oge ha na-egbu ma na-akụziri ha maka nhatanha nwoke na nwaanyị n'ụlọ.
Ugbua, Idrisova na-akụziri obodo dị icheiche etu mgbanwe iheuluigwe si emetụta ndụ mmadụ ọkachasị ndị nwere nkwarụ ma na-achọpụta ụzọ ga-eme na olu ndị a na-ada ụda na mkparịtụka ndọrọndọrọ.
Ihe ndị na-eme n'ụwa niile na-adọ anyị aka na ntị na i nweghi ike ikewa ndị mmadụ na okike. Anyị enweghi igbachi okike nkịtị ghara inweta ntaramahụhụ ya.
Natalia Idrisova
Vee Kativhu, Zimbabwe/mba Briten
Content creator and YouTuber
Sịte na ọrụ ọrụrụ nkeke na McDonald's rụe na ngbe ọ wetere asambọdọ na mahadum Oxford na Harvard; njem agụm akwụkwọ ya bụ ịhe mpkarịte nmọụ dịalụ ndị nmadụ na mba ụwa
Mgbe ọ nọ na mahadum, o mepere akara YouTube ojị na ekesaa ịhe ọmara dị ka nwata akwụkwọ sitere na ọnọdụ mmekọrịta ọha na eze dị ala, ma na nyekwa ndị ọzọ dị ka ya ndụmọdụ.
Kemgbe ahụ, Kativhu wepụtala Empowered by Vee, nke ọgị na akpo oku ka agụmakwụkwọ mahadum buru ịhe dịrị ụmụ akwụkwọ ndị na enweghị egọ nfe
odere akwụkwọ ndị nmadụ ga ejị nyere onwe ha aka. Mana ubua, ọna agu akwụkwọ ịbụ onye ọka nmụta (PhD) na ngaraba ochịchị na agumakwụkwọ
Huda Kayttan, Amerịka
Onye malitere ahịa ịchọmma
Ndị mbịarambịara si mba Irak bịa Amerịka mụrụ Huda Kattan. O toro n'Oklahoma maa jụ ịrụ ọrụ oyibo ndị ibe ya na-arụ ịchụ ihe bụ mmasị ya n'ụwa bị ịchọmma.
Oge ọ mụcharaọrụ n'ụlọakwụkwọ ịchọmma welitere isi na Los Anjelis, ọ malitere inweta ọrụ n'aka ndị a ma ama, gụnyere ezinaụlọ nd eze dị icheiche si na mpaghara etiti ọwụwa anyanwụ ụwa.
Ọ bụrụla one a kacha eso ngwaahịa ọchọmma ya n'Instagram, ndị na-eso ya ruru mmadụ nde 50.
Kattan malitere ngwaahịa ịchọmma ya Huda Beauty n'afọ 2013 site na-iwepụta nku a na-etinye n'elu anya. Ugbua, azụmahịa ya eruola ijeri dọla ma gụnyere ngwaahịa ruru 140 a na-ere n'ụlọahịa ruru 1,500 n'ụwa niile.
Sophia Kianni, US
Nwata akwụkwọ na onye na-achọ ọdịmma mmadụ
Dịka ya na ndị ezinaụlọ ya n'Iran nwechara mkparịtaụka, Sophia Kianni chọpụtara na o nweghi akụkọ maọbụ ihe ọbụla gbasara mgbanwe ihu igwe n'asụsụ ha nke mere ka ọ malite ịtụgharị okwu n'asụsụ ha.
O mechara ghọrọ ọrụ dị ukwu mgbe ọ hibere Climate Cardinal bụ otu ndị ntorọbịa na-achọ ịgbanwe ihe gbasara mgbanwe ihu igwe n'asịsị dị icheiche n'ụwa iji mee ka o ruo ndị anaghị asụ Bekee aka.
Ka o si kwụrụ ugbua, o nwere ụmụ akwụkwọ 10,00o na mba ruru 80. Ha atụgharịala ihe gbasara mgbanwe ihu igwe n'ihe karịrị asụsụ 100.
uche Kianni bụ iwepu ntaramahụhụ nke asụsụ nwereike iweta n'ịghọta okwu sayensị.
Ndị ntorọbịa na-azọ ikike onwe arụọla ma kwado atụmatụ iji mee ihe maka mgbanwe ihu igwe, kpokọba puku kwuru puku ịme ngagharị iwe megide ngwuputa mmanụ agbịdi ma tụkọọ nde kwuru nde dọlla iji kwado ihe metụtara mgbanwe ihu igwe. Nsogbu dị n'ụwa karịrị anyị ịzo onwe anyị n'ihi ịbụ ntorọbịa maọbụ amaghị ihe.
Sophia Kianni
Arati Kumar-Rao, India
Oseefoto
Ebe ọ na-arụ ọrụ na mpaghara ndida Eshia, oseefoto, odeeakwụkwọ nakwa onye nyochapụta Arati Kumar-Rao na-edekọ mgbanwe ihu igwe na-eme n'ụwa.
Ọ na-edekọ etu ụkọ mmiri, mmebi ebe obibi anụmanụ nakwa iji ala eme ụlọ nrụpụta si ekpochapụ obere anụmanụ n'ụwa ma na-eme ka ala mmadụ nwereike ibi na ya na-agbada.
Kumar-Rao emmela njem n'ala India kemgbe afọ iri , ebe akụkọ ya ndị dị mkpa si egosiputa etu mmebi mbaraezi si emetụta ndụ ndị mmadụ nakwa anụmanụ.
Akwụkwọ ya, Marginlands: India's Landscapes on the Brink, na-ekwu maka ahụmihe ndị bi n'ebe mmebi a kachasị njọ na India.
Na mbido nsogbu mgbanwe ihu igwe bụ ofufu ihe jikọrọ anyị na ala, mmiri na ikuku. Ọ dị mkpa na anyị weghachiri ya bụ njikọ.
Arati Kumar-Rao
Sarah Ott, US
Onye nkuzi
Mgbe ọ na-eto na mba Amerịka na steeti Florida, dịka ọdachi 9/11 mechara, onye nkuzi Sarah Ott kwuru na akụkọ ụgha na-efegharị ebe niile.
N'agbanyeghi na ọ gụrụ Sayensi, o were ogologo oge tupu o kweta na mgbanwe ihu igwe na-eme n'ezie.
Ịkweta na ọ nwetaghị ya bụ ihe mbụ o mere na njem ịchọpụta eziokwu. Njem a emeela ya ka ọ bụrụ onye nnọchiteanya mgbanwe ihu igwe n'ebe akpọrọ National Center for Science Education.
Ugbua, o bi na Georgia ebe o ji mgbanwe ihu igwe akuzi ndị ụmụakwụkwọ ya sayensị ma mee mkpọtu maka nsogbu mbara igwe n'obodo ha.
Agbanyeghi na mgbanwe ihueluigwe bụ ihe 'a nyụkọọ mamịrị ọnụ', anyị enweghi ike ime ya n'aka anyị. Ịchụsọ ya dịka ugbo. A naghị akọ ya oge niile. A na-ezu ike. Kwanyere oge nke gị ugwu.
Sarah Ott
Jestsuma Tenzin Palmo, India
Bhksuni Buddhist nun
Jetsunma Tenzin Palmo amụrụ n'afo 1940,kutere Buddhism mgbe ọ dị na agbọọ
Ka ọ gbara afo ịri abụọ, ọ gara India wee bụrụ otu nye n'umunwanyi isisi na-ndida anyawu echiri echichi ''Tibetan Buddhiist Monastic''
Ikwalite umunwanyi, Tenzin Palmo kewapụtara Dongyn Ling Nunnery dị na Himachal Pradesh India,nke u ụlọ nyere umuwanyị 120 na-eme ihe ụka.
Ihe eji mara ya bụ onye bịri afọ iri na abụọ n'ime ọgba dị n'ime obodo Himalayas.N'afo 2008,e chiriri ya echichi ''jetsumma'' nke pụtara onyeisi di umeala.
Lala Pasquinelli, Ajentina
Onye ọrụ nka
Na afọ 2015, Lala Pasquinelli gụzọrọ ọtu Women Who Were Not On a (akụkọ ntakụkọ) Cover ọjịrị na-ajụ ajụjụ maka mpkapu ana akpapu umunwanyị ndị nọ na ngalaba ngbasa ozi nakwa omenala ndị a ma ama.
Ọrụ ahu ka ọjị na-akpọ ụmụ nwanyị ka ha nyochaa akụkọ gbasara ahụ ha, gụnyere okwu ndị dị ka ịka nká na erịmerị. Ozị ha ugbua bụ #HermanaSoltaLaPanza ebe ha gi akọ akụkọ gbasara ndị mmadụ niile
Onye ọka iwu, onye na-ede uri, nwanyị nwanyị nwere mmasị nwanyị na onye na-akwado nwanyị, Pasquinelli na-arụ ọrụ iji kpochapụ echiche nwanyị mara mma nke ọ na-ekwu na ọ bụ "ndị klaasị, nwoke na nwanyị na ịkpa ókè agbụrụ" ma na-eme ka ahaghị nhata nwoke na nwanyị.
Matcha Phorn-in, Tailand
Onye mgbasaozi na LGBTQ+
O bi na Tailand n'oke ala ha na Myanmar, akụkụ ebe mgbanwe ihueluigwe na ọgbaghara na-emetụta, Matcha Phorn-in etinyela uchu na-arụ ọrụ na ileta ndị nta.
O malitere atụmatụ Sangsan Anakot Yawachon Development Project bụ ụlọọrụ e ji akụzi ma na-akwalite puku kwuru puku ụmụnwaanyị ndị na-enweghi ala na ndị so n'otu ndị na-edina ụdị mmadụ ibe ha.
Dịka agbụrụ dị nta na nwaanyị na-edina nwaanyị ibe ya, Matcha phorn-in na-agbasi mbọ ike ịkwụsị mmekpa ahụ a na-emekpa ụmụnwaanyị ebe ọ na-ekwusikwa okwu ike n;okwu gbasara ikpe mkwụmọtọ gbasara ndị mgbanwe ihueluigwe chụpụrụ n'ala ha.
A gaghị enwekwa ezi usoro ga-ebi nsogbu mgbanwe ihueluigwe ma ọ bụrụ na ndị nwee ala na ụmụnwaanyị na ndị na-edina ụdịrị mmadụ ibe ha esoghi na ya.
Matcha Phorn-in
Carolina Diaz Pimentel, Peru
Onye ntaakụkọ
Oge e mechara chọpụta na o nwere 'autism' oge ọ gamilara afọ 20, Carolina Diaz Pimentel meere onwe ya achịcha Bekee iji mee emume na ya amarala na ya na-arịa ọra ụbụrụ
Ugbua ọ nọ n'afọ 30 ya ma na-enwe aṅụrị dịka onye nwere ọrịa ụbụrụ, ọ na-arụ ọrụ dịka onye ntaakụkọ na-elekwasị anya na ndị nwere ọrịa ụbụrụ.
Diaz na-arụka ọrụ ịkwụsị ịkpaoke a na-eme megide ndị nwere ọrịa ụbụrụ isi. Ọ malitela ọtụtụ atụmatụ iji mee nkwalite maka ọrịa ụbụrụisi dị icheiche dịka; 'Mas Que Bipolar (ihe karịrị 'bipolar') nke a na-akpọkwa 'Peruvian Neurodivergent Coalition nakwa Proyecto Atipico (Project Atypical).
Ọ bụ onye ritere nturuugo na ego Pulitzer nakwa onye ngụkọ Rosalynn Carter.
Daria Serenko, Rọshịa
Onye na-ede abụ
Onye edemede na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Daria Serenko bụ otu n'ime ọtụtụ ndị nhazi nke Feminist Anti-War resistance - ọtụ na ewe ịwe maka, ma megide Russia wakporo Ukraine.
N'ime afọ itoolu gara aga, ọ na-ede banyere ime ihe ike nwoke na nwanyị na Russia, ma dee akwụkwọ abụọ nke nwanyị na mgbochi agha.
Serenko bụkwa onye mepụtara atụmatụ nka Quiet Pickett, nke ọ na-eyi kaadị e dere ozi iji tinye ndị mmadụ aka n'okwu ụfọdụ.
Izu uka abụọ tupu Russia amalite ịwakpo Ukraine, Ndi ochịchị nwụchiri Serenko, bọ ya ebubo na ọ na-agbasa ozi "ntịsa ọgbọdọ". N'oge na-adịghị ka ọ kwagara Georgia na ugbu a họpụtara ya "onye ala ọzọ" site Russia ọchịchị.
Kera Sherwood-O'Regan, Nu Ziland
Onye na-achụ nnwereonwe nakwa onye na-ekwuchitere ndị nwere nkwarụ
Onye agbụrụ Kai Tahu nakwa onye nwere nkwarụ nakwa ọkachamara gbasara ihueluigwe, Kera Sherwood-O'Regan si Te Waipounamu nke mpaghara ndịda anyanwụ Nu Ziland.
O so na ndụ malitere atụmatụ Activate, bụ otu na-eleba anya na-inweta ikpe mkwụmọtọ n'okwu banyere mgbanwe ihueluigwe.
Ihe ọ na-eme gbara mgbọrọgwụ n'ime omenala ndị Maori na ndị nna nna ha, bụ nke a na-akụchapụ akụchapụ na mgbasaozi gbasara mgbanwe ihueluigwe.
Sherwood-O'Regan na ndị mịnịsịta dị icheiche amataa, ndị ọrụ na ndị ọzọ na-egosipụta etu mgbanwe ihueluigwe si emetụta obodo dị icheiche ebe ha na-ekwukwa ka a na-achọpụta ikike dịịrị ndị nwe ala.
Anyị na-ajụ ndị si si abịa akụzi ihe gbasara ala anyị, anyị na-ewere oche n'aka anyị na-edu obodo anyị - ọ na-arụkwa ọrụ. Echere m na ọtụtụ ndị mmadụ na-achọpụtazi na inye ndị nwe ala ikike ka mma n'okwu gbasara mgbanwe ihueluigwe.
Kera Sherwood-O'Regan
Sagarika Sriram, United Arab Emirates
Onye nkuzi na onye ndụmọdụ ihu igwe
Onye ntorọbịa Sagarika Sriram na-alụ ọgụ ka akuzie mgbanwe ihu igwe n'ụlọakwụkwọ
Iji ọzụzụ coding ya, o hibere ebe nkuzi n'ịntanetị akpọrọ Kids4abetterworld iji kuziri ụmụaka na mba ụwa niile ma nyere ha aka hibe ọrụ nchekwa mbaraezi n'obodo ha
O ji nkuzi ọ na-emere ụmụaka ibe ya n'ịnatentị nakwa n'ihe gbasara mgbanwe ihu igwe na etu ha ga-esi mee ya ọfụma akwado ọrụ ọ na-arụ.
Gụnyere akwụkwọ A-levels ọ na-agụ, Sriram so n'otu ụmụaka na-enye kọmịtị ikike ruuru ụmụaka na ngalaba UN ndụmọdụ ebe ọ na-ekwu maka ikike ruru mbaraezi.
Ọ bụghị oge itimkpu kama oge ịrụ ọrụ nke mere na a ga-akuziri ụmụaka niile etu ha ga-esi bi ndụ chekwara mbaraezi ha ma weta mgbanwe anyị chọrọ ịhụ n'ụwa anyị.
Sagarika Sriram
Clara Elizabeth Fragoso Ugarte, Megziko
Ọkwọ ụgbọala gwongworo
Ọkwọ ụgbọala gwongworo Clara Elizabeth Fragoso Ugarte enyela ndụ ya ruru afọ 17 n'ime ọrụ ụmụnwoke juru n'ime ya. O meela njem gaa ogologo mba Megziko n'ụzọ jọgburu onwe ya na mba ha.
Fragoso Ugarte bụ onye Durango kpọmkwem lụrụ dị n'afọ 17 ma nwee ụmụaka anọ na ụmụụmụ asaa.
Dịka nwaanyị na-akwọ ụgbọala gwongworo, ọ na-ebi ndụ ya n'okporo ụzọ na-ebu ngwaahịa esi mba Megziko gaa Amerịka.
Ọ na-akụzikwa ndị ọkwọ ụgbọala ndị ntoroọbịa ma na-agbambọ ikpalite ụmụnwaanyị ka ha banye n'ọrụ ya iji nweta nhatanha n'etiti nwoke na nwaanyị n'ọrụ ịkwọ ụgbọala.
Louise Mabulo, Filipine
Onye ọrụ ugbo na o ji ego achụ ego
N'afọ 2016, Typhoon Nock-Ten bibiri ọtụtụ ebe na Camarines Sur na mba Filipin ma mebie ihe ruru pasentị 80 bụ ugbo ndị mmadụ.
Louise Mabulo ekweghi ka mbibi ahụ gbochie ya ma malite otu The Cacao Project ka o mechara. Otu ahụ na-ele anya igbanwe etu e si akọpụta nri site na nkwalite atụmatụ 'agroforestry'.
Mabulo na-akwalite ndị ọrụ ugbo, na-akwatu usoro e si akọ nri ndị na-adịghị mma, ma na-akwalite usoro isi n'ala kọpụta ihe na-enyeghachi ndị na-akọpụta nri ikike ha.
ọ na-adụ otu mbaụwa na-ewepụta atụmatụ maka mgbanwe ihueluigwe ọdụ ebe ọ na-esetipu olu na-ebupu akụkọ ndị si n'ime obodo. otu mbaụwa na-ahụ maka gburugburu bụ united Nations Environment Programme enyere ya ntuurugo dịka onye ntoroọbịa na-echekwa ala.
Ana m enwe olileanya ebe m mara na otu dị icheiche na mbaụwa bụ ndị dịka m na-ewulite ha, na-akwalite ọdịnihu ebe a ga-enwe ala akwụkwọ ndụ ma na-ejikọ ndị mmadụ ọnụ nakwa ebe nri ga-adị mfe inweta ma akụnaụba ụwa ga-abụ ndị o ruru ga na-enweta ya.
Louise Mabulo
Oksana Zabuzhko, Yukren
Odeakwụkwọ
Oksana Zabuzhko edeela akwụkwọ karịrị 20, tinyere akụkọ a rọrọ afọ abụọ akụkọ mere eme. O so na ndị a na-ahụta dịka ndị kacha bụrụ ọkaibe n'ide akwụkwọ na ịma akwụkwọ na mba Ukraine.
Na mba ụwa, a ma ya maka ọrụ ya ndị dịka 'Field Work in Ukranian Sex, nakwa 'The Museum of Abandoned Secrets'.
Ọ gụrụ akwụkwọ na ngalaba Philosophy n'ụlọ akwụkwọ 'Shevchenko University' dị na Kyiv, ma nwekaa nzere 'doctorate' na ngalaba 'Philosophy of Arts'.
Atụgharịala akwụkwọ ya n'asụsụ karịrị 20, o nwetakwala ọtụtụ nturuugo ma n'ụlọ ma n'ofesi, nke gụnyere 'Angelus Cntral European Literary Prize', Shevchenko National Prize na French National Order of the Legion of Honour.
Marijeta mojasevic, Montenegro
Onye na-alụchitere ndị nwere nkwarụ
Dịka onye gbapụtara na ọrịa mkpọnwụ ahụ ugboro abụọ oge ọ bụ nwata, ndụMarijeta Mojasevic gbanwere nke ukwuu.
Dịka onye nwere nkwarụ n'onwe ya, nke nị dị ya n'afụ ruo ugbua, Mojasevic na-arụ ọrụ ịka onye na-enye ndụmọdụ gbasara ndị nwere nkwarụ.
Ọ na-eji olu ya arụnye ndị mmadụ aka n'anya maka ndị nwere nkwarụ sitere n'ụbọrụ.
Ọ malitere atụmatụ ọ kpọrọ Live With Disability ebe o na-eji ihe niile ọ gabigara ekwu okwu megide ikpe na-ezigbi ezi.
Ọ bụ onye nnọchiteanya OneNeurology, atụmatụ na-elebe anya ime ka okwu gbasara nkwarụ metụtara akwara ụbụrụ ka ọ bụrụ okwu gbasara ọha.
Ejije na Egwuregwu
Dayeon Lee , Saụt Koria
Onye mgbasaozi nke Kpop4Planet
Site na Kpop4Planet, Dayeon Lee na-ekpokọ ndị nso K-pop niile na mba ụwa ịme ihe maka mgbanwe ihu igwe.
Kemgbe amalitere ya n'afọ 2021, otu ahụ agwaala ọtụtụ ndị a ma ama n'ihe gbasara ihe onyonyo nakwa egwu na mba Saụt Koria ha mee ihe maka mgbanwe ihu igwe.
Otu ahụ ekwuputala okwu maka etu ngwa egwu si emebi mbara igwe nke mere ka ụfọdụ ndị a ma ama malite iji ngwa egwu teknụzụ.
Dayeon Lee apụọla na naanị egwu ugbua banyezie n'ịchetara ndị na-ere ngwa mma na-ejikarị ndị egwu Koria ire akwa ha ịcheta nkwa ha kwere maka ihu igwe
Ị na-akwụdoro ihe dị mma, adala mba rue mgbe ịhụrụ mgbanwe. Anyị egosila nke a kwamgbe kwamgbe, anyị ga-agakwa n'ihu na-eme nke a iji lụsọ mgbanwe ihu igwe agha.
Dayeon Lee
Aitana Bonmatí, Spen
Ogbaa Bọọlụ
Ogba Bọọlụ Aitana Bonmati na agbara ndi Barcelona turu ugọ dịka onye kacha agba etịtị na Spanish League na Champions League na afọ a.
Ọ bụ ngbe ana asụmpi mba ụwa ka ejịrị mara ya maka ọtu ọsịrị yere ndị Spain aka wete nmerị, yekwa gọọlụ atọ ma tụrụ ụgọ dịka ọkacha agba bọọlụ na ya bụ asụmkpị. Odị afọ ịrị abụọ na ịse. Ọtụrụ ụgọ Ballon d'Or ma bụrụ ọcha agba gbọọlụ nke ndi Uefa na afọ ahu
Bonmati adịghị atụ ujọ ikwụ ọkwụ gbasara Umu Nwanyi na agba bọọlu ma ngbe ọnọ na ama egwụrụegwu ma ọbu ngbe ọnọ na ikpọ ndị nmadu.
Ụgọ ha tụrụ na Asụmpị mba ụwa biala nwee ịhe mkpuchị bịala wụọ ewụ ngbe akụkọ kwụrụ na Onye Ịsị Ndị Spanish Football federation bu Luis Rubiales susulu ogba bọọlụ Jenni Hermoso ọnụ. Bonmati jiri ngbe ọna ekwu ọkwụ na Uefa nwere gọsị nkwadọ ebe nwada Jenni Hermoso nakwa ndị ọzọ bụ ndị ana akwa emọ
Antinisca Cenci, Itali
Onye egwruegwu inyinya
Oge Antinisca malitere egwuregwu inyinya oge ọ nọ n'afọ 30, ọ maghị na afọ iri na-abịa, ọ ga eso otu ndị na-eme egwuregwu jimnastiks na-elu inyinya mee njem.
Onye si na La Fenice na mpaghara ugwu Itali, ndụ ya adịchaghi mfe. A gwara nne ya na Cenci agaghị "adị ndụ n'oyi" ka o nwechara nsogbu oge ọ na-amụ ya.
Cenci malitere egwuregwu inyinya dịka atụmatụ nke otu ANFFAS malitere (National Association for Families and People with Disabilities) na otu egwuregwu inyinya La Fenice.
Ya na Anna Cavallaro na Nelson Vidoni a ma ama na mbaụwa na-eme egwuregwu inyinya na-emekozi ọzụzụ.
Andreza Delgado, Brazil
Onye nchịkọta ọrụ nka nakwa onye na-elekọta ọmenala
Sao Paulo, Andreza Delgado so gụzọ PerifaCon ebe ha sịrị na agba mbọ ka ha gọsịpụta ịhe nmụta ha na ọgbakọ ndị edemede ịkpa amụ
ọgbakọ ahụ bu maka ndị edemede na ịkpa amụ, ndi na-ese ihe, na ndi ọzọ na eme ịhe ejịje na ọdịnala
Na afọ 2023, madu karịrị puku iri na ise biala mmeme PerifaCon ebe anọ gọsịpụta akwukwọ ikpa amụ, ihe onyọyọ egwụregwụ na ihe ndị ozor
Delgado bu onye amama jiri akala ya na Youtube nakwa Podcast nwere na egọsị ọdi naala ndị Brazil; na ịhe ọnyọyọ ya, ọjị ya na akwalite aka olu ndi ọjịị mba ahu bu ndị na ese ịhe.
Desak Made Rita Kusuma Dewi, Indoneshia
O ji ọsọ arị elu
Oge ọ nọ n'ụlọakwụkwọ praịmarị na Bali ka a kpọrọ Desak Made Rita Kusuma Dewi ka ọ ga rịa mgbidi ebe o malitere ịhụ ya 'anya.
Ọ wufere ọtụtụ asọmpi oge ọ dị na ntoroọbịa mana ya bụ "ezenwaanyị ọrị elu n'Indoneshia" arịala ya bụ elu n'afọ a dịka o ritere ọlaedo n'asọmpi IFCS Climbing World Championship nke afọ 2023 ebe o ji nkeji 6.49 rịa elu nke mmadụ ọzọ na-emebeghi.
Mmeri a nyere ya akwụkwọ ọ ga-eji gaa njem Olimpiks na Paris afọ 2024ebe a ga-enwe asọmpi iji ọsọ arị elu nkembụ iche n'onwe ya.
Ọrị elu a nwereike ịkụwara mba Indoneshia ndekọ maka na ha enwetaala nturuụgọ naanị na badminton, ibu igwe na ịgba ụta.
America Ferrera, Amerịka
Omeeiheonyonyo
Onye a ma ama n'ime ihe onyonyo, ọ na-ahazi onyonyo ma na-arụpụta ya. A ma Ferrera n'ụfọdụ ọnọdụ ukwu gụnyere Barbiem Real Women Have Curves nakwa Ugly Betty.
Ọ ghọrọ onye kachasị dị obere ritere nturugo Emmy dịka omeiheonyonyo nwaanyị n'emume Ugly Betty - nakwa onye Latina mbụ. O teela aka ọ na-azọ ikike ruru onye, ọ bụ okwulọra n'ihe gbasara ikike ruru ụmụnwaanyị nakwa inye ha ohere n'ihe onyonyo.
Nwa nwaanyị ndị mbịara mbịara, ọ na-eme mkpọtụ maka ndozi ọnọdụ obibi ndị Latina na mba Amerịka site n'ụlọọrụ enyemaka ya Poderistas
Anne Grall, Frans
Onye ọkpaọchị
Otu ịkpaọchị Greenwashing Comedy Club bụ ebe a na-eji nsogbu dịka agụụ, mgbanwe ihueluigwe, ikike ndị na-edịna ụdị ha, ndị nwere nkwarụ na okwu nhatanha n'etiti nwoke na nwaanyị aka ọchị.
Onye malitere ya bụ ọkpaọchị Anne Grall bụ onye kwenyere na site n'okwu ịkpaọchịm mmadụ nwereike ikụnye mkpụrụ mgbanwe n'ime uche ndị mmadụ ma gbanwee agwa ha.
N'ime obodo ọ bụ ihe ejije ka ndị mmadụ na-achụgharị, ebe ọ bụ okwu e biri nke nke ka ndị mmadụ na-aghọta, Grall kwenyere na ịkpaọchị nke na-egosi ihe karịa etu ọ dị nwereike ịbụ ezi ụzọ iji gbasaa ozi banyere mgbanwe ihueluigwe.
Ụdịrị agmanihu otu ịkpaọchị Greenwashing Comedu Club wetara bụ ihe na-akpali mmụọ maka na o gosiri naụbọchị taa, ọtụtụ ndị mmadụ na-etinye echiche n'okwu banyere mgbanwe ihueluigwe ma ha chọrọ igbakọ ọnụ jiri ọchị ma hapụ ebe ahụ dịrị njikere ime ihe banyere ihe ha nụrụ.
Anne Grall
Georgia Harrison, Mba Briten
TV personality
Mgbe Georgia Harrison ghọrọ onye e metọrọ n'ụzọ ihe oyiyi, o kpebiri iji akụkọ ya nyere aka n'ịlụso ime ihe ike megide ụmụ nwanyị ma gbanwee ụzọ UK si ele nkwenye.
Onye Amama na ịhe Onyọyọ a mara maka ihe ngosi ya na ihe ngosi dị ka Love Island na The Only Way bụ Essex, duziri mkpọsa weta mmezigharị na ụgwọ nchekwa ịntanetị nke UK iji mee mpụ mmetọ ihe onyonyo, nke a na-akpọkwa "akpali agụụ mmekọahụ". mfe ikpe.
Harrison na-akpọ ugbu a maka nyiwe ịntanetị ka ọ ga-eche nsonaazụ siri ike ihu maka ịweta onyonyo ma ọ bụ eserese emere ma ọ bụ kesaa na-enweghị nkwenye.
Harmanpreet Kaur, India
Onye egwuregwu Cricket
N'afọ a, Harmanpreet Kaur bụụrụ nwaanyị mba India mbụ n'ime mmadụ ise a kpọpụtara dịka ndị ritere nturuugo ọkaibe n'egwuregwu Cricket n'afọ a.
Ọ bụ ya bụ kaptịn nke otu cricket ụmụnwaanyị nke India, ma bụrụkwa onye nwetarala ọtụtụ akara ma n'ụlọ ma n'ofesi. N'afọ gara aga o duuru ndị otu ya rite ọla ọcha n'asọmpi egwuregwu 'Commonwealth.
N'asọmpi cricket nke India, o duuru otu Mumbai Indians wee bulie iko nke mbụ nke asọmpi 'Premier League' ụmụnwaanyị n'ọnwa Maachị.
Otu n'ime oge kacha elu na ndụ ya dịka onye egwuregwu bụ n'afọ 2017 oge o nwetara akara 171 runs na bọọlụ 115 n'asọmpi osote ikpeazụ nke ha na Australia, nke nyeere ha aka ruo agba nke ikpeazụ.
Justina Miles, Amerịka
Omenka dara ogbi
N'emume Super Bowl LVII, bụ emume egwuregwu mba ụwa na-elekarị, Justin Miles mere ihe emebeghi mbụ.
Omenka ahụ dara ogbi malitere iwu ewu mgbd ọ jiri asụsụ aka gụọ egwu otiegwu a ma ama bụ Rihanna.
Nke a mere ya nwaanyị mbụ dara ogbi ji asụsụ American Sign Language gụ egwu n'emume okara mbụ nke mmemme egwuregwu Super Bowl. Egwu ọzọ o ji asụsụ ahụ gụ bụ Lift Every Voice a ma dịka egwu njirimara ndị ojii bụkwa mbụ ya n'emumue ahụ.
Miles chọrọ ka ụmụ ụwa hụ na ndị dara ogbi ma eme ihe ndị ọzọ bara uru n'ụwa nakwa ọ chọrọ imepe ụlọọgwụ nke ya ma zụọ ndị nleta dara ogbi.
Dia Mirza, Ịndịa
Onye na-eme ejije
Ọ bụghị naanị na Dia Mirza na-eme ejije eritela ọtụtụ nturuugo maka onyonyo ndị o merela na mba Ịndịa, o sokwa n'ọrụ enyemaka dị icheiche gbasara gburugburu na ndị mmadụ.
Dịka onye nnọchiteanya udo nke otu mbaụwa United Nations n'okwu gbasara gburugburu, Mirza na-agbasa ozi n'okwu gbasara gburugburu na mgbanwe ihu eluigwe, ikuku dị ọcha na nchekwa anụmanụ n'ime ọhịa.
Ọ malitere ihe a kpọrọ One India Stories, ụlọọrụ na-eme ejije ịkọ akụkọ gbara ọkpụrụkpụ ga-eme gị ka n'okwu ya "kwụsị chee uche".
Ọ bụkwa onye nnọchiteanya atụmatụ Save the Children, ụlọọrụ mbaụwa na-enye ego maka nchekwa ụmụanụmanụ, ọ nọkwa n'isi oche otu Sactuary Nature Foundation.
Zandhile Ndhlovu, Saụt Afrịka
Onye nkuzi igwummiri
Dịka nwaanyị ojii mbụ na-akuziri ndị mmadụ igwu mmiri n'osimiri, Zandile Ndhlovu chọrọ ị mee ka ịga oke osimiri rue mmadụ niile aka.
Ọ malitere ụlọorụ Black Mermaid nke nwere olileanya ịnye ndị ntorọbịa nakwa ndị ime obodo ohere iji oke osimiri na mpaghara ya mee ihe bara uru dịka ịrụ ọrụ, ịme egwuregwu na ndị ọzọ.
Ndhlovu bụ onye nyocha osimiri, onye odeakụkọ na omeihonyonyo. O ji mmaramihe ndị a iji nyere ndị akpọrọ 'Ocean Guardians' bụ ndị na-amụta maka oke osimiri nakwa ilekọta ya na mbaraezi ha anya aka.
Echiche maka ụmụ ntorọbịa na-amalite iweta mgbanwe n'obodo na-enye m olileanya n'ihe gbasara mgbanwe ihu igwe.
Zandhile Ndhlovu
Alice Oseman, Amerịka
Ode akwụkwọ ejije
Onye odeakwụkwọ ejije riterela ọtụtụ nturuugo, Alice Oseman bụ onye kepụtara akwụkwọ bụ ọkaibe maka ndị ntorobịa a kpọrọ 'Heartsopper'. Ọ tụgharịkwara akụkọ 'LGBTQ+ coming-of-age, tinye ya n'onyonyo e bipụtara n'ọbaozi 'Netflix' bụ nke rutere nturuugo Emmy.
Oseman dere ejije ahụ niile ma sorokwa na ngalaba niile nke ejije ahụ site n'ịchọta ndị sonyere n'ejije ahụ ruo n'egwu e jiri mee ya.
Ọ bụkwa ya dere ọtụtụ akwụkwọ maka ndị ntorobịa nke gụnyere 'Radio Silence', Loveless, na Solitaire, bụ nke o bipụtara oge ọ dị naanị afọ 19.
Akwụkwọ ya eritela ọtụtụ nturuugo, ma sorokwa na ndị e tinyere aha ya maka ọtụtụ nturuugo dịka YA Book Prize, 'Inky Awards', 'Carnegie Medal', na 'Goodreads Choice Awards'.
Paramida, Jamịnị
Ọkpọegwu na onye na-ahazi egwu
Tupu ngagharịiwe amalite n'Ịran n'afọ gara aga, DJ Paramida na-enupu isi nye omenaala niile e tinyere ụmụnwaanyị ndị si Iran.
O bi na Belin ugbua, mana Paramida chọpụtara na egwu n na ịgba egwu na-amasị ya nke ukwuu oge o bi n'etiti Frakfọt na Tehren dịka nwata nwaanyị na-etolite etolite.
Ihe na-akpalite ya bụ egwu ndị agụmagụ ọdịnala, ụlọọrụ egwu ya ọ kpọrọ Love On The Rocks na-akwalite ịgba egwu ndị anabataghị n'omenala.
Dịka onye bi na Berghain Panorama na Belin, ọ bụrụla ọkpọegwu a ma ama na mbaụwa a na-achọkwa achọ na onye nhazi egwu na-ewu ewu. O ji akaọrụ ya alụ ọgụ megide ịkpaoke dị n'etiti nwoke na nwaanyị ma na-enwe nkwuwanye okwu n'ime ogbe ọrụ ya ụmụnwoke juruputara.
Camila Pirelli, Paragua
Egwuregwu Olympic
Agbayahị na ya bu nwada bu oka ịbe na egwuregwu heptathlon, mana ịsoro na egwuregwu mgbochị 100m bu nke mere ojịrị jee Tokyo Olympics
Onye ejị aha ọtutu ya nwere mara bu Guarani Panther, na eme egwuregwu egwu na ubị, ma bulukwa onye nwere ọtutu njịrịmara, ma burukwa onye na akuzị Egwuregwu nakwa nkuzi Asusu bekee
Pirelli bu onye azulu na ezị na ulọ mara maka idozị ebe obịbị ha na obele Obodo di na ịme Paraguay, ebe ohulu mmetute nke mgbanwe ịhu ịgwe
Nwa Ada Ahu bu onye mmeri na Ecothlete, nke a putara na ona ejị ịkpo okwu egwuregu ya nwere na eme ka ndị nmadu na ekwu maka ngbawe ihu igwe ma na akwado ibelata ikuku carbon
E tọlu m na Obodo ebe ọ bu kwa ubochi ka anyị na ahu anu ọhia. Odoro m aya ma buru ịhe arịrị na umu anuọhịa na ata ahuhu maka mgbawe Elu ịgwe. Nke a mere njịrị choro ịyere ha aka
Camila Pirelli
Aziza Sbaity, Lebanon
Onye ọgba ọsọ
A na-akwanyere ya ugwu dịka "nwaanyị kacha agba ọsọ na Lebanon", dịka ọ kụwara ndekọ ọsọ 100m nke mba ahụ, Aziza Sbaity banyere n'isi akụkọ n'ọdị nso a ọzọ dịka ọ bụụrụ onye isi ojii mbụ na-eme egwuregwu ritere ọlaedo n'asọmpi 'West Asian and Arab Championships' nke afọ a.
Nne ya bụ onye Liberia ebe nna ya bụ onye Lebanon, Aziza gafere na mba Lebanon oge ọ dị afọ 11, ebe ọ gabigara nhịahụ ịkpa oke agbụrụ na mmekpa ahụ n'ihi ụcha ahụ ya.
Ime egwuregwu bụụrụ ya ụzọ nchọpụta onwe ma kwalitekwa mmụọ ya ịgba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ.
Ọ na-eji ọkwa ya na-ekwu okwu megide ịkpa oke agbụrụ na mba ahụ, ma na-akwalite nhatanha. Ya na ụlọakwụkwọ na mahadum dị icheiche na-ejikọkwa aka ọnụ iji kpalite mmụọ ndị ntorobịa.
Khine Hnin Wai, Myanmar
Onye ejije
Ọ malitere dịka onye na-eme ejije na Myanmar kamgbe afọ 25 gara aga, Khine Hnin welitere isi dịka onye a ma ama maka agwa ya dịka onye kacha pụta n'ejije San Ye. Ọ gara n'ihu bụrụ otu onye kacha eme nkeọma n'ejije n'onyonyo ndị Burma.
Mana ugbua, a maraala ya karịa maka ọrụ ebere ya. N'afọ 2014, ọ malitere ụlọọrụ Khine Hnin Wai, otu ebere na-akwado atụmatụ dịka ileta ndị na-enweghi nne enweghi nna na ụmụaka a gbaghapụrụ agbaghapụ.
Site n'ọrụ ya, ọ na-ele ihe ruru ụmụaka 100 bụ ndị nne na nna ha enweghi ike ileta ha maka ọtụtụ ihe dị icheiche.
Hnin Wai bụkwa onye nnọchiteanya maka igbochi mgbere ụmụaka.
Bianca Williams, Briten
Ọgbaọsọ
Otu ọgbaọsọ mba Europe meriri asompi ndi Commonwealth aha ya bụ Bianca Williams , bụbu onyeisi otu agbamọsọ Ireland na briten n'asompi nke Europe n'afo 2023.
Ọpụtara dịka onye nke abụọ n'asọmpị 200m nke Briten,nyere ya ọhiere ibụ otu onye n'ime ndi ọgbọsọ ga-anọchgi anya mba Briiten n'asọmpi afo afo 2023.
Ndi uweojii kwụsịrị ya na-onye otu ya bụ Ricardo Dos Santos na London ma mee ha nyocha n'ọwa julaị 2020.
Williams na Dos Santos gbara ndị uweojii akwụkwọ bo ha ebụbọ ị kpa oke agbọro.A mara mmadi abụọ n'ime ndi uweojii ịkpe ma chụọ ha na-ọrụ maka akpamaagwa n'dighi mma
Ndọrọndọrọ na Ikwuwa okwu
Christiana Figueres , Kosta Rika
Ndi nnọchịte-anya-mba nakwa ndi na ahu maka mgbanwe ihu-enuigwe
Mgbe okwu bidoro hiabaaru n'ọgbakọ UN nke emere na Copenhagen n'afo 2009,a kpọtara Christiana Figueres ka ọ dozie nsogbu ahu.
Odeakwụkwọ UN họpụtara bụ Figueres ji afo isii kepụta usoro iji hu na mba uwa nile soyenre na'usoro ihu-eniuigwe.
Ekene diri ọru ya, site n'oru ya ka mba 200 debanye akara ha n'nkwerikọta Paris nke afo 2015 nke bụ mparịtụaka iji hụ na ihu-eluigwe di otu osi kwesị.
Figueres bụ otu onye n'ndi kepụtara ''Global Optimism'' nke bụ nzụkọ na-ejikọta ndi ahia iji hụ na ha nabatara usoro nkwalite ihu-anyawụ
Mgbe ufodu, obi na agbawa m, ana m anọ n'nwụte, iwe nọ m n'obi.Ọ nweghị Ihe m nwereịke ịme mana mbochị obi ga adi m mma, ana m eji iwe ndi ahu mere ịkịkere nji emepụta ihe di mma ga-abara umu anyi nakwa umu-umu anyi ụrụ.
Christiana Figueres
Maryam Al-Khawaja, Bahrain/Denmark
Ndi na-agba mbọ maka ịke dịrị onye.
Maryam Al-Khawaja bụ onye na-agba mbo maka ike diiri onye na Danish-Bahrain, bụkwara onye amama n'ihe dị na ndọrọndọrọọchịchị nke Bahrain na-akuku Gulf .
Ọ na agbambọ ị gba ndi na emegide mmadu na-anwụ, ọkachasị ị chọ otu aga esi kpọpụta nna ya bụ Abdulhadi Al-Khawaja na-mkpọrọ, site na #FeeAlKhawaja campaign#'' nke ona-akwado. ALKhawaja bụ onye nọ n'ulo mkpọrọ n'ihi ngahiariiwe emere n'afo 2011 nke osonyere na ya.
Al-Khawaja arụọla n'ụlọoru dị ịcheịche nke ''Civicus na International service for Human Rights'' so na ha.O so n'ụlọọrụ na-akwado umunwanyi ama dịka FRIDA nakwa di ọrụ ahuịke na ahu makaike diri onye.
Shamsa Araweelo, Somalia/Briten
Ndi Otimkpụ FGM
Shamsa gbara mbọ ị hụ na akwụsịrị ị be umunwanyi ụgwu, ọ na eme nke a sịte n'ihe oyoyo ya.
Amuru Araweelo na Somalia,o bi n'Briten. Mgbe ọ gbara afo isii ebere ya ugwu,
Tinyere mmadu nderi iri isaa na-ekiri ya n'Tiktok, ihe ọ chorọ bụ ihu na onweghị onye ozi na rubeghị.
Ugbụ a ọ na enyere ndi ejieji aka, ọ na enyeku uweojii FGM London ndumodu, ọ mepeela ụlọ enyemaka nke ya.
Yasmina Benslimane, Moroko
Onye malitere Politics4Her
Nke bụ atụmatụ o ji achọ nhatanha n'etiti nwoke na nwaany, Yasmina Benslimane malitere otu Politics4Her nke na-akwalite ụmụnwaanyị isonye na ndọrọndọrọ.
Oge etu alaọmajijiji gbariri ala ha Moroko n'ọnwa Sepụtemba, Benslimane na otu ya kporo oku ka e weta akụrụngwa gbatagbata maka ileta ụmụnwaanyị.
O bipụtara akwụkwọ gosipụtara nsogbu ụmụnwaanyị na-enwe kpọmkwem nke ihe mberede ahụ ga-eme ka ọ kawanye njọ dịka ogbenye nsọ na ịlụ di na mmawanye.
Dịka onye na-akụzị, na-enye ndụmọdụ ma bụrụkwa onye nọ n'isi oche ọtụtụ ụlọọrụ na-anaghị achụ uru, ọ na-enyekwara ụmụnwaanyị aka ịkwalite ikike ịbụ ndị ndu. Ọrụ ya ewetaral ya ihe nrite otu mbaụwa UN dịka onye na-akwalite udo.
Yael Braudo-Bahat, Izrel
Ọkaiwu
Dịka onye nlekọta n'otu Women Wage Peace (WWP), Yael Braudo-Bahat na-eweta amamihe yaa gbasara iwu n'otu ndị Izrel na-achụ udo nke ihe ruru mmadụ 50,000 nọ n'ime ya.
A malitere ya n'afọ 2014 ma WWP na-achụ ụzọ mkpezi ndọrọndọrọ ọchịchị n'esemokwu dị n'etiti Palestaịn na Izrel. Ha na-agbado ụkwụ n'ihe ụmụnwaanyị nwereike ime iji kpee udo
N'ime afọ abụọ gara aga, WWP na otu ụmụnwaanyị ndị Palestaịn bụ Women of the Sun ejikọla aka ọnụ.
Braudo-Bahat kwuru na ọ bụ onye ọ na-elegara anya bụ onye ọchọudo a ma ama ma sorokwa malite otu WWP aha ya bụ Vivian Silver ka o ji ụgwọ ekele maka na Silver nyere ọtụtụ afọ ya iji kpee udo ma kwalite nghọta na nhatanha n'etiti ndị izrel na ndị Palestaịn. E gburu na mwakpondị Hamas wakporo Izrel n'abalị 7 ọnwa Oktoba afọ 2023.
Alicia Cahuiya, Ekwadọ
Onye na-alụ ọgụ maka ndị nwe ala
Dịka onye a ma ama n'ọgụ ichekwa ndị nwe ala n'ọhịa Amazọn nke ndị Ekwadọ, Alicia Cahuiya nweatara ezi mmeri n'afọ a.
Na nnukwu ntuliaka e mere n'ọnwa Ọgọstụ, ndị Ekwadọ binyere aka ịkwụ omi mmanụ agbịdị ọhụrụ n'ama Yasuni National Park - mkpebi a pụtara na ụlọọrụ mmanụ agbidi nke steeti ahụ ga-akwụsị ọrụ n'ime ebe mpaghara ahụ nwere ọtụtụ ndụ n'ime ya.
A mụrụ Cahuiya na Yasuni, ọ bụkwa onye ndu otu Waorani nation (NAWE) nke na-eme mgbasaozi maka ntuliaka ahụ kamgbe afọ iri.
Ugbua, ọ bụ onyeisi ngalaba ụmụnwaanyị n'otu ndị nwee ala n'Ekwado bụ Confeeration of Indigenous People.
Mgbanwe ihueluigwe agbanwerela anyị ọtụtụ ihe na-eme ka ide mmiri na-emebi nri anyị. Oge anyanwụ dị ọkụ karịa, ụkọ mmiri adị ọtụtụ nri anyị efuo nke na-ewetara anyị iru uju maka na mbọ niile anyị na-agba ichekwa akụrụ nri anyị abaghi uru.
Alicia Cahuiya
Amal Clooney, Briten/Lebanon
Ọkaịwu ikike dịịrị onye
Amal Clooney bụ onye ọkaiwu riterela ntuurugo maka ịlụ ọgụ ikike dịịrị onye kamgbe ihe ruru afọ iri abụọ ma na-ekwuchitere ndị na-anataghị ikpe nkwumọtọ.
Ikpe ndị o tinyerela aka dara ụda gụnyere mkpochapụ agbụrụ n'Amenia na Miyamar, mwakpo ụmụnwaanyị na Malawi na Kenya nakwa arụ megidere ndị mmadụ na Yukren.
Mmeri o nwetara na nso nso a gụnyere ịnọchite ndị na-alụ ọgụ megide ndi isi alakoba na Darfur. O nyela aka gbapụta ụfọdụ ndị ntaakụkọ na ndị ndọrọndọrọ ndị ọchịchị nchigbu kpọchiri.
Ọ bụ ọkammụta na mahadum ọkaiwu nke Kọlọmbịa ma bụrụkwa onye so malite otu Clooney Foundaton for justice nke na-enye nnọchiteanya n'efu nye ndị a na-akpagbu n'ihe ruru mba 40 n'ụwa niile.
Dehenna Davison, Mba Briten
Onye omeiwu
N'afọ 2019, bụụrụ onye mbụ na pati 'Conservative' nọchitere anya mpaghara Bishop Auckland kamgbe e kepụtara mpaghara ahụ n'afọ 1885. N'afọ 2022, ọ bụụrụ Mịnịsta na-ahụ maka nhatanha nke ọrụ ya gbadoro ụkwụ na mwulite ọdịmma obodo.
Ọ gbara arụkwaghị n'ọnwa Septemba 2023, dịka o kwupụtara na o nwere ọrịa oke isi ọwụwa a na-akpọ 'chronic migraine'.
Oge Davison dị afọ 13, e ji ọkpọ tigbuo nna ya, nke so n'ihe o ji banye ndọrọndọrọ ọchịchị. O hibere otu a kpọrọ 'All-Party Parliamentary Group on One Punch Assaults', okwu e ji mara ha bụ One Punch UK maka ikpe ziri ezi.
Ọ na-agbadokwa anya n'ịkwalite ọdịmma ọgwụgwọ ndị nwere ọrị nnukwu isi ọwụwa, man na-agbakwa mbọ maka nnyocha n'ihe gbasara ọrịa 'lobular cnacer'.
Bella Galhos, Ọwụwaanyanwụ na mba Timor
Onye ndọrọndọrọ ọchịchị
Onye mgbasa ozi na-atụghị egwu, Bella Galhos bụ ịsị sepku ntị n'ịgbanwe ọbọdọ East Timor - nke a makwaara dị ka Timor-Leste - ma tupu na mgbe mba ahụ nwetasịrị nnwere onwe na Indonesia na 2002.
N'ime ọtụtụ afọ ọ nọrọ n'ala ọzọ, ọ gara ọkịrịkịrị ụwa na-akwado mkpebi onwe onye nke ndị ya. N'ịlaghachi na East Timor mgbe a tọhapụsịrị ya, Galhos etinyewo aka na iwughachi obodo ahụ ka ọtụtụ iri afọ nke esemokwu mere ka ọkara ndị mmadụ nọrọ n'oké ịda ogbenye.
Na afọ 2015 ọ mepere ulọ akwukwọ Leublora Green, nke na-akwalite mmepe na-adigide ma na-akpali ụmụaka ka ha bụrụ ndị nnọchianya nke mgbanwe.
Galhos na-eje ozi ugbu a dị ka onye ndụmọdụ onye isi oche East Timor, na-elekwasị anya n'ịkwado akụ na ụba nke ụmụ nwanyị ma bụrụ olu a ma ama maka obodo LGBTQ+.
Rina Gonoi, Japan
Onye bụbu onye agha
Ụmụ nwanyị ndị agha nyeere Rina Gonoi bu ọnye dị afọ ịrị na ọtu aka n'oge anị ọma jijiji na afọ 2011, na agbanyihi na ọchọrọ ijere ndị agha nchekwa onwe nke Japan ọzị
Ọ ghọrọ onye ọru nchekwa, mana ịhe ọchọrọ ịbu na nwata ya mebiri emebi makana ọ na-enweta iyi egwu mmekọahụ "kwa ụbọchị".
Gonoi hapụrụ ndị agha na afọ 2022 wee malite mgbasa ozi, na-akpọ ndị na achịachị ọkụ maka ịza ajụjụ nke bu ọrụ siri ike na obodo ndị nwoke na-achị, obodo ebe ndị awakporo na ịke na atu egwu maka ịhe ndị nmadu ga ekwu.
Okwu ya mere ndị agha ime nyocha, nke butere ihe karịrị mkpesa rụrụ otu narị. Ndị ọrụ nchekwa mechara nyọọ Gonoi mgbaghara.
Sonia Guajajara, Brazil
Mịnịsta nke steeti
Onye a ma ama welitere isi n'otu ndọrọndọọ mba Brazil, n'afọ 2023 Sonia Guajajara bụ mịnịsịta mbụ si n'ime obodo nke onyeisiala ọhụrụ ha bụ Lula da Silva họpụtara.
Ọ ṅụrụ iyi ime ka ihe ojoo megide gburugburu bụrụ otu ihe ọ ga-alụsoo ọgụ nke ukwuu.
Nne na nna Guajajara si Arariboia na mpaghara Amazon agụghị akwụkwọ, ebe ahụ ka ọ nọrọ hụ kpọmkwem ihe mgbanwe ihu eluigwe na-eme n'ime ọhịa.
Ọ pụrụ ịga gụọ akwụkwọ ma rụọ ọrụ dịka onye nkuzi nakwa onye nọọsụ ma malite akaọrụ ya dịka onye ọnụ na-eru n'okwu. N;afọ 2022, ọ bụrụ nwaanyị mbụ si n'ime obodo ndị nweala ga-abụ onye nnọchiteanya mbụ na steeti Sao Paulo.
Anyị ga-eche echiche banyere etu anyị ga-esi kwalite ikpe nkwụmọtọ ma chụọ ikpaoke agbụrụ banyere gburu ọsọ maka na ndị nwereike ichekwa gburgburu bụ ndị mbibi bgurubguru kacha emetụta. Anyị bụ ndị nweala bụ ndị na-echekwa ala na ihe ndị na-eto na ya n'ezie.
Sonia Guajajara
Renita Holmes, Amerịka
Onye mgbasaozi maka ụlọ
Onye bi n'obere ogbe ndị Haiti na Miami, Madame Renita Holmes bụ onyeisi malitere atụmatụ OUR Homes, bụ ụlọọrụ na-ahụ maka inye ụlọ na steeti Florida n'Amerịka.
Ọ na-eme mgbasaozi maka ikike ruru ndị mmadụ n'okwu ụlọ obibi gụnyere ndị mgbanwe ihu eluigwe na-emetụta ebe osismiri na-eto na-eme na egọọnụ ulo dị n'akụkụ mmiri na-arịgo elu.
Holmes bụ onye kalara nka nwere nkwarụ, onye zụrụ ya bụ nwaanyị ji ụmụ 11.
Ọ bụ onye otu Cleo Institute's Empowering Resilient Women programme, nke na-achụ ịlụ agha megide mgbanwe ihu eluigwe site n'agụmakwụkwọ. Ọ na-enyere otu ụlọọrụ ndị na-ahụ maka ụlọ obibi aka n'okwu gbasara ụmụnwaanyị isi ojii ndị Amerịka.
Olileanya dị ma anyị bụ ụmụnwaanyị nyochapụta mmekọ anyị na Nne anyị Elu Ala nwere. Anyị siri ike, anyị na-eleta, anyị anaghị eme nkuja; anyị na-agba mbọ ma anyị na-elekọta.
Renita Holmes
Nataša Kandić, Sebia
Ọkaiwu na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye
Kamgbe ọgụ malitere n'obodo bụbu Yugoslavia na mmalite afọ ndị 1990, Nataša Kandić malitere ndekọ arụ a na-akpa n'oge agha gụnyere mwakpo, mkpagbu, ogbugbu, na ntọrị ndị.
Ọ nọchitela ezinaụlọ ndị e mekperela ahụ sitere n'agbụrụ dị icheiche n'ụlọikpe maka mpụ e mere n'agha dị na Belgrade. O sokwa n'otu nyochara atụmatụ gọọmentị Sebia wepụtara bụ Slobodan Milosevic mgidere Kosovo.
Kandić bụ onye malitere ụlọọrụ gbatagbata ọkaiwu nke a na-eto maka etu ha si eme nyocha banyere arụ a kpara n'agha na-akwụnyereghi onye ọbụla.
O soro kpokọba otu ikpe udo a kpọrọ RECOM Reconciliation Network, nke na-eleba anya na igosipụta ihe mere n'agha Balkan ebe a na-eche na ihe ruru mmadụ 130,000 nwụrụ.
Rukshana Kapali, Nepal
Ọnye Mgbasa Ọzị Maka Ilụ Ụlọ
Onye otu obodo Newa nke Nepal, onye na-akwado ikike mmadụ Rukshana Kapali gbara mgba na enweghị ozi gbasara njirimara ya mgbe ọ na-etolite.
Ọ malitere ụzọ nke onwe ya nke nkuzi onwe ya gburugburu ụdị dị iche iche nke okike na mmekọahụ. Ọ pụtara mgbe ọ dị afọ iri na ụma ma bụrụkwa onye na-ekwu okwu na mgbasa ozi ọha na eze gbasara okwu gbasara ikike ikike.
Ugbu a ọ bụ nwa akwụkwọ iwu nke afọ atọ ma na-arụsi ọrụ ike na nkwalite nke ikike iwu na iwu maka ndị LGBTQ+ na Nepal.
Kapali sitere na nkedo a kpapụrụ n'akụkọ ihe mere eme n'ime agbụrụ Newa, Jugi, na ọgụ megide ịchụpụ ndị Jugi n'ụlọ ọdịnala ha.
Sofia Kosacheva, Rọshịa
Onye ọrụ mgbanyụ ọkụ
Na mbụ, ọ bụbu onye nkuzi egwu Opera, Sofia Kosacheva chọtara ọkpụkpụ oku ọzọ oge o zutere otu ndị ọrụ mgbanyụọkụ n'afọ 2010.
Ọ bụụrụ onye ọrụ mgbanyụọkụ ma kepụta otu na-enye ndị mmadụ ọzụzụ maka ibuso ọkụ ọgbụgba ọzara agha na Russia. Nke a nyere aka n'ihibe otu ruru 25 nke ndị na-enye aka n'ịgbanyụ ọkụ na mba ahụ niile.
O nyela aka ịgbanyụ ọkụ n'ọtụtụ ebe e nwere ọkụ ọgbụgba na Russia. Ya na otu Greenpeace jikọkwara aka n'ọrụ ruo mgbe gọọmentị Russia kpọpụtara otu ahụ dịka ndị iwu akwadoghi, ha wee mechie ngalaba ha na Russia.
Kosacheva rụkwara websaịt maka ndị chọrọ iwepụta onwe ha dịka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ, bụ nke a na-ahụta dịka ebe e nwere ozi zuru oke maka igbochi na ijikwa ọkụ ọgbụgba n'ọhịa.
N'agbanyeghị etu nsogbu ihu eligwe si sie ike, nnukwu ọmụrụnwa ọbụla na-esite ndị nke nta. O nwereike ịdị ka anyị adị nta nke ukwuu iji weta mgbanwe n'ụwa, mana anyị kwesịrị ịmalite site na mgbanwe ndị anyị nwereike iweta n'okirikiri anyị.
Sofia Kosacheva
Monica McWilliams, Briten
Onye nọbụ n'otu ndọrọndọrọọchịchị na onye okpe udo
Afo a mere ya afo iri abụọ na-ise (25) Mpaghiari ugwu Ireland kwerịkọtara n'usoro ''Good Friday''Monica McWilliams bara uru nke ụkwu na mparịtaụka udo nke mba uwa.
Ọ bụ ya kepụtara otu ndọrọndọrọọchịchị ''Northern Ireland Women's Coalition'' otu a gbadọrọ ụkwu ihu maka ihe nile gbasara udo.
A họpụtara ya dịka kọmịshịọna na ụlọnnochianya nke ''Ireland'' nakwa onyeisi otu ndi na-azo ike diri onye. Ọ wepụtara atụmatụ ike diri mmadu na ndida ugwu Ireland.
McWilliams na-aru dịka kọmịshịona na-ahu maka ị kwụsị otu na emegide umunwanyi.
Najia Mohamed-Lamin, Moaghara ọdịda Anyanwụ Sahara
Onye na-alụ ọgụ maka ikike ụmụnwaanyị na mgbanwe ihueluigwe
Ọ malitere ebe ngụkọ Almasar Library Center, Najia Mohamed-Lamin chọrọ ikuziri ụmụnwaanyị na ụmụaka ihe gbasara ahụike na gburugburu n'ogige ndị gbara ọsọ na mpaghara Sahara n'ọdịda-ọwụwa Anywanụ Ọljerịa.
Ezinaụlọ ya si ọdịda anyanwụ Sahara kpọmkwem bụ ebe ndị Spen meburu ọchịchị nchịgbu bụrụkwa ebe ndị Moroko naara n'afọ 1975 nakwa ndị ala ha na-ese okwu kamgbe. A chụpụrụ ha n'ike dịka ha gbapụchara maka agha.
Onye a mụrụ ma zụọ n'ogige ndị gbara ọzọ, Mohamed-Lamin mụtara asụsụ Bekee dịka nwata na-etolite etolite, na-emere ndị si esi bịa ntugharị ma gụkwaa akwụkwọ n'ofesi dịka ọ rịọtara ọha ndị mmadụ ụgwọ akwụkwọ ya.
Oge o gụchara banyere ụmụnwaanyị na ichekwa gburugburur, ọ lọghachiri ebe o siri pụta n'ogige inyere ihe ruru mmad 200,000 ndị bụ ndị Saharawi gbapụrụ maka agha aka n'okwu banyere mmiri na nri nke mgbanwe ihueluigwe meer ọkawanye njọ.
Anyị ga-echeriri mbibi mgbanwe ihueuigwe na-ebute ihu n'ọzara nke na-emebi ụlọ ndị mmadụ kwamgbe site nebili aja, ndị be anyị na-ata nnukwute ahụhụ n'ime nnukwute okpooku. Ihe a niile na-eme anyị agbanyeghi na anyị esoghi tụnye ihe ọbụla na nsogbu na-ebute mgbanwe ihu eluigwe.
Najia Mohamed-Lamin
Ulanda Mtamba, Malawi
Onye na-alụ ọgụ megide ịlụpụ nwata nwaanyị
Ulanda Mtamba toro n'ime obodo Lilongwe na malawi, obodo na-anaghị enye ụmụnwaanyị ụmụaka nkwado kwesiri iji gụọ akwụkwọ ebe a na-akwanye ọtụtụ ụmụaka ụmụnwaanyị ka ha kwụsị akwụkwọ lụọ di tupu ha eruo afọ 18.
Mtamba gbasara isi akwara gaa mahadum ma gakwuo nweta 'masters'.
Ọ na-alụ ọgụ imanye iwu ndị dị adị na-echekwa ụmụnwaanyị na-etolite etolite megide ịlụ di n'oge nakwa ịchụ ego iji buo agha megide nsogbu ụmụnwaanyị na-enwe n'ibu afọ ime n'oge.
Ugbua, ọ na-arụ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ AGE Africa na Malawi, otu na-akwalite atụmatụ inye ụmụnwaanyị Afrịka niile otu ohere ịgụ akwụkwọ sekọndịrị.
Tamar Museridze, Jọjịa
Onye ntaakụkọ
Onye ntaakụkọ onyonyo Tamar Museridze a na-akpọkwa Tamuna bụ onye a ma ama n'ihu igwe onyonyo mgbasaozi na Jọjịa kamge ọ dị afọ 18 mana ndụ ya gbanwere oge o mere afọ 31 ọ chọpụtara na e kutara ya ekuta.
Ọ hapụrụ ihe niile ọ na-eme ịga chọta ndị mụrụ ya n'ezie mana oge ọ na-eme nyocha ya, ọ chọpụtara na e nwere ihe ịgbama na e nwere ahịa ojii ebe ndị mmadụ si ekuta nwa na Jọjịa na-aga kamgbe afọ 1950.
O mepere otu/ọụ̀bakọ n'ihu peeji Facebook nke ọ kpọrọ "I'm searching" iji malite nkata banyere ikute nwa n'ụzọ megidere iwu ọkachasị ụmụaka a na-ekuru n'ebe a na-amụ nwa n'ụlọọgwụ.
Otu Museridze malitere enyela ijikọ narị kwụrụ narị ezinaụlọ mana ọ ka na-achọkwa ndị mụrụ ya onwe ya.
Neema Namadamu, Democratic Republic of Congo
Nkwado ikike nkwarụ
Netwọk Hero Women Rising, ma ọ bụ Mama Shuja, bu n'obi imeziwanye ọnọdụ obibi ndụ maka ụmụ nwanyị na ụmụ agbọghọ na mba DR Congo.
Onye na-akwado ikike ndị nwere nkwarụ bu Neema Namadamu tọrọ ntọala otu, nke na-eji agụmakwụkwọ na nkà na ụzụ na-eme ka olu ụmụ nwanyị dịkwuo elu ma na-akụziri ha ịkwado maka ikike ha.
A mụrụ Namadamu n'ime ime obodo dị n'ebe ọwụwa anyanwụ DR Congo, Namadamu butere ọrịa polio mgbe ọ dị afọ abụọ. Ọ bụ nwanyị mbụ nwere nkwarụ sitere n'agbụrụ ya wee gụchaa akwụkwọ na mahadum.
Ọ ghọrọ onye otu nzuko omeiwu ma bụrụkwa onye ndụmọdụ nye minista gbasara okike na ezinaụlọ nke mba ahụ.
Michelle Obama, Amerịka
Ọkaiwu, odeakwụkwọ na onyemgbasaozi
Nwaanyị bụbu nwunye onyeisiala mba Amerịka bụ Michelle Obama malitere otu a kpọrọ Girls Opportunity Alliance nke na-akwado otu dị icheiche na-ahụ na ụmụaka ụmụnwaanyị gara akwụkwọ kwesiri ha.
Nke a guzoro n'atụmatụ Let Girls Learn bụ atụmatụ Obama malitere dịka nwunye onyeisiala nke o jiri ike gọọmentị na-eme ka ụmụnwaanyị na-etolite etolite na mpaghara ụwa dị icheiche gaa akwụkwọ.
Dịka nwunye onyeisiala, ọ malitere atụmatụ atọ: Let's Move! nke na-enyere ndị nne na nna aka izulite ụmụaka n'ezi ahụike; Joining Forces bụ atụmatụ na-akwado ndị ọrụ nchekwa mba Amerika, ndịagha lara ezumike nka na ezinaụlọ ha; nke ikpeazụ bụ Reach Higer - ọ ka na-arụkwa ọrụ n'atụmatụ a ma ruo ugbua - ọ na-akwalite ndị ntoroọbịa ịchụsọ agụmakwụkwọ.
Sepideh Rashnu, Iran
Odeakwụkwọ na onye nka
Sepideh Rashnu bụ onye welitere isi na mba iran maka na ọ na-eweli olu ya megide iwu e tiri na nwaanyị ọbụla ga-eyiriri ịchafụ.
Dịka ya na nwaanyị na-amanye iwu ịchafụ ahụ na-enwe nsogbu n'ime ụgbọala, a nwuchiri ya.
Dịka ọ na nga, o bu apa ihe e tiri ya pụta n'ihu onyonyo TV 'na-arịọ mgbaghara' maka agwa ya. Ihe a mere n'ọnwa Julaị afọ 2022 naanị izuụka abụọ tupu Mahsa Amini dị afọ 22 nwụrụ n'aka ndị uweojii na-amanye iwu ịchafụ.
Na mbido afọ a, a kpụpụrụ Rashnu n'ụlọikpe dịka o wepụtachara foto ya gosiri ebe ọ na-eyighi ịchafụ mkpuchi isi. O kwuru na a machiela ya na mahadum maka ọgụ ọ na-alụ.
Ọ pụtala na nga ugbua mana ọ ka na-enupu isi megide iwu iji ịchafụ hijab ekechi isi.
Bernadette Smith, Turtle Island / Kanada
Onye na-alụ ọgụ maka ezinụlọ ndị nke ha achọ
Dịka nwanne ya nwaanyị furu n'afọ 2008, Bernadette Smith malitere ịchọ ọsịsa.
Ọ bụụrụ otu n'ime ndị na-ekwuli okwu maka ezinụlọ ndị na-achọ ndị nke ha achọ nakwa ụmụ nwaanyị e gburu egbu, nakwa ọdịmma ụmụnwaanyị na Canada. O hibekwara otu iji nye aka mee ihe maka nke a ma chọta ọsịsa.
O sokwa hibe otu a kpọrọ 'Drag the Red', otu nke e hibere iji chọọ ozu ndị mmadụ a tụnyere n'Osimiri Uhie nke Winnipeg, maọbụ iji nweta ihe akaebe maka ndị a na-achọ achọ.
N'ọdị nso a, Smith meriri ntuliaka nke ugboro atọ ya n'ụlọ omeiwu Manitoba ma si otu a bụrụ onye nke mbụ n'ime ụmụnwaanyị 'First Nation' abụọ a họpụtara n'otu Mịnịsta nke mpaghara ahụ. Ugbua, ọ na-arụ ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka ụlọ obibi, ndị nwere ọrịa mara ahụ, na ndị enweghị ụlọ.
Iryna Stacchuk, Yukren
Onye na-enye ndụmọdụ maka mgbanwe ihu eluigwe
onye nwere agba n'okwu mgbanwe ihu eluigwe, Iryna Stavchuk esonyela otu ndị Yurop bụ European Ciimate Foundation dịka onyeisi ọrụ ha si mba Yukren nke ọrụ ya bụ ichepụta atụmatụ ga-egbo dị ọcha ma dị ndụ na-ejighi kemikaal a ga-eji rụgharịa Yukren ma a lụchaa agha.
Tupu o were ọrụ ahụ, ọ rụrụ gọomentị mba Yukren ọrụ dịka osote mịnịsịta na-ahụ maka gburbguru amalite n'afọ 2019 ruo afọ 2022 ma bụrụkwa onye isi ya dị n'atụmatụ gụnyere 'European integration nakwa nke a kpọrọ 'biodiversity'.
Stavchuk sokwa na ndị malitere otu abụọ na-abụghị gọomentị nwee ha bụ - Ecoaction na Kyiv Cyclists' Association (U-Cycle) - o kpokobakwa otu dị icheiche bụ ndị na-arụ ọrụ maka nsogbu mgbanwe ihu eluigwe.
Ọrụ anyị bụ ime ike anyị n'ebe anyị nọ nakwa n'ọnọdụ anyị nwetara onwe anyị. Ana m erube isi nye okwu St Francis nke Assisi; "Malite na-eme ihe dị mkpa, ma mee ihe kwere omume tupu ị mara ya, ị na-emezi ihe ndị na-ekwebughi omume".
Iryna Stacchuk
Gloria Steinem, Amerịka
Otu onyeisi na ndị na-alụ ọgụ maka ikike nhatanha
Dịka onyendu ndị na-alụ ọgụ ikike nhatanha n'eiti nwoke na nwaanyị n'ụwa kamgbe afọ 1970, Gloria Steinem etinyela aka n'ikwalite nhatanha n'eiti nwoke na nwaanyị nke welitere isi na mbaụwa.
Steinem arụọla ọrụ gbasara nhatanha dịka onye nkwuchiteọnụ, onye ntaakụkọ, onye odeakwụkwọ, onye nkuzi na onye nkwuchiteọnụ.
O sokwa wulite atụmatụ Ms. magazine, nke pụtara mbụ n'afọ 1971 ma ka na-apụtakwa ruo taa, akwụkwọ ahụ ka na-ele anya dịka akwụkwọ mgbazaozi mbụ buputara okwu gbasara ikike ụmụnwaanyị mbụ.
N'afọ 89, Stienem ka na-agbakwa mbọ na-arụ ọrụ maka inweta ụwa dị mma site n'enyemaka ọ na-enye otu dịka Women's Media Center, otu ERA Coalition na otu Equality Now.
Summia Tora, Afghanistan
Onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị ndị na-agba ọsọ ndụ
Otu 'Dosti Network' bụ otu e hibere iji nyere ndị Afghanistan aka, ma ndị bi n'Afghanista ma ndị na-agba ọsọ ndụ na mba ndịọ ọzọ. E hibere otu a dịka ndị otu Taliban weghaara ọchịchị n'afọ 2021.
Dịka onye Afghanistan gbakwara ọsọ ndụ n'onwe ya, Summia Tora ghọtara nke ọma nsogbu na nhịahụ nke ndị na-agba ọsọ ndụ na-agabiga.
Ọrụ ya gbakwasara ụkwụ n'inye ndị na-agba ọsọ ndụ ebe obibi, nakwa inye ohere agụmakwụkwọ maka ụmụakwụkwọ ọgbaaghara metụtara.
N'ihi na ọ chọpụtara na agụmakwụkwọ nere ohere ịgbanwe ndụ mmadụ, Tora na otu dị icheiche dịka UN, 'World Bank', Malala Fund, na 'Schmidt Futures' ejikọọla aka n'ọrụ, N'ihi njikọ aka ndị a, ọ na-akwado agụmakwụkwọ maka ndị na-agba ọsọ ndụ n'ihi ọgbaaghara ọ kachasị ụmụnwaanyị ndị nọ ebe e nwere ọnọdụ gbatagbata.
Xu Zaozao, Chaịna
Onye na-ekwupụta mkpa ọ dị ka nwaanyị ichekwa akwa ya n'igbe ntuoyi
N'afọ 2018, ọ gbalịrị ichekwa akwa ya n'Ụlọgwụ gọọmentị dị na Beiijing. Mana agwara Xu Zaozaao bụ nwaanyị anọghị na di na ọ bụ nanị ndị lụrụ di nwere ohere ya.
Ọ kpụpụrụ ụlọọgwụ ahụ ụlọikpe nke bụ mbụ a na-agbagha ikike ụmụnwaanyị alụghị di nwere ichekwa akwa ha.
Ikpe a malitere n'ọnwa Disemba afọ 2019 abala n'isiokwu ntaakụkọ ka ụjọ na-atụ ndị mmadụ na a naghị amụzị nwa na mba ahụ.
E kpebeghi ikpe ikpeazụ ahụ mana ndị na-agụ akwụkwọ maka iwu na ọgwụgwọ enyochala ikpe Xu na mahadum. Ugbua, ọ kabụkwa onye ọnụ na-eru n'okwu na-alụrụ ụmụnwaanyị na-alụghi di ọgụ banyere ọmụmụ.
Sayensị na Ahụike na Teknụzụ
Basima Abdulraham, Iraq
Green Building Enterpreneur
Na afọ 2014, mgbe ndị ana akpọ Islamic Steeti weghara mpaghara mba Iraq, Basima Abdulraham na agu akwụkwọ na mahadụm dị na mba US
ọtụtụ obodo na mba Iraq ka emebiri maka ọgụ na agha, mana mgbe Abdulrahman mechere Nzere Master ya na Structural Engineering na mahadụm nwere lọta; ya bụ nwada hụrụ ọtụ ọga esị yere aka.
Ya bụ nwada gụzọrọ ọtụ KESK na Iraq. Ọtụ a bụ nbụ na mbụ na ịhe gbasara ụlọ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ṅdụ (green buidling). Ọchọpụara na ya bụ ụlọ gịkọrọ teknụzụ nakwa ụsọrọ ọdị na ala ndị Iraq gịri Alụ ụlọ
Ọ kwadọrọ eme ka ụlọ ana alụ na ubọchị tata emetụtaghị ọdị na mma ndị aga amụ amụ na ọdi na ịrụ
ịhe gbasara nsọgbu ihu igwe na emetụta m. nani ịhe m nwere ịke ịme bụ isọrọ na eweta nsọrọ ebelata ya bụ ihe ize ndụ
Basima Abdulraham
Amina Al-Bish, Sirịa
Onye enyemaka na-azọ ndụ
Dịka agha ime mba Sirịa gbaliri elu n'afọ 2017, Amina Al-Bish kwsiri ike ịbụ nwaanyị mbụ ga-esonye ndị na-azọ ndụ na Syrian Civil Defence, ha bụ ndị enyemaka a na-akpọ White Helmets, ebumnuche ya bụ ịzọ ndụ ma gbatara ndị merụrụ ahụ ọsọ enyemaka.
Amina mechara soro ndị enyemaka zọrọ ndụ ndị mmadụ mgbe ala ọma jijiji mere na mba Sirịa na Tọkị na Febụwarị 2023, metụtakwara ndị agbataobi ya na ndị ezinaụlọ ya n'ime ihe ndị dakwasara ha.
Ugbua Al-Bish na-arụ ọrụ inye ụmụnwaanyị n'obodo ya dị na mpaghara ugwu Sirịa, ebe a ka na-alụsị ọgụ n'ike. Ọ na-agụkwa Azụmahịa na Mahadum ma sịkwa na ebumnuche ya bụ iso wulite mba Siriịa dị n'udo.
Sara Al-Saqqa, Na mpaghara Palestaịn
Dọkịnta na-awa ahụ
Dịka nwaanyị mbụ tozuru bụrụ dọkịnta na-awa ahụ na Gaza, dọkịnta Sara Al-Saqqa na-arụ n'ụlọọgwụ kachasị na mba ahụ bn̄ụ Al-Shifa.
Ọ na-eji aka ya n'Instagram akọwara ndị mmadụ etu o si agwọ ndị mmadụ n'etiti agha. a gbariela ụlọọgwụ Al-Shifa gwogwo dịka mba Izrel na-ezokwasi Hamas.
Al-Saqqa na-egosi etu ụkọ ọkụ latrik na ụkọ mmanụ e ji enye ọkụ, ụkọ mmiri na ụkọ nri si egbochi ụlọọgwụ ahụ inye ndị mmadụ ọgwụgwọ. Ọ pụrụ n'ụlọọgwụ Al-Shifa nwantịtị oge tupu ndị Izrel awakpo ụlọọgwụ ahụ n'ihe ndị agha Izrel kwuru bụ mwakpo piri ọnụ iji nweta ndị Hamsa kpọmkwem.
Al-Saqqa gụrụ akwụkwọ dọkịnta na mahadum Izlam nke Gaza ma gụọ ịwa ahụ na mahadum Queen mary dị na London. Ọ bụghịzi ya bụ naanị nwaanyị bụị dọkịnta na-awa ahụ na Gaza ebe ndị ọzọ na-ezo nzọmụkwụ ya.
Bayang, China
Onye ndekọ na onyena-ekwuwa okwu maka gburugburu
Kamgbe afọ 2018, Bayang debere akwụkwọ ndekọ na-edekọ anụmanụ dị n'ala ha na etu mmiri si agbanwe, na-edekwa etu ihueluigwe si agbanwe na-enyochakwa ukwu osisi.
O bi na mpaghara Quinghai na mba Chaịna ebe dị n'ugwu Tibeta ma bụrụkwa ebe mgbanwe ihueluigwe na-emetụta na-ebute okpomọkụ, akị mmiri na-awụsa nakwa ukwu osisi a na-egbutu.
Bayang so n'otu ụmụnwaanyị na-ahụ maka gburu a kpọrọ Sanjiangyuan Women Environmentalists Network ma na-ekwuwa okwu maka ahụike na nchekwa obod.
Ọ mụtara aka ọrụ ịkpa ihe ndị na-echekwa gburugburu gụnyere ihe a na-ete n'ọnụ, ncha na akpa - iji chekwa ebe mmiri si apụta n'ime obodo nakwa ikpalite mmụọ ndị mmadụ isonye na inyeaka na gburugburu.
Susan Chomba, Kenya
Onye Sayensị
Dịka otu onyeisi n'ụlọọrụ World Resources Institute (WRO), Susan Chomba kwuru na ihe anya ya hụrụ na nwanta dịka onye ogbenye na Kiriyaga na mpaghara etiti kenya kpalitere ya ikwalite ndụ ndị ọzọ.
Ihe ọ tinye onwe ya na ya bụ okiwu gbara nchekwa ọhịa, imezi gburu na ala na ịgbanweusoro e si emepụta nri n'Afrịka.
Site n'ime ọhịa mmiri Kongo gaa na ọzara mpaghara ọdịda anyanwụ Sahel Afrịka, nakwa mpaghara ọwụwa anyanwụ Afrịka, Chomba na-enye ndị na-akọ ugbo oge ya ọkachasị ụmụnwaanyị na ndị ntoroọbịa ime ka ha jiri ala ha kọpụta ihe nke ọma.
Ọ na-enyere ndị gọọmentị na ndị na-eme nyocha aka ikwalite ọha ndị obi siri ike n'ihu mgbanwe ihu eluigwe na-akawanye njọ.
Ihe kacha enye m nsogbu bụ na ndị ndu mbaụwa enweghi ihe ha na-eme ọkachasị ndị kacha emepụta anwụrụ bụkwa ndị nwere ikike na akụnaụba nwereike ịgbanwe ihe mana ihe ji ha bụ ego, ndọrọndọrọ na ikike. Iji mee ihe banyere nsogbu m na-enwe, ana m eli onwe m n'ime ọrụ gbasara iweta mgbanwe, mụ na ụmụnwaanyị ndị ọzọ na ndị ntoroọbịa n'Afrịka niile na-arụkọ ọrụ ịchọpụta ihe ga-echekwa ma hazigharịa usoro nri anyị.
Susan Chomba
Leanne Cullen-Unsworth, UK
Onye ọrụ sayensị osimiri
Ahịhịa dị n'osimiri bụ ihe dị mkpa maka etu o si edokọ anwụrụ kabon dayozide nakwa ebe obibi ụfọdụ obere azụ, mana emebiela ụfọdụ ebe obibi ndi a
Leanne Cullen-Unsworth bụ otu onye nakwa onye ndu Project Seagrass bụ ọrụ ukwu mbụ gbasara iweghachi ahịhịa osimiri n'ụzọ juru afọ.
Ọrụ ukwu a mere ya mfe ịme nke a site n'iji robot akọ mkpụrụ ihe ma kewapụtakwa ụzọ mba ndị ọzọ ga-esi wulite ahihia dị n'ime osimiri ha.
Dịka onye ọrụ sayensi na nyocha osimiri ihe karịrị afọ iri abụọ, Cullen-Unsworth tinyere uchu n'iji sayensi echekwa na iweghachi ọnatarachi.
Ihe e nwere ịme karịri akarị ihapụrụ ya otu onye ịme, mana ndị mmadụ na-arụkọ ọrụ ọnụ na-ekesa amamihe. N'uche nkem, a ma m na anyị nwereike ịweghachite ebe obibi anụmanụ mmiri, chekwaa ya ma mezie ya ma uru ọ ga-abara ala anyị na ụwa nke anyị.
Leanne Cullen-Unsworth
Canan Dagdeviren, Turkey
Onye Sayensị na onye nrụpụta ihe
Ji ọkwa 'Associate Professor' na ngalaba nnyocha mmgbasaozi nke ụlọakwụkwọ Massachusetts Institute of Technology' (MIT). Canan Dagdeviren rụpụtara akụrụngwa nke nwereike inyochapụta kansa nke ara oge ọ ka na-achọ ibido ebido.
O nwetara mkpalite mmụọ site n'aka otu nwanne nwaanyị nna ya onye a chọpụtara na o nwere ọrịaka kansa ara n'afọ 49 n'agbanyeghị na ọ na-aga nnyocha maka kansa oge niile, o mechaa nwụọ dịka ọnwa isii gachara.
N'akụkụ akwa nwanne nwanyị nna ya, Dagdeviren mapụtara atụmatụ etu ọ ga-esi rụpụta akụrụngwa nnyocha nke ụmụnwaanyị nwereike itinye n'akpa ara ha ma nke ga-enwekwa ike ị na-enyocha onye ahụ ma ọ bụrụ na ọ bụ onye e chere nwereike inwe kansa ara. A na-eche na akụrụngwa teknụzụ ahụ ga-enwe ike ịzọpụta ọtụtụ ndụ.
Izabela Dluzyk, Poland
Tepe Rekọda
Izabela Dluzyk ji tepe rekọda n'aka malite ị rekode onu Bialoweiza, bụ ọhia kachasi ochie ma buru ohia akachasi elete anya na Poland
Ihe mere onye na-erekọde ọhia ahu jiri pụọ iche a bughị nani maka na ọ bụ nwanyi na-arụ ọrụ ejriri mara umunwoke, mana ọ bụ maka na-okpuruisi kamgbe nne ya muru ya.
Dluzyk malitere ị nụ akwa nnụnụ n'ụdị pụrụiche kemgbe ezinaụlọ ya nyere ya tepe rekọda mgbe ọdị afo 12, nke na ọ na eji onu amara nnụnụ nke na-ebe.
Ọ kwere na ọ bụ ihe ọma ị sonye n'ihe ndi dị ka chi siri ke ya, na agbayenre adim iche anyi nwere ike ịhụ na mmadu ibe anyi.
Marcela Fernández, Kolombia
Onye ndu ndị nyochapụta
Igbe akịmmiriigwe bụ otu ụzọ dị mkpa ndị obodo si enweta mmiri dị ọcha mana na Kolombia ha na-efu n'ike n'ike.
Marcela Fernández na ndịi otu hibere ụlọorụ enyemaka ha kpọrọ Cumbres Blancas(White Peaks) iji mee mkpọtụ maka nsogbu a ma gwa ndị mmadụ na n'ime igwe akịmmirigwe dịbu iri na anọ, ọ bụ naanị isii fọrọ.
Site na nyochapụta sayensị nakwa ịkpokọba otu gụnyere ndi ma anya obibi ugwu, ndị oseefoto, ndị omenka na ndị sayensị, Fernandez na-edekọ mgbanwe ma jirikwa ụzọ pụrụiche akwụsị mmebi igbe akụmmirigwe a.
Site n'ọrụ ukwu ya "Pazabordo" ọ na-aga ebe ọgbaghara metụtara n'oge esemokwu ruru afọ 50 na mba Kolombia.
Igbe akụmmirigwe akụzierela m ịkwalite mmụọ m. Ị nụ olu ha ị mara ma ofufu ha bụ ihe efu anyị enweghi ike ịweghachite, mana anyị ka nwereike ịme ihe.
Marcela Fernández
Timnit Gebru,
Onye ọkachamara na AI
Otu ọkammuta kọmpụta amaama,aha ya bụ 'Timnit Gebru bụ onye kepụtara ''Distributed Artificial inteligence Research Institute''(DAIR) E meputara nke a ịjni nyere ndi obodo AI na-amasị.
Ọ kwujoro ị kpa ọke agbọ n'ihe gbasara teknọlọji, o so kewapụta otu na e nyere aka ịhu na ndi isi ojii sonyere na ''AI''
Ọbụ kụ onyeịsi na-otu ''board of Addiscoder'', otu na akụzịrị ụmuakwụkwọ Ethopia ihe di na ''programming''
Mgbe ọ na arụ n'ụlọọru ''Google ethical AI'' n'afo 2020,o so na ndi dere akwụkwọ lebara anya ihe gbasara asusu AI ma ihe gbasara mmegbu ndi na weghị ka ọha ha.
Nke a mere o jiri hapụ ụlọọrụ ahụ. Oge ahụ,ụlọọru ahụ kwuruna akwụkwọ ahu wepụrụ ihe dị oke mpa n'mmuta, ha kwuru na Gerba apụọla n'ụlọọụ ha. Mana Gerba kwuru na achuru ya maka ihe o kwuru banyere ịkpa ọke n'ụlọọrụ.
Claudia Goldin, Amerịka
Economist na onye nrite nturuugo Nobel Prize
Onye ọkachamara na ngalaba akụnụba na akụkọ mgbe gboo nakwa 'labour economist', Claudia Goldin ritere nturuugo 'Nobel Prize' nke afọ a na ngalaba 'economics' maka ọrụ ya na ngalaba ọrụ ụmụ nwaanyị nakwa ọrụ ya ịkwalite nhatanha n'ụgwọ a na-akwụ ụmụ nwaanyị.
Ọ bụ naanị nwaanyị nke atọ na-erite nturuugo ahụ, ma bụrụkwa onye nke mbụ nke ya na nwoke ọbụla na-ekeghị ya bụ nturuugo.
Goldin ji ọkwa Henry Lee Professor n'Economics na Mahadum Havard, ma na-emekwa nnyocha n'isiokwu dị icheiche dịka nhatanha n'ịkwụ ụgwọ, agụmakwụkwọ, na njem mbịarambịara.
Ụfọdụ n'ime ọrụ ya kacha pụta ihe gbasatara etu ụmụnwaanyị si achịkọta ọrụ ha na ezinụlọ ha, nakwa etu ọgwụ mgbochi afọ ime si emetụta ụmụnwaanyị n'ọrụ ha nakwa n'ezinụlọ ha.
Trần Gấm, Vietnam
Onye nwere azụmahịa biogas
n'afọ 2012, Trần Gấm maltiere ịchọpụta usoro ndị na-echekwa gburugburu iji nye ndị mmadụ ọkụ latrik na Vietnam.
Ya bụ nne ụmụ abụọ hụrụ ohere n'ahịa ahụ ma malite azụmahịa itinye na ịhazi ụlọọrụ biogana Hanoi, ma mechaa gbasaa gaa mpaghara ndị ọzọ dị ya nso.
Akaọrụ ya na-enyere ndị na-akọ ugbo aka ịtụgharị nsị anụmanụ na ahịhịa osimiri jiri ya mee biogas - bụ nke a na-elegara anya na ọ na-echekwa gburugburu ma na-enyekwa ọkụ latrik.
Ụdịrị ọrụ Trần Gấm na-arụ na-enye ndị ime obodo ahụ ọrụ ma na-enyekwa nkwado ndị ndọrọndọrọohere ikwalite atụmatụ mgbanwe ihueluigwe.
Anyị ga-ebririri ndụ ma bie ya nke ọma, ya bụ na agbalịala m ichekwa ndị nke m site na ihazi ndụ anyị site na imegharị ahụ, iri ezigbo nri na ihi ụra nke ọma. Ana m arịọkwa ka ndị mmadụ na-ebi ezigbo ndụ dị ọcha, na-ata mkpụrụosisi nke ha kpara ma na-ekwuwa okwu megide iji kemikaal na-egbu ahịhịa.
Trần Gấm
Anna Huttunen, Finland
Ọkachamara teknụzụ maka nsogbu kabọn
Dịka onye ọkachamara n'okwu ihe na-agba agba na-akwado gburgburu, Anna Huttunen kwalitere gburugburu dị ọcha, dịka okike nakwa ụzọ e si eme nje dị mma n'obodo Lahti dị na Finland bụ ebe a kpọrọ isiobodo kacha dị ọcha na mpaghara Yurop n'afọ 2021.
Ọ malitere atụmatụ mbụ nke obodo ahụ kwalitere azụmahịa kabọn - 'app' a na-etinye n'ekwentị na-akwụ ndị mmadụ ụgwọ ma ha jiri ihe ndị na-akwalite gburugburu na-eme njem dịka igwe 'bicycle' maọbụ ụgbọala njem.
Ọ na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ na-enye ndụmọdụ gbasara nchekwa ihueluigwe dịka NetZeroCities, otuna-enyere ndị mpaghara Yurop aka inweta ogogo mba kacha dị akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ n'afọ 2030.
Huttenen na-achọ ime ka ndị ọzọ nwee mmasị maka iji ụzọ na-echekwa gburugburu eme njem ma bụrụkwa onye na-ebu okwu gbasara ịnya igwe n'isi bụ ihe ọ na-ele anya ka ụz ime njem nke ọdịnihu.
isi obodo dị icheiche na mbaụwa jupụtara na ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ime ka ndụ ndị obodo ha dị mma karịa etu ọ dị. Mee nke gị, tinye aka, sonye na mgbanwe a na-eme!
Anna Huttunen
Gladys Kalema-Zikusoka, Uganda
dibia bekee na ahu maka anụmanụ
Dịka Onye a mara ama maka ihe nrite na ngalaba dọkịnta anụmanụ nakwa onye nchekwa anụmanụ, Gladys Kalema-Ziksoka na-agba mbọ ichekwa ugwu dị na mba Yuganda ebe gorilla bị maka na mgbawe ịhu ịgwe na emetụta ha.
Nwa Ada ahu bụ ọnye isi Nchekwa na Ngalaba ahụịke ọha, ọtụ na akwadọ ncheka biodiversity sịte na ịkwadọ ahụ ịke ndị Nmadụ na gorillas nakwa anụmanụ ndị ọzọ
ke mgbe ịrị afọ atọ, nwada ahụ yere aka me ka ọnụ ọgụgụ gorillas bị na ụgwu sịte na ọnụ ọgugụ narị atọ nwere ruọ narị ịse. nke a zuru iwetulata onodu gorillas n'ihe ize ndụ
United Nations Environment Programme kporo Kalema-Zikusoka dika onye mmeri na mba ụwa na afọ 2021
Ihe na enye m olile anya na ịhe gbasara nsọgbụ ihu ịgwe bu nkwenye ndị mmadu na ọbụ ịhe ekwesịrị ịlebaye anya ngwangwa. E were Ụsọro di nma ịjịrị belata ihe mmetụte nsogbu ihu igwe.
Gladys Kalema-Zikusoka
Sonia Kastner, US
Onye na-arụpụta akụrụngwa nchọpụta ọkụ ọhịa
Naanị n'afọ a, ọkụ ọhịa agbaala n'oke ọhịa dị icheiche n'ụwa.Dịka ndị ọrụ mmenyụọkụ na-anwa ike ha niile ịkwụsị mfesa ọkụ ọhịa ahụ. Sonia Kastner hibere ngalaba ga-enyere ha aka chọta ọkụ ndị ahụ n'oge.
Pano AI ji teknuzu amamihe abụghị nke mmadụ iji rụpụta nchọpụta dị ngwangwa tupu ọkụ ọhịa efesaa site n'ịnyocha mbara maka ọkụ ma zie ndị ọrụ gbatagbata ozi kama ịche ka ndị mmadụ nkịtị kpọọ ha.
Kastner arụbuola ọrụ ihe ruru afọ iri n'ụlọọrụ teknuzu dị icheiche.
Ihe na-enye m olileanya bụ ike nrụpụta ihe ọhụrụ nke mmadụ nwere. E jirila m anya m hụ ihe mkpa ngụkọ na teknuzu nwereike igboro ndị mmadụ nakwa ebe ndị nsogbu mgbanwe ihu igwe metụtara.
Sonia Kastner
Astrid Linder, Swidin
Ọkammụta nchekwa njem
Afọ kwuru afọ, a na-emepụta ụgbọala ma jiri ụmụnwoke na-anwale ya - agbanyeghi na ngụkọ na-egosi na ụmụnwaanyị nwereike imeru ahụ maọbụ nwụọ karịa ma ọbụrụ na e nwee ihe mbere.
Injinịa Astrid Linder arụọla ọrụ ịgbanwe ma soro na ndị ndu ọrụ kepụtara ụdịrị nwaanyị e ji eme nwale ụgbọala nke mbụ n'ụwa.
Onye ọkammuta n'okwu nchekwa na njem n'ụlọọrụ na-ahụ maka nyocha na Swidin bụ Swedish National Road and Transport Research Institute (VTI) nakwa ọkammụta na mahadum Chalmers, Linder bụ ọkachamara n'okwu gbasara imerụ ahụ n'ihe mbere okporoụzọ na etu ụgbọala si arụ ọrụ.
Neha Mankani, Pakistan
Onye enyemaka ọmụmụ
Mgbe oke ide mmiri wakporo Pakistan n'afọ gara aga, onye nlekọta ọmụmụ bụ Neha Mankani gara njem n'ebe ndị odachi a metụtara
Site n'ụlọọrụ enyemaka ya, Mama Baby Fund, Mankani na ndị otu ya wetara ngw aọmụmụ izo ndụi nakwa nkelọta nye ezinaụlọ karịrị 15,000 ndị ide mmiri metụtara.
Ọrụ ya kachasị metụta ndị enweghi ka ọ ha ha n'ọgwụgwọ gbatagbata n'obodo ndị mgbanwe ihu igwe metụtara.
Mama Baby Fund enwetazuola ego ruru iji zụ ụgbọmmiri ga-ebu ụmụ nwaanyị dị ime bi n'ikpere mmiri gaa ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ gbatagbata.
Ọrụ ndị enyemaka ọmụmụ n'obodo ndị mgbanwe ihu igwe metụtara dị oke mkpa. Anyị bụ ndị ọrụ gbatagbata nakwa ndị nchekwa mbara ezi na-ahụ na ụmụ nwaanyị ga-aga n'ihu na-enweta enyemaka ọmụmụ niile kwesiri ha n'agbanyeghi na ọnọdụ ha na-akawanye njọ.
Neha Mankani
Wanjira Mathai, Kenya
Onye na-dụ ndụmọdụ maka gburugburu
Dịka onyendu a na-elegara anya na mpaghara ya niile, Wanjira Mathai nwere bụ ọkachamara n'okwu gbasara gburugburu ihe ruru afọ 20.
O duru otu Green Belt Movement, otu ndị mmadụ na Kenya na-akwalite ụmụnwaanyị site na ịkụ ukwuosisi, nne Wanjira bụ Wangari Maathai bụ onye ritere nturuugo nobel n'afọ 2004 malitere otu a.
Matahi bụzi onyeisi Afrịka na mmekọrịta ha n'ụwa niile n'ụlọọrụ World Resources Institute nakwa onyeisi oche ụlọọrụ Wangari Maathai.
Ọ na-arụkwa dịka onye ndụmọdụ si Afrịka n'ụlọọrụ Bezos Earth Fund nakwa ụlọọrụ Clean Cooking Alliance nakwa European Climate Foundation.
Ọrụ bụ 'nkwuwa okwu'. Anyị kwesiri ikwalite obere ụlọọrụ dịka ndị na-akụ ukwu osisi nakwa ndị arụ ọrụ n'ala iwulite, ijikwa na ikwalite akụnaụba. Isi n'ala na-ewulite na-enye m olileanya na anyị nwereike ime ihe niile.
Wanjira Mathai
Isabel Farías Meyer, Chile
Onye na-agba maka ọdịmma ndị nwere 'Early Menopause'
Isabel Farías Meyer amaghị na ọnọdụ nsọ ya na-anaghị abịa kwadaa bụ ihe e kwesịrị ịkpachapụrụ anya, mana dịka ọ na-abanye afọ 18, a chọpụtara na o nwere ọnọdụ a kpọrọ 'early menopause', maọbụ 'premature ovarian failure'. Ọnọdụ a na-eme oge akwa nwa nwaanyị kwụsịrị ịrụ ọrụ nke ọma, ọ na-emetụta otu pasentị n'ime ụmụ nwaanyị niile na-erubeghị afọ 40.
Ụmụnwaanyị nwere ọnọdụ a na-enwe mmetụta dịka ụmụnwaanyị ndị toferela ịmụ nwa, nke bụ menopause, mana ọ na-amalite n'oge. Farias ekwuola okwu gbasara ọnọdụ a nakwa etu o si metụta ndụ ya, tinyekwara na o nwere ọnọdụ osteoporosis.
Onye ntaakụkọ a dị afọ 30 ehibela otu nke mbụ maka ndị nwere ọnọdụ 'early menopause' na mpaghara 'Latin America' iji gbasaa ozi, kọwaa nke ọma, ma kepụtakwa ohere mmekọrịta maka ndị nwere ọnọdụ ahụ.
Natalie Psaila, Malta
Dibia onyibo
Malta nwere ndumodu dị oke mkpa ị nye umu nwanyi maka ihe gbasara ịwepụ afo ịme., n'Europe nakwa Natalie Psalia, ha na agwa umu nwanyi ihe nile ha kwesiri ị ma maka ịwepụ afọ ịme
O so na ndi kepụtara otu ''Doctors for chioce Malta'' ma gba mbọ ihe gbasara ịke afọịme nakwa ị nwete ọgwọ eji eke ịme.
Psaila kwuru na iwu dịna Malta nke kwuru na ọbụ nanị mgbo ndu nọ na nsogbu ka nwanyi nwere ike ịmepu afọr ịme, kwesiri ịkwụsị.Ihe nke a pụtara bụ na umunwayi ga na aghụ ọwụ na egbochi afọ ị me na-ahụghị Dọkịta.
Ọ dere akwụkwọ na-akọwa maka mmekọrịta nwoke na nwanyi , akwụkwọ a machịrị ụmụaka ị gụ akwụkwọ a.
Olena Rozvadovska, Ukrene
Nkwado ikike ụmụaka
Inyere ụmụntakịrị Ukraine aka maka ntara m ahụhụ ngbe ana anụ agha bụ ọrụ Olena Rozvadovska. Ọ bụ onye mepere ótu anakpọ Voice of Children, ọrụ ebere nke na-enye nkwado uche ya bu psychological support na ọnụ bekee
Ọtu ahu malitere na ịme ọbọdọ na afọ 2019, mana ngbe ọrụrụ afọ anọ ọzọ, Rozvadovska sọro ndi agha nị ịru ọgụ na Donbas ngbe ndị na azọ nwerre ọwe ha nke ndị Russia na-akwado malitere ịlụso Ukraine ọgụ.
ọtụ ahu were ndị ọkà n'akparamàgwà mmadụ (psychologists) ruru ọtụ narị na ogịge ha dị ịrị na anọ ma wekwa akala ekwe ntị ejị eweta ha. Ọtu a e yegọrọ aka na ọnọdu umu aka, nne na nna na oge nsọgbu
Rozvadovska so wete òkè na akwụkwọ akụkọ Oscar họpụtara nke "A House Made of Splinters", ya na ndị otu ya bipụtara akwụkwọ, Agha Site na Voices of Children.
Rumaitha Al Busaidi, Oman
Onye Sayensi
Ndị nne nwaanyị na ụmụaka ụmụnwaanyị, unu so na ndị ga-ebi nsogbu mgbanwe ihu eluigwe; nke a bụ isokwu okwu nke Rumaitha Al Busaidi bụ onye Oman kwuru na TED Talk n'afọ 2021 nke ndị lere ya ruru nde kwuru nde ndị mmadụ. O lebara anya n'ikike ụmụnwaanyị ndị Arab.
Ihe niile Al Busaidi mara tinyere ya n'oche dịka otu onyeisi n'otu Arab Youth Council nakwa otu maka gburugburu nke mba Oman.
O nyekwala ọchịchị Biden ndụmọdụ maka enyemaka ga-akwa ọgụ a na-alụsọ mgbanwe ihueluigwe nakwa gọọmentị Grinland maka ijikwa ngalaba nlegharịanya ha.
Ọ bụ onye bụkarịchara nwata si mba Oman gara mpaghara Saụt Pol ma malitekwa otu WomenX bụ otu na-enyere ụmụnwaanyị Arab aka ikwalite azụmahịa ha.
Ihe bụ ihe mbụ ga-enye aka ma belata mgbanwe ihueluigwe bụ ikwalite ndị nne na ụmụaka ụmụnwaanyị. Ha onwe ha ga-akwalitekwa ndị ọzọ ma mụbaa ihe a kụziere h nke ga-enyeka ịgbanwe ihe.
Rumaitha Al Busaidi
Sumini, Indoneshia
Onye na-echekwa ọhịa
Na mpaghara Aceh na mba Indoneshia ọ bụ ihe dị adị na ụmụnwaanyị na abụ ndị isi.
Oge Sumini chọpụtara na otu ihe na-ebute ide mmiri n'obodo ya bụ igbutu ukwu osisi, nke na-etinyekwa na nsogbu mgbanwe ihueluigwe, o kpebiri ime ihe maka ya ma soro ụmụnwaanyị ibe ya na-arụ ọrụ.
Otu ya natara ikike n'aka mịnsịtrị na-ahụ maka gburugburu nke nyere obodo Damaran Baru ikike ịhazị obosara ala ruo afọ 35.
Ugbua, ọ na-edu otu na-echekwa ọhịa obodo ha a kpọrọ Village Forest Management Unit (LPHK) na-akwụsị igbutu osisi n'ụzọ megidere iwu nakwa ndị ọgbanta na-eyi ndụ agụ Sumatran, pangolins na anụmanụ ọhịa ndị ọzọ egwu.
Dịka a na-egbutugaharị osisi ma na-agbakwa nta ụmụanụmanụ aghara aghara, e kwesiri ileba anya n'ọhịa iji hụ etu anyị ga-esi leba anya na mgbanwe ihueluigwe. Chekwa ọhịa, chekwaa ndụ.
Sumini
Fabiola Trejo, Mekziko
Soshal Saịkọlọgist
Oge Fabiola Trejo, onye bụ 'Soshal Saịkọlọgist malitere agụmakwụkwọ ya, ihe dịka afọ 20 gara aga, enwebeghị nnyocha ọbụla na Mexico nke lebara anya n'ụtọ aramara maka ụmụnwaanyị dịka okwu ikpe ziri ezi.
Site n'ọrụ ya, Trejo mepere ụzọ maka okwu enweghị nhatanha, mmekpa ahụ n'ihi ụdị okike, nakwa ikike sitere n'ụtọ aramara. Ọ na-agbakwa mbọ ịkwalite ụmụnwaanyị inwetazu ụtọ sitere n'aramara.
Nrụrịtaụka ya bụ na enweghị nhatanha emeela ka ụmụnwaanyị nọrọ na mkpagbu n'ihe gbasara aramara. Site n'ọgbakọ nkuzi ya, nakwa nnyocha sayensị, ọ na-enyere ndị mmadụ aka itule ụzọ ndị ọzọ ha nwere ike isi nweta afọ ojuju aramara.
Ọrụ ya na-ada ụda nke ukwuu na mpaghara Latin Amerịka nakwa na mpaghara ndị na-asụ Spanish, ebe okwu gbasara ahụike ụmụnwaanyị na ụtọ aramara ka bụ ihe arụ.
Jennifer Uchendu, Naịjirịa
Onye na-ebu agha ahụike uche
Otu ndị ntoroọbịa SustyVibes nke Jennifer Uchendu malitere bụ iji mee ya ka ọ bụrụ ihe na-amasị ndị ntoroọbịa.
Ọrụ Uchendu rụrụ na nso nso a bụ iji hụ na mkpamkpa mgbanwe ihueluigwe na-ebute n'ahụike echiche ndị Afịka ọkachasị ndị ntoroọbịa.
N'afọ 2022, ọ malitere otu a kpọrọ The Eco-Anxiety Africa project (TEAP) bụ ebe na-eleba anya na ịkwalite echiche ndị mmadụ gbasara ihueluigwe n'Afrịka site na nyocha, nkwuwa okwu na mgbasaozi.
Ọ na-agba mbọ ịhụ na ya na ndị mmadụ rụkọrọ na ụlọọrụ ndị na-agbanwe echiche ndị mmadụ rụkọrọ ọrụ ọnụ ikuziri ndị mmadụ maka ihueluigwe.
Ahụ na-eme m etu dị icheiche ma ọ bịa n'okwu mgbanwe ihueluigwe. Ejirila m nwayọọ na-ekpe udo na agaghị m emeli ihe ga-akwụsị ya mana aga m eme ike m. Ana m esokwa ndị mmadụ na-enye aka na-eme ihe dị mkpa nke na-enye aka ichekwa echiche m gbasara nsogbu eluigwe.
Jennifer Uchendu
Anamaria Font Vilarroel, Venezuela
Particle physicist
Otu onye na-eme nyocha ''physis'' bụ ọkammụta Anamaria Font Villarroel tinyere anya n'mmuta dịka chị siri ke ya.
Font na-enyocha nghọta mmụta ahu n'ihe ndi dịka chi siri kee aha.
Na-mbu, ọ tụrụ ugo na ''Fundacion Polar '' nke emere n'Venezuela. N'afo a, ahopụtara ya dịka otu onye n'ime ndi aga-atunye ugo sayence'' unesco women''
Qiyun Woo, Singapore
Onye akụkọ
Dịka onye mbaraezi dị mkpa nakwa onye akụkọ, Qiyun Woo na-eji soshal midia ekesaa atụmatụ maka mgbanwe ihu igwe.
Ebe ọrụ ya n'ịntanetị, The weird and the Wild bụ ebe ọ na-akọwapụta sayensi banyere mgbanwe ihu igwe ka ọ dị mfe. Ọ na-eweputa akụkọ iji kuziri ndị mmadụ ihe ha ga-eme maka mgbanwe ihu igwe.
O so n'otu onye na-emepụta atụmatụ 'podcast' gbasara mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ Eshia a kpọro Climate Cheesecaka, na-agbari okwu ndị gbasara mgbanwe ihu igwe ka ọ dị mfe ịghọta.
Ọ bụkwa onye nyochapụta ntorọbịa ndị National Geographic
Ihe gbasara mgbanwe ihu igwe rara ahụ ma na-atụ ụjọ. Anyị nwere ohere irute site n'ụzọ dị nwayo - kama iji egwu- nke a ga-eme ka obi anyị dị njikere ịnabata nlekọta ụwa dịka anyị na-eke nkwụcha ikwatu ihe ndị anaghị arụ ọrụ ma kwalite ndị na-arụ ọrụ.
Qiyun Woo
Elham Youssefian, Amerịka na Iran
Onye ndụmọdụ okwu banyere mgbanwe ihueluigwe na ndị nwere nkwarụ
Onye ọkaiwu kpuru isi, Elham Youssefian bụ onye na-ewelisi olu ya ike n'okwu gbasara ịgụnye ndị nwere nkwarụ ma a na-ekwu maka mgbanwe ihueluigwe ọkachasị ebe ọ gbasara imepụta ihe gbatagbata maka mberede.
A mụrụ ya ma tokwa n'Iran, Youssefian mere njem gaa mba Amerịka n'afọ 2016. Ụbọchi taa, ọ bụ otu isi sekpụ ntị n'otu International Disability Alliance, otu mbaụwa gụnyee otu 1,100 ndị ọzọ na-anọchite ndị nwere nkwarụ.
ọrụ ya bụ ikuziri ndị isi ọrụ ha n'etu mgbanwe ihueluigwe si emetụta ndụ nwere nkwarụ. Ọ na-akwalitekwa ndị nwere nkwarụ nwere ezi ọnatarachi ịlụ ọgụ megide mgbanwe ihu eluigwe.
Anyị bụ ndị nwere nkwarụ egosila ọtụtụ oge na agbanyeghi nkwarụ anyị nwere, anyị na awufe ọgbatauhie niile na-echee anyị n'ihu ma chọta ụzọ ma mgbe ọ dịka ụzọ adịghị. Ndị nwere nkwarụ nwereike ma kwesiri iso na ndị nọ n'ihu ọgụ a na-alụso mgbanwe ihu eluigwe.
Elham Youssefian
Gịnị bụ Ụmụnwaanyị 100?
BBC na-akpọpụta aha ụmụnwaanyị 100 kacha kpalie mmụọ ndị mmadụ n'ụwa kwa afọ. Anyị na-eme onyonyo, akụkọ ma na-agba ha ajụjụọnụ gbasara ndụ ha - akụkọ ndị na-etinye ụmụnwaanyị n'etiti nke a na-ebipụtakwa n'igwe mgbasaozi BBC niile.
Soro BBC 100 Women na Ịnstagam na Facebook. Sonye na mkparịtụka gbasara ya jiri hashtag #BBC100Women
Kedụ ka e siri ahọpụta ụmụnwaanyị 100 ndị a?
Ndị ọrụ Ụmụnwaanyị 100 BBC na-edepụta site n'aha ndị ha nwetara site na nyocha ha mere nakwa ndị otu asụsụ dị icheiche nke BBC gụnyere Media Action kpọpụtara.
Anyị nọ na-achọ ndị aha dara ụda maọbụ ndị akụkọ ha kpalitere ndị mmadụ nke ukwu n;ime ọnwa 12 gara aga nakwa ndị nwere akụkọ ga-akpali mmụọ ndị mmadị ịkọ maọbụ ndị mepụtara ihe gbara ọkpụkpụ gbanwere maọbụ metụta obodo n'ụzọ na-anaghị abkarị na mgbasaozi.
E nyochakwara aha ndị e depụtara n'ihu atụmatụ nke afọ a gunyere - mgbanwe ihu eluigwe na ụdị nsogbu ọ na-enye ụmụnwaanyị ụmụaka na ndị okenye n'ụwa niile nke mere e jiri họpụta ụmụnwaanyị 28 na-eleba na nsogbu mgbanwe ihu eluigwe na gburugburu.
Anyị wepụtakwara ndị olu ha na-ada ụda na ndọrọndọrọ nakwa akụkụ ụwa niile. Anyị nyochara aha ndị si n'okwu dị icheiche nakwa ụmụnwaanyị ndị jiri aka ha mepụta mgbanwe nke ha.
Anyị hazikwara aha ndị site n'ile anya n'ebe ndị a si na-eleghi onye ọbụla anya n'ihu tupu anyị ewepụta aha ndị ikpeazụ so na ya. Ụmụnwaanyị ndị a niile ekwetala ịnọ na ya.
Ndị nwe ya
Otu ndị ọrụ Ụmụnwaanyị 100 nke BBC Valeria Perasso, Amelia Butterly, Rebecca Thorn, Paula Adamo Idoeta, Cordelia Hemming, Laura García, Sarah Dias, Lucy Gilder, Mai Kanaaneh, Mark Shea, Vandana Vijay, Kindah Shair, Daria Taradai, Lamees Altalebi, Firouzeh Akbarian, Sana Safi, Kateryna Khinkulova, Tamara Gil, Mouna Ba.
Onyeisi Ụmụnwaanyị 100 BBC Golnoosh Golshani
Ndị rupụtara ya maka World Service Languages: Roberto Belo-Rovella na Carla Rosch.
Eserese: Prina Shah, Jenny Law, Matt Thomas, Pauline Wilson na Oli Powell.
Iwulite: Scott Jarvis, Arun Bhari, Alexander Ivanov, Preeti Vaghela and Holly Frampton.
Ndị nwe foto: Miller Mobley, Maciek Tomiczek/Oxford Atelier, Arati Kumar-Rao, Hamna Haqqi, Craig Kolesky, Pano AI, L. Reid, Benjamin Jones, Yober Arias, Amanda Triplett, Anny Roberts, Diyor Abdughaforzoda, Doi Inthanon Thailand by UTMB, Qinghai Snowland Greatrivers Environmental Protection Association, Jason Boberg, Chaideer Mahyuddin/AFP, New Balance Paraguay, Jo Anne McArthur, The Cartier Women's Initiative (CWI), Lucy Piper, Louise Mabulo, Christian Tasso, Martin Chang, Konstantin Deryagin, Gabriel Quintão, Abel Canizales, Patrick Wally, Sarah Hale, Jimena Mateot, Lucas Christiansen, Hana Walker-Brown, Woody Morris, Xinyan Yu, Chris Parker Edzordzi Sefogaht, Taseer Beyg, Albert Kamanga Zeeya Creations, Salem Solomon, Luke Nugent, R. David Marks, Lee Tinklim, Satu/VTI, FIFA, Josh Finche, Kibuuka Mukisa, Phoebe Xu, Gregory Vepryk, Darko Tomas CROPIX, Wanjira Mathai, Rufat Ergeshov, Osvaldo Fanton, Dani Pujalte, Giuliano Salvatore, Fondation L'Oreal, Daniel Eduardo, Tatyana Egorova, Dovana Films, Jimmy Day/MIT, Editorial Caminho - Leya, Khine Hnin Wai Foundation, Andrew Sikorsky, Ramón Tolosa Calderón, Mariam Siddiqi, Feral Films, Sebastián Aliaga, Diyor Abdughaforzoda, The White Helmets/Syria Civil Defence, Ellie Varley, DGL Nunnery, Mustafa Abumenes, Emanuele Elo Usai, Fazal Raham Arman, Emilia Trejo, Mattia Zoppellaro, Martin Lupton/Light Collective, Yasmina Benslimane, Pavlo Botanov, Marijeta Mojasevic, LenadraPella/International Federation of Sport Climbing, Gal Mosenson, Getty Images.
Na Nzube Nzuzo Nzuzo Nri 450 Na Ntanetị Ihe Ego Eke Nweta Ntanetị Ngwa Ntanetị Enyemaka Enyemaka Indian Internationalization Agbara Ikike. Ikike ikike yiri ka ọ bụ ịzụta, na-enweghị nyocha. Ushki dị ka ọ na-ekerịta ntụgharị ntụgharị aka na nke ugbu a Amitkumar Sunat nwere ike ịhọrọ ntụzi mmadụ
Emebisịla ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ, mana enwere ike ịnye ozi onye ọrụ ahụ. Ma enweghi ike ịkwụsị mkparịta ụka zuru ezu, mana enwere ike imeziwanye ndụmọdụ ahụ. Nke mbụ bụ idobe ụwa dị ka asụsụ. Asụsụ bụ asụsụ nke ọha.